Living in Bondage

Living in Bondage
film
ụdịdrama film Dezie
mba osiNaijiria Dezie
Mmalite asụsụ ihe ngosiAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
afọ/ụbọchị mbipụta1992 Dezie
Onye nduziChris Obi Rapu Dezie
onye nsonye ihe nkiriKanayo O. Kanayo, Francis Agu Dezie
ebe akụkọNaijiria Dezie
Ụcha anụkpa ahụcolor Dezie
usoro nkesadirect-to-video Dezie

Living in Bondage na asụsụ bekee ma ọ bụ ibi ndu na nkekọ bụ ihe nkiri ndi Nigerian emere n'afọ 1992/93 nke nwere akụkụ abụọ. Kenneth Nnebue na Okechukwu Ogunjifor bụ ndi dere ihe ejije thriller nkea ebe Chris Obi Rapu haziri ya ka ọ bụrụ ihe nkiri[1] Jafac Wine nyere nkwado maka ime pụta ihe nkiri nkea. E mere ihe nkiri nkea ozigbo na vidio, [2] Kenneth Okonkwo na Nnenna Nwabueze bu ndi obụ ụzo egwu na ihe nkiri Living in Bondage.

Na Ọgọstụ 2015, Charles Okpaleke nwetara ikike maka ihe nkiri Living in Bondage ruo afọ iri n’okpuru ụlọ ọrụ mmepụta ya, Play Entertainment Network. [3] Na Nọvemba 2 2019, akụkụ abụọ ihe nkiri a nke a na-atụ anya ya nke ukwuu, Living In Bondage: Breaking free, [4] [5] pụtara na Lagos.[6]

Akụkọ nke ihe nkiri ahụ dezie

Andy Okeke ( Kenneth Okonkwo ) na nwunye ya Merit (Nnenna Nwabueze) nwere ọtụtụ nsogbu nke chere ha n'ihụ - enweghị ọrụ, enweghị ego, itinye aka na ịchụ ego adịgboroja, yana atụmatụ adịghị mma nke ụmụ nwoke na enwe ebe Merit nọ gụnyere onye isi na ihụ ọrụ ya nke bụ Ichie Million (Francis Agu) na Chief Omego ( Kanayo O. Kanayo ). Andy na-atụnyere enweghị akụ na uba ya na ihe ịga nke ọma nke ndị ọgbọ ya, ọkachasị enyi ochie ya Paul (Okechukwu Ogunjiofor). N'agbanyeghị nkwado na ndidi Merit, Andy daba na ịda mbà n'obi, ma kpebisie ike inweta akụ na ụba n'ụzọ ọ bụla ọnwere ike. Paul, onye na-ekwu okwu nzuzu kpughe ihe nzuzo ya - òtù nzuzo nke ekwensu, ebe ndị otu na ekwe nkwa iguzosi ike n'ihe ha n'nye Lucifer nke bụ ịgbuo ndị ha hụrụ n'anya na emume ịchụ àjà, ka ha were nweta akụ na ụba dị ukwuu na nloghachi. Mgbe o nwechara obi abụọ, Andy kwenyesiri ike ịjị onye ọ kacha hụ n'anya - Merit wee chụ àjà. Merit nwụrụ n'ụlọ ọgwụ ụbọchị ole na ole ememe ahụ gasịrị, mana tupu nke ahụ ọ bụrụ Andy ọnụ maka arụ ahụ.

Ọganihu na aku na uba Andy na mberede na ịlụgharị nwunye ọzọ na ọnwa atọ ka Merit nwụsịrị mee ka ndị ọgọ ya malite ebubo na ọ ma ihe mee nwa ha nwanyị. O nwekwara nsogbu ndị ọzọ - ndi nta akụkọ na-enyocha ndụ ya kwa ụbọchị, nwunye ọhụrụ ya bụ Ego ( Ngozi Nwosu ) buru ego ya gba ọsọ mgbe ọ daa na agbamakwụkwọ ọdịnala ha, mmụọ Merit na-apụta na eyi ya ụjọ ma na-atụ ya egwu mgbe ọ na-atụghị anya ya. Andy mecha kpọrọ nwanyi ọzọ, Chinyere (Jennifer Okere), onye nke enyi nwanyị Merit na mbụ bụ Caro (Ngozi Nwaneto) kpọbatara ya. Chinyere zuuru di ya ohi. Mana ọ ezute ọnwụ ya mgbe Caro nyere ya nsị. Caro gbalịsie kwa ike iji ego nwanyi ahụ zuru na ohi n'aka Andy wee gbapụ na mba ọzọ mana ụgbọ ala gburu ya na mberede ka ọ na eje ebe ana banye ụgbọ elụ. Paul mecha bụrụ onye egburu mgbe Andy chere eche maka ndụ ya wee kpebie na Paul dụfere ya uzo.

