Chibuike Rotimi Amaechi (amụrụ ya n'ụgbọchị iri abụọ n'asaa nke ọnwa Mee n'afọ1965) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria, o jere ozi dị ka Minista Federal nke Transportation nke Naijiria site n'afọ 2015 ruo afọ 2022 n'okpuru ụlọ ọrụ nke Onye isi ala Muhammadu Buhari .[1] Ọ gbara arụkwaghịm iji zọọ mpi maka ọkwa onye isi ala Naịjirịa n'okpuru ọchịchị All Progressive Congress (APC). Ọ rụrụ ọrụ dị ka gọvanọ nke Rivers Steeti nke jupụtara na mmanụ site n'afọ 2007 ruo afọ 2015 na Onye ọkà okwu nke ụlọ nzuko Rivers steeti site n'afọ 1999 ruo n'afọ 2007.[2] N'abalị itoolu n'ọnwa Eprel afọ 2022, Amaechi kwupụtara mmasị ya ịzọ ọkwa onye isi ala n'afọ 2023, ọ bịara onye nke abụọ na ntuliaka onye isi ala nke APC nke e mere n'ọnwa June afọ 2022 n'azụ Bola Tinubu na votu narị atọ na iri na isii site n'aka ndị nnọchiteanya.[3]


Rotimi Amaechi
Minister of Transportation
[[ Ambassador to Templeeti:CountryPrefixThe]]
In office
Templeeti:En dash range
PresidentMuhammadu Buhari
Preceded byhimself
Succeeded byMu'azu Jaji Sambo
[[ Ambassador to Templeeti:CountryPrefixThe]]
In office
Templeeti:En dash range
PresidentMuhammadu Buhari
Preceded byAudu Idris Umar
Succeeded byhimself
Governor of Rivers State
[[ Ambassador to Templeeti:CountryPrefixThe]]
In office
Templeeti:En dash range
DeputyTele Ikuru
Preceded byCelestine Omehia
Succeeded byEzenwo Nyesom Wike
Speaker of the Rivers State House of Assembly
[[ Ambassador to Templeeti:CountryPrefixThe]]
In office
Templeeti:En dash range
GovernorPeter Odili
Personal details
Born
Chibuike Rotimi Amaechi

(1965-05-27) 27 Mee 1965 (age 59)
Ikwerre, Eastern Region, Nigeria (now Rivers State, Nigeria)
NationalityNigerian
Political partyAll Progressives Congress (2014–present)
Other political
affiliations
Peoples Democratic Party (1999–2014)
Spouse(s)Judith Amaechi
Children3
Education Bachelor of Arts (Honours) in English Literature
Alma materUniversity of Port Harcourt
Rotimi Amaechi
mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya27 Mee 1965 Dezie
Ebe ọmụmụIkwerre Dezie
Dị/nwunyeJudith Amaechi Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye ọka iwu Dezie
Ọkwá o jiGovernor of Rivers State, Minister of Transportation, Minister of State for Transportation Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Port Harcourt, Baze University Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party, All Progressives Congress Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie

Ihe ndị mere n'oge gara aga

dezie

A mụrụ Amaechi na Ubima, nke dị n'ọchịchị ime obodo Ikwerre na Rivers Steeti n'ezinụlọ Elder Fidelis Amaechi lagoru ala mmụọ na Mary Amaechi. Aha mbụ ya na nke ikpeazụ ya bụ aha Igbo nke pụtara "Chineke bụ ike" na "Onye ma echi" n'otu n'otu.[4][5] A zụlitere ya na Diobu, mpaghara nwere ọtụtụ mmadụ nke dị na Port Harcourt.[6][7]

Ọ gụrụ akwụkwọ n'oge ọ bụ nwata na St Theresa's Primari sukulu site n'afọ 1970 ruo n'afọ 1976. O nwetara asambodo nke West Afrikan Senior Sukulu n'afọ 1982 mgbe ọ gachara ụlọ akwụkwọ Gọọmentị Sekondiri Sukulu Okolobiri. Amaechi nwetara nzere Bachelor nke Arts (Nsọpụrụ) na English Stọọdịs na Literature na Mahadum Port Harcourt n'afọ1987, ebe ọ bụ onye isi oche nke National Union of Rivers States Students (NURSS).

