Clem Ohameze
Clem Ohameze bụ onye na- eme ihe nkiri na Naịjirịa nke nọ goro afọ iri abụọ n'ịrụ ọrụ ahụ. [1] Clem Ohameze malitere ọrụ nkaa na afọ 1995. Mana ọrụ aka ya chapuu na 1998 mgbe ọ gosipụtara ihe nkiri eji nnukwu ego mee akpọrọ ENDTIME. [2] O meela ihe karịrị ihe nkiri narị ise n'ime afọ iri abụọ bido na 1995 ruo taa. Enwere olile anya na ọ ga ewepụta ọtụtụ fim ọzọ na ọnwa ndị na-abịa. [3]
Ụlọ ọrụ mmepụta ihe | ụlọ ọrụ ihe nkiri, Ihe nkiri nke Naịjirịa, ụlọ ọrụ ntụrụndụ |
---|---|
ụdịekere | nwoke |
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Clem |
ụbọchị ọmụmụ ya | 27 Jụn 1965 |
Ebe ọmụmụ | Port Harcourt |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | omee |
ụdị ọrụ ya | theater arts |
ebe agụmakwụkwọ | University of Port Harcourt |
ogo mmụta | bachelor's degree, nzere masters |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1995 |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
Ọrụ ama ama | Ijé |
official religion | Efefe Kraịst |
nnọchiaha nkeonwe | L485, L305216 |
Nzụlite
dezieA mụrụ Clem Ohameze na 27 June 1965 na Port Harcourt, Rivers, Nigeria . Ọ gara Holy Family College / Baptist High School maka akwụkwọ sekọndrị ya. Ọ gakwara n’ihu mụọ akwụkwọ na Institute of Management Technology, Enugu, Nigeria ebe ọ nwetara Ordinary National Diploma na Mass Communication [4] wee gaa Mahadum Port Harcourt nke bu ebe ọ gụsịrị akwụkwọ na BSc na Sociology na Anthropology na 1989. Ọ kwụsịghị ebe ahụ. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Buckingham, London na 2010 wee nweta Masters na Mgbochi Ọrịa .
Ọrụ ihe nkiri
dezieOhameze bụ onye otu Actors Guild of Nigeria. Ọ pụrụ na iime ihe nkiri na obere oge ime n'etiti 2006 wee ruo 2010 iji chụsoo ọdịmma ya ndị ọzọ gụnyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo. Ọ laghachila azụ n'ọrụ nkiri ya. [5] N'afọ 2010, Ohameze so na ihe nkiri nke turu ugo nke aha ya bu gbara egwu na fim a na-enweta na ntanetị bụ Ije: The Journey ya na Genevieve Nnaji na Omotola Jalade Ekeinde .
Ndọrọ ndọrọ ọchịchị
dezieOhameze guzo n'ihi ntuli aka maka nnọchite anya ndị Ohaji-Egbema-Oguta Federal constituency na Naijiria na ụlọ nzukọ Federal House of Representatives na 2007. O guzoro ndi otu Peoples Democratic Party (PDP). Agbanyeghị, akọrọ akụkọ ebubo na ọ hapụrụ nchụso ndọrọ ndọrọ ọchịchị maka iyi egwu nke ndụ ya. A wakporo ụgbọ ala ya, ma gbaguo nwanne ya nwoke n'oge ihe a mere. [6] Ohameze kwagara na obodo London, United Kingdom. O bu n’obi ịsọ mpi maka nhọpụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ n’afọ 2015. [7] [8]
Nrụtụaka
dezie- ↑ Clem Ohameze battles for The Kingdom. Vanguardngr.com (2012-10-27). Retrieved on 2013-09-21.
- ↑ Clem Ohameze Makes Nollywood Comeback With Eucharia Anunobi, Others In The Kingdom. nigeriafilms.com (2012-11-03). Retrieved on 2013-09-21.
- ↑ Photos: Meet Clems Ohameze, The Nigerian Legend Who Does Not Joke With His “Blood Money” Roles In Movies- See How He (2020-04-25). Archived from the original on 2020-10-13. Retrieved on 2020-05-26.
- ↑ Suleiman, Taiye (2008-04-07). Nollywood Photo Blog: Pictorial Glance at Clem Ohameze of Nollywood.
- ↑ Izuzu, Chidumga. "#ThrowbackThursday: Watch Clem Ohameze, Olu Jacobs, Zack Orji in End Time". (in en-US)
- ↑ Clem Ohameze attacked. www.mjemagazine.com (26 November 2011). Archived from the original on 2013-09-21. Retrieved on 2013-09-19.
- ↑ "My Car was Attacked,My cousin killed and My Driver Escaped with a Bullet - Nollywood Actor Clems Ohameze", 2011-11-26. Retrieved on 2017-02-21.
- ↑ "Clem Ohameze battles for The Kingdom - Vanguard News", 2012-10-27. Retrieved on 2017-02-21.