Andy nwere nnukwu nkụda mmụọ ma rịọ ndị òtù nzuzo nke ekwensu ahụ maka enyemaka. Onye Isi Nchụaja (Daniel Oluigbo) siri ọnwụ na nanị ihe ọ nwere ike ime ka mmụọ nwunye dajuọ bụ ime ka ọ kpuo ìsì na ihe ndị ọzọ, ọ jụrụ ma bụrụ zia onye isi na-adịghị mma, na-ebi ndụ dị na n'okporo ụzọ n'obodo Lagos wee ruo mgbe Tina (Rita Nzelu) - onye akwụna Andy kpọtara na mbụ nye ndị òtù nzuzo dị ka onye nnọchite anya maka Merit nke ha chọpụta aghụghọ ahụ wee kwechiri na ọ bụ ka ha ga egbu. Tina kpọgara Andy n’ụlọ ofufe ya ebe ọ mechara kwupụta na ogburu Merit. Nne Andy (Grace Ayozie) bere akwa n'ili Merit nrịọ ya mgbaghara.

Na ihe ikpeazụ nke ihe nkiri ahụ, Andy, nke a gwọrọ ara, soro na-efe ofufe ndị Kraịst ndị kwenyere na a gbagharala ya mmehie ya. [7] [8] [9]

Ndi nọ na ihe nkiri dezie

  • Kenneth Okonkwo dika Andy Okeke [10]
  • Nnenna Nwabueze dị ka Merit, nwunye Andy
  • Kanayo O. Kanayo dị ka Chief Omego, onye otu nzuzo
  • Felicia Mayford dị ka Obidia
  • Francis Agu dị ka Ichie Nde Nde, onye otu nzuzo na onye isi ndị ọrụ Merit
  • Okechukwu Ogunjiofor dika Paul, enyi Andy na onye otu nzuzo [11]
  • Ngozi Nwaneto dị ka Caro, enyi Merit na enyi nwanyị Paul
  • Ngozi Nwosu dika Ego, Enyi nwanyị Andy
  • Chizoba Bosah dịka nwanne nne Merit
  • Bob-Manuel Udokwu dị ka Mike, onye otu nzuzo
  • Sydney Diala dị ka onye otu nzuzo / onye mbido
  • Daniel Oluigbo dika onye isi nchuaja
  • Obiageli Molugbe dika nne okpukperechi
  • Rita Nzelu dị ka Tina, akwụna
  • Jennifer Okere dị ka Chinyere, enyi Caro
  • Ruth Osu dika onye agbata obi Andy na Merit
  • Grace Ayozie dika nne Andy
  • Benjamin Nwosu dika nna Andy

Ndị na-eme ihe nkiri Kanayo, Agu, Udokwu, Molugbe, na Osu bụ ndị bụbu ndị na eme ihe nkiri na onyonyo nke ak pọrọCheckmate, ebe Okere so na ihe nkiri Ripples. Ndia nyeere aka ime ka ọha mmadụ mara ihe nkiri Living in Bondage. Nwabueze, Nwosu na Ogunjiofor bụ naanị ndị na apụtaghị na akụkụ ihe nkiri ahụ nke abụọ.

.

Nke nsochi dezie

N'afọ 2015, onye omee ihe aka ochie Ramsey Nouah nwetara ikike maka Living in Bondage n'aka Kenneth Nnebue maka ịmegharị ya ọhụụ a. [12] Emechara gosiputa ozi a na Instagram, mana ihe nkiri nke nsochie a pụtaghị ruo afọ atọ. [13]

Na 2018, Nouah kwuputara na ihe nkiri nsochi ahụ nke akpọrọ ugbu a Living in Bondage: Breaking Free, enwela isi. Ọ wepụtara ya na Nọvemba 8, 2019. Ngwangwa, ihe nkiri nke ahụ bụrụ onye nkiri 11 nke kachasị na Naijiria. Nouah, onye pụtara dịka onye isi ụkọchukwu ọhụụ ndi otu nzuzo bu kwa onye haziri ihe nkiri,a nke bụ fem mbụ ọ na-eduzi. Ndị mbido ihe nkiri Living in Bondage - Okonkwo, Udokwu, na Kanayo so kwa na nkea.[14] Akụkọ a gbadoro ụkwụ na nwa Andy nke aha ya bụ Nnamdi, na etu o si achọ akụ na ụba dịka nna ya nke bu ya ụzọ. Rapper, na Muna Abii na Swanky JKA so kwa na ihe nkiri nke a.

Ihe nkiri a malitere na Netflix na Mee 2020. [15]

Hụ kwa dezie

  • Ndepụta nke ihe nkiri Naijiria nke 1992

Ntụrụaka dezie

Njikọ dị na mpụga dezie

  • Living in Bondage on IMDb