Andy Chukwu
Andy Chukwu (amụrụ ya na ubosi nke iri na ano nke onwa mee na afo 1957) ọ bụ onye nduzi ihe nkiri Naijiria. Ọ malitere ọrụ ya dị ka onye na-eme ihe nkiri.[1] Ihe nkiri ndị o mere gụnyere Karishika (1996), Witches (1998) na Issakaba (2000). Ihe nkiri ndị ọ duziri gụnyere Maazị Ibu na 2 òké. Chukwu duziri ihe nkiri ndị na-eme ihe nkiri / ndị na-ese ihe nkiri Nollywood dị ka Osita Iheme, Chinedu Ikedieze, Dakore Egbuson, Patience Ozokwor, Amaechi Muonagor, Julius Agwu, Pete Edochie, Ali Nuhu, Emeka Ike, Gentle Jack, Ronke Ojo, Sandra Achums, na ndị ọzọ.
Andy Chukwu |
---|
Ọ bụ otu n'ime ndị isi na-ahụ maka ụlọ ọrụ ihe nkiri nke onye isi ala Naịjirịa Goodluck Jonathan kpọrọ na afo 2013 iji mee emume ncheta afọ iri abuo kemgbe a tọhapụrụ ihe nkiri Naịjiria mbụ na vidiyo ụlọ.[2]
Ihe ndị mere n'oge gara aga
dezieChukwu bu onye Obinagu na obodo Ishiagu nke mpaghara Gọọmentị Obodo Ivo nke Ebonyi Steeti.
Ọrụ
dezieỌrụ ime ihe nkiri Chukwu malitere mgbe ọ na-egosi ihe inkiri na-atu egwu ndi Nollywood bụ Karishika na afo 1996. Mgbe ọ pụtasiri na ihe nkiri ole na ole dị ka onye na-eme ihe nkiri dịka Issakaba na Witches. Ọ si ime ihe nkiri na ngwụcha afọ iri itolu gàwa, gafare gaa na iduzi ihe nkiri na afọ puku abuo gàwa. O nwere ihe karịrị ihe nkiri iri na abụọ n'okpuru eriri ya ma na ime ihe nkiri ma ikike iduzi. Mgbe ụfọdụ ọ na esonye na-eme ihe nkiri na nke ọ na-eduzi, na-arụ obere ọrụ nkwado. Ọ bụ onye nduzi nke ihe nkiri na-atọ ọchị nke Naijiria nke a na-enyocha nke ọma bụ Maazị Ibu nke John Okafor mere dị ka onye isi ihe ngosi. Taa, a maara John Okafor nke ọma site na aha ọzara na ihe nkiri ahu karịa aha gọọmentị ya n'ezie.[3]
Ọru ngo obodo
dezieChukwu sonyeere gọọmentị nke Ebonyi State na Lagos State maka mmemme nnweta nkà a na-akpọ Street to Skills. Ebumnuche ya bụ iji nyere ụmụaka na ndị ntorobịa aka ịkwụsị ịzụ ahịa n'okporo ámá, ma muta nkà ha nwere ike iji na-nweta ihe ha ga-eji di ndu.[4][5]
Chukwu kwuputara na ọ na-arụ ọrụ na ihe nkiri iji mee ka a mara oria akporo Vesicovaginal fistula (VVF) na nsogbu ndị na-arịa ya na-agabiga. O kwere nkwa ime ihe nkiri ahụ dị ka uzọ ọgesi tinye aka nke onyinye ya na ọrụ anụ ụlọ nke nwanyị mbụ nke Ebonyi State, Josephine Elechi.[6]
Ihe nkiri
dezieAfo | Ihe nkiri | Ihe ndetu | Ndi so meputa ihe nkiri (ọru) |
---|---|---|---|
1996 | Karishika | omee | ya na Becky Ngozi Okorie (Karishika)
Bob-Manuel Udokwu (onye ozuzu aturu Everest), Sandra Achums, Amaechi Muonagor |