Ọ gụchara ụlọ ọrụ ndị ntorobịa bụ́ National Youth Service n'afọ 1988, mgbe nke ahụ gasịrị, ọ sonyeere Pamo Clinics and Hospitals Limited nke Peter Odili nwere, ebe ọ rụrụ ọrụ ruo n'afọ 1992. Ọ bụkwa onye nduzi nke ọtụtụ ụlọ ọrụ, gụnyere West Africa Glass Industry Limited na Risonpalm Naijiria Limited.

N'abalị iri na itoolu n'ọnwa Nọvemba afọ 2022, Amaechi kwupụtara na Twitter ya na ọ bụ onye gụsịrị akwụkwọ na Law n'akụkụ foto nke nnọkọ ya.

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị mbụ

dezie

N'oge mgbanwe gaa na Republic nke Atọ nke Naịjirịa, Amaechi bụ odeakwụkwọ nke National Republican Convention na ọchịchị ime obodo Ikwere nke Rivers Steeti. N'agbata afọ 1992 na afọ 1994, ọ bụ onye enyemaka pụrụ iche nye osote gọvanọ nke Rivers Steeti, Peter Odili onye isi ya kwenyere na Amaechi dị ka nwa okorobịa nwere ikike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma kpọbata ya n'okpuru nku ya. N'afọ 1996, ọ bụ odeakwụkwọ Rivers Steeti nke kọmitii nlekọta Democratic Party of Nigeria (DPN) n'oge mmemme mgbanwe nke General Sani Abacha.[8]

Ụlọ Nzukọ nke Rivers State (1999-2007)

dezie

N'afọ 1999, o zọrọ ma merie oche iji bụrụ onye otu Ụlọ Nzukọ nke Rivers Steeti iji nọchite anya mpaghara ya. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye ọkà okwu ndi ụlọ nzukọ. A họpụtakwara Amaechi ka ọ bụrụ onye isi oche nke Nzukọ Ndị Ọkà okwu nke Nzukọ Steeti nke Naịjirịa. N'ọnwa Mee afọ 2003, a họpụtara ya ọzọ dị ka onye ọkà okwu. N'afọ 2003, mgbe Nzukọ nke Mba gara were ọrụ iwu nke Ụlọ Nzukọ nke Steeti dị ka edepụtara na iwu, ya na ndị ọrụ ibe ya wegara okwu ahụ na Ụlọikpe Kasị Elu.

Dị ka ọkà okwu, Amaechi jiri mmekọrịta ya na Gọvanọ Peter Odili rụọ ọrụ iji mee ka mmekọrịta dị n'etiti ndị isi na ndị omeiwu nke gọọmentị na Rivers Steeti, ruo mgbe Rotimi Amaechi malitere mkpọsa megide Gọọmentị Steeti, ma jiri ọnụ wakpo onyinyo nke Gọvanọ Steeti, na mgbalị iji nọchie Peter Odili dị ka gọvanọ na 2007.

Gọvanọ nke Rivers Steeti

dezie

N'afọ 2007, Amaechi sonyere ma merie na People's Democratic Party (PDP) maka Gọvanọ Rivers Steeti n'afọ 2007. Ndị otu ahụ nọchiri aha ya, ihe ọ gbara n'ụlọ ikpe. Ikpe ahụ mechara rute n'Ụlọikpe Kasị Elu. Ọ ghọrọ gọvanọ na abalị iri abụọ n'isii, ọnwa Ọktoba n'afọ 2007, mgbe Ụlọikpe Kasị Elu kpebiri na ọ bụ onye ruru eru nke PDP na onye mmeri nke ntuli aka Gọvanọ nke ọnwa Eprel afọ 2007 na Rivers Steeti.

