Oyigbo
Oge/afọ mmalite | 1991 |
---|---|
mba/obodo | Naijiria |
dị na ngalaba nhazi mpaghara | Rivers state |
dị na mpaghara oge | UTC+01:00 |
nhazi ọnọdụ | 4°52′41″N 7°7′42″E, 4°53′13″N 7°7′31″E |
ụlọ ọrụ nke onye isi gọọmentị nwere | onyeisi oche nwaanyi |
postal code | 502 |
Koodu ọkpụkpọ obodo | +234 |
Oyigbo amakwaara dị ka Obigbo bụ ọchịchị ime obodo dị na Rivers Steeti, Naijiria. Ọ bụ obodo, [1] kilomita iri atọ site na Port Harcourt, km irí abụọ na ise site na obodo Aba . Ọ bụ ndị Asa ka ndị Igbo bi bụ ndị a na-ahụkwa na ọdịda okpuru ọchịchị Ukwa na Abia steeti na ndị Ndoki dị na okpuru ọchịchị ọwụwa anyanwụ Ukwa nke Abia steeti na okpúru ọchịchị Ukanafun nke Akwa ibom steeti.
Onye isi Precious Oforji bụ onye a họpụtara onyeisi oche nke ọchịchị ime obodo Oyigbo n'afọ 2008. [2] EZE Mike Nwaji echiri eze ọdịnala Obigbo n'afo1998. [3] Obodo na obodo nta dị n'okpuru ọchịchị Oyigbo gụnyere : Obigbo district; Asa, Komkom, Obeama, Obigbo, ebe ndị Ndoki district ha gụnyere Afa Uku, Afam, Afam Nta, Azusogu, Egberu, Mgboji, Mrihu, Obeakpu, Obeta, Obumku,Okoloma, Okponta, Umuagbai, Umuosi. [3]
N'ihi ebe Oyigbo dị, e nwere esemokwu dị n'etiti steeti ndị gbara agbata obi, Rivers steeti na steeti Abia gbasara nke steeti kwesịrị ị nweta ọchịchị ime obodo Oyigbo . Ka e nwechara mkparịta ụka ọtụtụ oge n'etiti steeti abụọ ahụ metụtara, e nwere nkwekọrịta na Oyigbo ga-adị ka akụkụ nke steeti Rivers . [4]
Ịchọgharị mmanụ na nyocha mmanụ ọkụ
dezieShell Petroleum Development Company (SPDC) na-arụ ọrụ olulu mmiri na ochichi ime obodo . [5] Eastern Network Gas Pipeline (Alscon pipeline) na-agafe Oyigbo na ugwu. [6] : 5 Nigerian National Petroleum Corporation, NNPC na Rivers Steeti Gomenti n'okpuru Gọvanọ Rotimi Chibuike Amaechi kwere nkwa ịrụkọ ọrụ ọnụ iji weghachi ọrụ mmepụta na Shell Petroleum Development Company, SPDC na-arụ ọrụ na Oyigbo Gas Plant. [7] Na abalị nke mbụ ọnwa Nọvemba afọ 2013, na-ekwu maka nnukwu ahụike na nchekwa dị n'ahụ ndị mmadụ, Shell Petroleum Development Company nke Naijiria Ltd (SPDC), JV mechiri ụlọ ọrụ gas Oyigbo n'ihi ịbanye n'ụzọ ziri ezi nke oyere mmanụ ọkụ . [8]
N'ụbọchị irí abụọ na asatọ nke ọnwa Juun afọ 2015, SPDC JV's kwuputara na Afam VI ya nke dị n'obodo Okoloma nke Oyigbo ebubatala ọkụ eletrik dị nde iri abụo n'ime ụlọ ọrụ mba ahụ wee mepụta ọrụ karịrị otu narị na iri ise. [9]
Akụ na ụba
dezieOkpuru ọchịchị ime obodo Oyigbo nwere nnukwu ego nke mmanụ crude na gas nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ na-egwupụta mmanụ na-arụ ọrụ na mpaghara ahụ na-enye aka na akụ na ụba. [10] ọchịchị ime obodo bụ ebe a na -akụ azụ nke nwere osimiri na mmiri ndị mejupụtara hydrosphere nke mpaghara ahụ bara ụba na nri mmiri. . Ihe omume akụ na ụba ndị ọzọ ama ama na ọchịchị ime obodo Oyigbo gụnyere ọrụ ugbo, ịzụ ahịa na nka . [11]
Oyigbo na-anabata ọtụtụ azụmahịa n'obodo ya. Enwere ike ịhụ ọtụtụ ụlọ ọrụ nke ndị mmadụ n'otu n'otu na gọọmentị nwere na Oyigbo. [12] Ụlọ ọrụ ndị a gụnyere ma ọnweghị oke na họtel, ụlọ ọrụ, ụlọ ahịa azụmahịa, na ndị ọzọ.
- ↑ Chinedu (2021-08-09). Sit-at-home order witnesses partial compliance in parts of Rivers (en-US). Daily Post Nigeria. Retrieved on 2023-04-25.
- ↑ Odimegwu Onwumere (31 Oct 2008). Grassroots Politics, Precious Oforji's Example. Modern Ghana Media Communication Limited. Retrieved on 2009-10-17.
- ↑ 3.0 3.1 places. Towns & Villages in Oyigbo « Rivers State « Nigeria. (en-US). Towns & Villages. Retrieved on 2022-10-01.
- ↑ Oyigbo saga: Setting the records straight (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2020-11-09). Retrieved on 2023-04-26.
- ↑ Odimegwu Onwumere (12 Dec 2008). Shell Neglects Shell Road In Oyigbo L.G. A. Modern Ghana Media Communication Limited. Retrieved on 2009-10-17.
- ↑ Role of Nigerian Gas Company in the Nigerian Electricity Industry. nipptransactions.com (June 2013). Archived from the original on 2023-04-25. Retrieved on 2024-07-06.
- ↑ NNPC, Rivers Government Move to Resuscitate Oyigbo Gas Plant. nnpcgroup.com.
- ↑ SPDC JV shuts down Obigbo gas plant over encroachment on the right-of-way of gas pipelines. shell.com.ng.
- ↑ SPDC JV’s Afam VI delivers 20million MWh electricity into national grid…creates over 150 jobs. shell.com.ng.
- ↑ Oyigbo Local Government Area. www.manpower.com.ng. Retrieved on 2023-05-02.
- ↑ Fish Import and Export, Agriculture and Agro-Allied in Oyigbo L.G.A, Rivers State | Nigeria Directory, A List of Nigerian Businesses, Organisations, Firms and Companies | Nigeria Yellow Pages. www.directory.org.ng. Retrieved on 2023-05-05.
- ↑ Oyigbo, Rivers State | Nigeria Directory, A List of Nigerian Businesses, Organisations, Firms and Companies | Nigeria Yellow Pages. www.directory.org.ng. Retrieved on 2023-05-13.