1998 | Ndi amoosu | Omee | (Ọrụ di ka Dickson) ya na Liz Benson (Adaeze), Zack Orji (Desmond), Patrick Doyle (Onye azuzu aturu), Obot Etuk (Jagua), Bukky Ajayi (Nne Desmond), Larry Koldsweat (Babalawo), Tony "Otu izu" Muonagor (George) |
2000 | Issakaba | omee | ya na Zulu Adigwe, Chiwetalu Agu, Sam Dede, Amaechi Muonagor |
2001 | ìhè ubochi | Omee | Hanks Anuku, Enebeli Elebuwa, Gentle Jack, Bimbo Manuel |
2002 | Mkpu enyemaka | Omee, onye nduzi | Amaechi Muonagor, Ngozi Nwosu, Clem Ohameze, Nkiru Sylvanus |
Nwa m nwanyi | Omee | ya na Chiege Alisigwe,
Pete Eneh, Clem Ohameze, Zack Orji, Bob-Manuel Udokwu | |
Ibe Akwa na iru-ugu | Omee | Sandra Achums, Chiwetalu Agu, Chiege Alisigwe, Pete Edochie, Emeka Ike, Ramsey Nouah | |
2003 | òke abuo | Omee, Onye nduzie | ya na Osita Iheme (A-Boy), Chinedu Ikedieze (Bobo), Patience Ozokwor, Amaechi Muonagor |
inwu nihi ihunanya | Omee, Onye nduzi | ya na Chiege Alisigwe, Bruno Iwuoha, Ramsey Nouah, Clem Ohameze | |
Ihunanya ji m | onye nduzi | Hanks Anuku, Osita Iheme, Chinedu Ikedieze, Camilla Mberekpe | |
umu nwoke lagos | Onye nduzi | Julius Agwu, Osita Iheme, Chinedu Ikedieze, Ronke Ojo | |
nwoke ezughi oke | Omee, Onye nduzi | Lilian Bach, Emeka Ike, Genevieve Nnaji, Muna Obiekwe | |
2004 | Otu nde ara ogbubga | Omee, Onye nduzi | ya na Chiege Alisigwe, Charles Awurum, Emeka Enyiocha, Kenneth Okonkwo |
Anya nke ihunanya | Onye nduzi | Ini Edo, Emeka Ike, Tom Njamanze | |
Egwuruegwu rụrụ arụ | Omee, onye nduzi | ya na Chioma Chukwuka, Ejike Asiegbu, Sam Dede, Thelma Okoduwa | |
Mazi Ibu | Omee, onye nduzi, ngosi ihe onyonyo, Odee | (mere dika Azuh) ya naJohn Okafor (Ibu), Osita Iheme (Muo) | |
Idi nkwadobe inwu | Onye nduzi | Jim Iyke, Lilian Bach | |
Ndi nghori: umu nwanyi ojoo | omee, Onye nduzi | Ya na Bimbo Akintola, Rita Dominic | |
Obi nke mmadu | Onye nduzi | Steve Eboh, Pete Edochie | |
Abuo aburula otu | onye nduzi | Chioma Chukwuka, Emeka Ike, Patience Ozokwor | |
2005 | Ebe ngedobe ego | Omee, onye mmeputa, onye nduzi, odee | with Pete Edochie, Ejike Asiegbu, Pete Edochie, Kanayo O. Kanayo, Kenneth Okonkwo, Chiege Alisigwe |
Ụzọ oroma | Onye nduzi | Pat Attah, Rita Dominic, Desmond Elliot, Oge Okoye | |
Dọkapu | Omee,Onye nduzi | Charles Lawson, Genevieve Nnaji, Ramsey Nouah | |
nkpuru obi no n'oku | Omee, Onye nduzi | Patience Ozokwor, Sophia Tchidi Chikere, Olu Jacobs | |
Nwanyi no n'elu | Omee, Onye nduzi | ya na Stephanie Okereke, Saint Obi, Ifeoma Anyiam, Steve Eboh, Uche Elendu | |
2006 | Ntaramahuhu | Omee, onye nduzi | Kate Henshaw-Nuttal, Ramsey Nouah, Oby Okafor |
ulo oru na-agbaoso | Omee, onye nduzi | ya na Monalisa Chinda, Uche Jombo, Zack Orji, Tony Umez | |