Ọchịchị ya tinyere ego na mmepe akụrụngwa, iwu okporo ụzọ na àkwà mmiri, na-agbaso ọhụụ nke ijikọ akụkụ niile nke steeti site n'okporo ụzọ. Gọvanọ ahụ raara onwe ya nye imezigharị obodo na imeziwanye ọrụ njem. Ọchịchị ya malitere iwu otu ụgbọ okporo ígwè iji nye njem ọha n'ime obodo Port Harcourt.[9] E wuru ụfọdụ ọrụ ụlọ ọrụ ọkụ eletrik (Afam, Trans Amadi, Onne) iji melite ike eletrik na steeti ahụ.[10]

A họpụtara ya ọzọ maka oge nke abụọ na abalị iri abụọ na isii ọnwa Eprel afọ 2011. N'ọnwa Ọgọstụ afọ 2013, Amaechi so n'ime ndị gọvanọ asaa na-eje ozi bụ ndị guzobere otu G-7 n'ime PDP. N'ọnwa Nọvemba afọ 2013, Amaechi na ndị otu G-7 ise gbagara n'òtù mmegide ọhụrụ bụ All Progressives Congress (APC) wee ghọọ onye isi nchịkwa nke mkpọsa onye isi ala Muhammadu Buhari.[11]

Minista na-ahụ maka njem

dezie

N'afọ 2015, mgbe nhọpụta Muhammadu Buhari gasịrị, a họpụtara Amaechi na kọmitii ya dị ka Minista na-ahụ maka njem nke gọọmentị etiti. N'ọnwa Julaị 2019, Onye isi ala Buhari họpụtara ya ọzọ maka nhọpụta minista.[12] Ndi Senate gwara Amaechi ka ọ kpọọ isi ala ma gawa n'oge nyocha ya.[13][14]

Ebubo nrụrụ aka

dezie

Kemgbe ọ hapụrụ ọrụ n'afọ 2015, Amaechi bụ onye a na - ebo ebubo nrụrụ aka site n'aka onye nọchiri ya bụ Gọvanọ Ezenwo Wike.[15] Wike boro ya ebubo na ọ na-eji ego steeti eme ihe iji kwado mkpọsa onye isi ala Muhammadu Buhari n'oge ntuli aka onye isi ala nke afọ 2015 site na ire mmanụ na gaasị nke Rivers, yana iji aghụghọ mebie ego nke ire ya ruru US $ nde 309.[16][17] Amaechi anọgidewo na-agọnahụ ebubo ndị e boro ya.[18] N'afọ 2018, o kwetara na n'agbanyeghị agha nrụrụ aka nke Buhari na-emegide, nrụrụ aka dị n'ime ọchịchị.[19]

Arụmụka banyere Izu ohi ọzọ na 2022

dezie

Ụlọikpe Kasị Elu nke Naijiria n'ọnwa Mee, 2022 nyere ndị na-ahụ maka nyocha Rivers steeti ohere ka ha nyochaa Amaechi maka ebubo aghụghọ dị ijeri naira iri itoolu na isii.[20]

Ndụ onwe onye

dezie

Ọ lụrụ Judith Amaechi ma ha mụtara ụmụ nwoke atọ.[21] Ọ bụ onye Katọlik bụrụkwa onye otu ndị Knight of Saint John (KSJ).[22][23]

N'abalị iri abụọ na asaa n'ọnwa Mee n'afọ 2021, Minista Naịjirịa na-ahụ maka njem, Rt. Hon. Rotimi Amaechi, ghọrọ onye na-agụ egwu ma wepụta egwu izizi ya akpọrọ 'Blessed The People The Lord Has Chosen As His Heritage' na mmekorita ya na nwunye ya, Judith na ncheta ọmụmụ ya nke afọ 56.

