Ezenwa-Ohaeto
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 31 Maachị 1958 |
Ụbọchị ọnwụ ya | 25 Ọktoba 2005 |
Ebe ọ nwụrụ | Cambridge |
ihe kpatara ọnwụ | liver cancer |
nwa | Chinua Ezenwa-Ohaeto |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | pidgin Naịjirịa, Bekee |
ebe agụmakwụkwọ | University of Nigeria, University of Benin |
Ezenwa-Ohaeto (1958), bụ onye Naijiria na-ede uri, onye na-ede akụkọ mkpirikpi na onye nkuzi.[1][2] [3]Ọ bụ otu n'ime ndị Naijiria mbụ bipụtara uri e dere na pidgin English.[3] Ọ nwụrụ na mba Cambridge n'afọ 2005.[4]
Ndụ na ọrụ
dezieA mụrụ Ezenwa-Ohaeto na 31 Maachị 1958 n'aka Michael Ogbonnaya Ohaeto na Rebecca Ohaeto n'Ife Ezinihite Mbaise na mpaghara gọọmentị nke Imo Steeti.[5] Ọ malitere agụmakwụkwọ praịmarị ya na St. Augustine Grammar School, Nkwerre n'afọ 1971.[5] Ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ya n'afọ 1975 na nka na sayensị ebe ọ nwetara asambodo Grade One.[5] Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum[3] Naịjirịa n'okpuru nkuzi nke onye edemede Chinua Achebe na onye nkatọ Donatus Nwoga site n'afọ 1971 ruo 1979.[5] O mechara gụsịa akwụkwọ ma nweta nzere Bachelor of Arts na nsọpụrụ na Bekee.[5] O nwetara Masters of Arts site na UNN na agụmakwụkwọ site na gọọmentị steeti Imo n'afọ 1982.[5] N'afọ 1991, e nyere ya nzere PhD n'ide akwụkwọ site na Mahadum Benin .[3][5]
Ezenwa-Ohaeto malitere ọrụ nkuzi ya n'afọ 1980 dị ka onye enyemaka nkuzi na Mahadum Ahmadu Bello .[5] Site n'afọ 1982 ruo 1992 ọ kụziri na Anambra State College of Education, Awka dị ka onye nkuzi.[5] Ọ kụziri na Alvan Ikoku Federal College of Education dị ka osote prọfesọ site n'afọ 1992 ruo 1998 na dị ka onye nkuzi dị elu na Mahadum Nnamdi Azikiwe site n'afọ 1998 ruo mgbe ọ nwụrụ na 2005.[5][5] Ezenwa-Ohaeto lụrụ Ngozi onye ya na ya nwere ụmụ anọ.
Ọ bụ nna Chinua Ezenwa-Ohaeto.[6]
Onyinye na nkwanye ùgwù
dezie- Ihe nrite BBC Arts na Africa Poetry
- Association of Nigerian Authors/Cadbury Poetry Award
- Fellow, African Studies Centre, Mahadum Cambridge
Akwụkwọ
dezie- Chants of a Minstrel
- I Wan Bi President
- Songs of a Traveller
- Chinua Achebe: A Biography
- The Voice of the Night Masquerade
- "If to Say I bi Soja"
- "Winging Words"
Edensibia
dezie- ↑ Nwakanma (2007). "Ezenwa-Ohaeto: Chants and the Minstrel". Dialectical Anthropology 31 (1/3): 65–72. Retrieved on 23 May 2022.
- ↑ Of Minstrelsy and Masks: The Legacy of Ezenwa-Ohaeto in Nigerian Writing.
- ↑ 3.0 3.1 3.2 3.3 Ezenwa - Ohaeto. Poetry Foundation. Retrieved on 24 May 2022. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name "PoF" defined multiple times with different content - ↑ Nigeria: Ezenwa Ohaeto (1958-2005). This Day (8 November 2005). Retrieved on 24 May 2022.
- ↑ 5.00 5.01 5.02 5.03 5.04 5.05 5.06 5.07 5.08 5.09 5.10 Emmanuel K. et al., 2012, Pg. 322
- ↑ Chika (2022). Chinua Ezenwa-Ohaeto: The Shape of Dreams and Memories. AfroCritik. Retrieved on 31 October 2022.