Oke òkè | Omee, onye nduzi | Chidi Mokeme, Dakore Egbuson, Ofia Afuluagu Mbaka, Nobert Young | |
Ndi nwoke nagba-ọsọ | Onye nduzi | Klint da Drunk
(dika onwe ya), Sam Loco Efe, John Okafor, Victor Osuagwu | |
nwannem nwanyi di uto | Omee, onye nduzi | Chigozie Atuanya, Dakore Egbuson, Emeka Ike, Gentle Jack | |
Nwanyi: Ị ga-eruberịrị isi | Onye nduzi | Fred Amata, Ngozi Ezeonu, Kate Henshaw-Nuttal, Ramsey Nouah, Tony Umez | |
Ọkụ dị jụụ | Omee, onye nduzi | Ini Edo, Charles Inojie, Uche Jumbo | |
Anu ohia wolf ahu | Onye nduzi | Ejike Asiegbu, Nonso Diobi, Prince Eke, Desmond Elliot, Charles Inojie | |
2007 | Onye agbatobi | Omee,Onye nduzi | ya na Nonso Diobi (Tony), Ebube Nwagbo (Whitney), Monalisa Chinda (Geraldine) |
Onye nkịtị di ike | Omee, Onyenduzi | ya na Osita Iheme, Chinedu Ikedieze, Sam Loco Efe, Queen Nwokoye, Victor Osuagwu | |
Ịgịgị di isi ike | Omee, onye nduzi | ya na Osita Iheme, Chinedu Ikedieze | |
Dike kachasi | Onye nduzi | ya na Chiwetalu Agu, Chidi Mokeme, Oge Okoye, | |
2009 | onye nduhie eziokwu | Omee,onye nduzi | (oru dika Oscar)ya na Ini Edo (Diana), Justus Esiri (Denis), Ali Nuhu (Damian), Sylvia Oluchy (Lara) |
2013 | Mama dị abuọ | Onye nduzi, Odee | Osita Iheme (Arusi), Chiwetalu Agu (Osimiri), Ify Dollars (Bebiana), Ugo Doris Igwe (Miss Kate), Linda Iheanacho (Cossy) |
Ndụ onwe onye
dezieN'afo 2015,nna Chukwu nwuru. N'onwa Mee nke afo 2016, nwunye Chukwu muru ejima.[8][9]
Hụkwa
dezie- Ndepụta nke ndị nduzi ihe nkiri Naijiria
- Ndepụta ndị si Ebonyi Steeti
Ebemside
dezie- ↑ Andy Chukwu to make VVF movie.
- ↑ Adeyemo (4 March 2013). Nollywood & Mr. President! Goodluck Jonathan Pledges N3 Billion Grant to the Nigerian Movie Industry at Presidential Dinner to Celebrate Nollywood at 20. Bellanaija.com.
- ↑ John Okafor
- ↑ Andy Chukwu, Ebonyi govt unveil Street to Skills for youths. Vanguardngr.com (17 February 2016).
- ↑ Andy Chukwu Unveils Street to Skills | the Guardian Nigeria News - Nigeria and World NewsSaturday Magazine — the Guardian Nigeria News – Nigeria and World News. Archived from the original on 17 May 2019. Retrieved on 17 May 2019.
- ↑ Andy Chukwu to make VVF movie. Archived from the original on 17 May 2019. Retrieved on 17 May 2019.
- ↑ Andy Chukwu. IMDb.com.
- ↑ Movie star, Andy Chukwu welcomes cute set of twins + 7 adorable photos of 2016 Celebrity babies. Kemifilani.ng (17 May 2016).
- ↑ Nollywood Actor Andy Chukwu's Wife Gives Birth To Twins [PHOTOS]. Naijagists.com (17 May 2016).
Njikọ mpụga
dezie- Andy Chukwu na IMDb