Bob-Manuel Udokwu
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 18 Eprel 1968 |
Ebe ọmụmụ | Ogidi |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
Asụsụ ọ na-ede | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | onye nhazi ndu ihe nkiri, omee, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
ebe agụmakwụkwọ | University of Port Harcourt, University of Lagos |
agbụrụ | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
Bob-Manuel Obidimma Udokwu (amụrụ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Eprel 1968) bụ onye omee, onye ntụziaka, onye na-emepụta ihe nkiri na onye ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa. [1] N'afọ 2014, ọ nwetara nturu ugo nke ogologo ndụ na awọd nke 10th Africa Movie Academy Awards . [2] [3] [4] A họpụtara ya maka onye na -eme ihe nkiri kacha mma na ọrụ nkwado na 2013 Nollywood Movies Awards maka ọrụ ya na Adesuwa .
Ntọala
dezieỌ bụ onye Nkwelle-Ogidi, Idemmili North LGA nke Anambra State, Naijiria. Ọ bụ onye Igbo site n'ebo. Aha nna ya bụ Geoffrey Nwafor Udokwu na aha nne ya bụ Ezelagbo Udokwu. A mụrụ ya na steeti Enugu . Ọ bụ nwa nke anọ n'ime ezinụlọ nwere ụmụaka isii. Ọ bụkwa nwa nwoke nke abụọ. O sitere na ezinaụlọ nke mejupụtara ụmụ nwoke atọ na ụmụ nwanyị atọ.
Mmụta
dezieỌ gara ụlọ akwụkwọ St. Peters (nke akpọrọ ugbu a Hillside Primary School) na Coal Camp, Enugu, Enugu Steeti maka agụmakwụkwọ elementrị ya na Oraukwu Grammar School, Oraukwu, Anambra State maka ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya. Ọ gara mahadum Port Harcourt, Port Harcourt, Rivers State ebe ọ nwetara nzere bachelọ nke Arts na Theater Arts. O nwetara nzere masta na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nka na mmekọrịta mba ụwa na mahadum Lagos, Lagos Steeti. Ọ bụ onye isi otu ndị na-ahụ maka ihe nkiri nka na mahadum nke afọ Nigeria n'afọ 1989-1990 [5]
Ndụ onwe onye
dezieUdokwu zutere nwunye ya bụ Cassandra Joseph mgbe ọ na -eme mmemme nzere masta ya na mahadum Lagos, ebe ọ ka n'agụ akwụkwọ na mahadum. Ha lụrụ na FFebrụwarị abalị iri na iteghete,nke afọ 2000. [6] Alụmdi na nwunye ahụ mepụtara ụmụaka abụọ, otu nwanyị na nwa nwoke. Aha nwata nwanyị ya bụ Elyon Chinaza na aha nwa ya nwoke bụ Marcus Garvey. [7] Ọ kpọrọ nwa ya nwoke, Garvey Udokwu aha onye ndu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Marcus Garvey . [8]
Filmografii
dezie- Living in Bondage
- Rattlesnake
- Karishika
- The Key for Happiness
- Black Maria
- What a World
- Heaven after Hell
- A Time to Love
- Cover Up
- Endless Tears
- Naked Sin
- My Time
- Home Apart
- Games Men Play
- Soul Engagement
- Living in Bondage: Breaking
Hụkwa
dezie- Ndepụta ndị Igbo
- Ndepụta ndị na -emepụta ihe nkiri Naịjirịa
Nrụtụ̀aka
dezie- ↑ Bob-Manuel Udokwu joins Gov Obiano’s cabinet. Vanguard (Nigeria). Retrieved on 10 August 2014.
- ↑ NONYE BEN-NWANKWO AND KEMI VAUGHAN (July 27, 2013). Bob-Manuel Udokwu is not happy now. The Punch. Archived from the original on 12 August 2014. Retrieved on 10 August 2014.
- ↑ NKARENYI UKONU (November 18, 2012). Ladies warn me not to pick my husband’s call again — Cassandra Udokwu. The Punch. Archived from the original on 29 November 2013. Retrieved on 10 August 2014.
- ↑ Ayo Onikoyi (4 May 2014). How Amaka Igwe made me a star – Bob Manuel-Udokwu. Vanguard (Nigeria). Retrieved on 10 August 2014.
- ↑ Modern Ghana - Breaking News, Ghana, Africa, Entertainment. www.modernghana.com. Retrieved on 2021-04-18.
- ↑ My marriage...with Bob-Manuel Udokwu (en-US). Punch Newspapers (2020-12-11). Retrieved on 2021-04-17.
- ↑ Bob-Manuel's Daughter, Elyon Chinaza Udokwu Crowned African Queen 2016 - Glamtush (en-US) (2016-06-21). Archived from the original on 2021-04-18. Retrieved on 2021-04-18.
- ↑ Biography, Profile, Movies and Success Story of Bob Manuel Udokwu. (30 April 2018). Archived from the original on 21 August 2018. Retrieved on 24 September 2018.