Onyinye

dezie

Amaechi nwere nsọpụrụ mba nke Commander of Order of Niger (CON). [citation needed]

Hụkwa

dezie
  • Ndepụta ndị si Rivers State
  • Ndepụta nke ndị Gọvanọ nke Rivers State site n'oge ha nọ n'ọchịchị
  • Ndepụta nke ndị Gọvanọ nke Rivers State
  • Kọmitii nke Naịjirịa

Ihe odide

dezie
  1. Buhari Congratulates Amaechi, Danu On Daura chieftaincy titles (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2022-02-05). Retrieved on 2022-02-22.
  2. Governor of Rivers State (en-US). Chibuike Rotimi Amaechi. Archived from the original on 2020-05-08. Retrieved on 2020-05-28.
  3. JUST IN: Amaechi declares presidential ambition (en-US). Vanguard News (2022-04-09). Retrieved on 2022-04-09.
  4. Ukpong (11 December 2015). Igbo Culture and Gospel. LIT Verlag Münster. ISBN 3643905297. 
  5. Okoroike (2009). Igbos of Nigeria and Their Cultural Ways:Aspects of Behavior, Attitudes, Customs, Language and Social Life. iUniverse. ISBN 0595621406. 
  6. "The story of Port Harcourt city", Vanguardngr.com, Vanguard Media, 18 November 2013. Retrieved on 25 May 2014.
  7. Abia. "2015 and Rivers’ banana politics", Daily Independent. Retrieved on 2014-05-25.
  8. Admin. #OBFocus! Rotimi Amaechi- Honorable Minister for Transportation, Federal Republic of Nigeria. Onebello. Archived from the original on 23 June 2020. Retrieved on 28 January 2019.
  9. Governor of Rivers State (en-US). Chibuike Rotimi Amaechi. Archived from the original on 2020-05-08. Retrieved on 2020-05-28.
  10. Edozie. Rivers’ Multi-billion Naira Power Project Rots Away. Daily Trust. Archived from the original on 21 April 2019. Retrieved on 28 January 2019.
  11. Buhari Reappoints Amaechi Campaign DG (en-US). THISDAYLIVE (2018-09-20). Retrieved on 2020-05-28.
  12. Full list of Buhari’s ministerial nominees (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2019-08-27.
  13. Amaechi, Akpabio, Four Others ‘Take A Bow’ As Senate Screens Ministerial Nominees. Channels Television. Retrieved on 2019-08-27.
  14. Ngige, Amaechi, Sirika, others retain portfolios (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2019-08-27.
  15. Amaechi fires back: Wike corrupt; I won’t appear before his commission (en-US). Vanguard News (2015-08-30). Retrieved on 2020-07-15.
  16. Ukpong (2017-07-31). We have overwhelming evidence of corruption against Amaechi, says Wike | Premium Times Nigeria (en-GB). Retrieved on 2020-07-15.
  17. Ukpong (2017-07-31). We have overwhelming evidence of corruption against Amaechi, says Wike | Premium Times Nigeria (en-GB). Retrieved on 2020-07-15.
  18. Opejobi (2017-04-30). I’m not corrupt, don’t like money - Amaechi [VIDEO] (en-US). Daily Post Nigeria. Retrieved on 2020-07-15.
  19. Amaechi: I'd be foolish to say there's no corruption under Buhari (en-US). TheCable (2018-02-16). Retrieved on 2020-07-15.
  20. Taiwo. "Supreme Court gives go ahead for the probe of Rotimi Amaechi on alleged N96 billion fraud", NewsWireNGR, 27 May 2022. Retrieved on 7 November 2022.
  21. Encomium trails Dame Judith Amaechi @ 50 (en-US). Vanguard News (2020-12-15). Retrieved on 2022-02-23.
  22. New Catholic Honour Tasks Amaechi to Hit the Mark (21 August 2019). Archived from the original on 19 August 2021. Retrieved on 19 August 2021.
  23. Rotimi Amaechi Gets Highest Catholic Knights Promotion. Archived from the original on 19 August 2021. Retrieved on 19 August 2021.

Templeeti:RiversStateGovernors

Templeeti:Rivers State People's Democratic Party