University of Benin (Nigeria)

Mahadum ọha na Nigeria
Mahadum nke Benin
public university
Oge/afọ mmalite1970 Dezie
aha gọọmentiUniversity of Benin Dezie
akara alaUniversity of Benin Dezie
aha otutuUNIBEN Dezie
affiliationAssociation of African Universities Dezie
ederede motoKnowledge and Character Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaKazaure Dezie
dị na mpaghara ogeCentral European Time Dezie
ebeȮra Edo Dezie
nhazi ọnọdụ6°20′1″N 5°36′1″E Dezie
Onye òtù nkeAssociation of African Universities Dezie
asụsụ eji dee ọrụBekee Dezie
Asụsụ ọ na-asụBekee Dezie
webụsaịtịhttps://www.uniben.edu/ Dezie
agba agbaOdòdo, gold, edo edo Dezie
Map

 

Faculty of Engineering University of Benin

Mahadum Benin (UNIBEN) bụ mahadum nyocha ọha na eze dị na Benin City, Edo State, Nigeria.[1] Ọ bụ otu n'ime mahadum ndị gọọmentị etiti nke Naịjirịa nwee ma guzobe ya n'afọ 1970.[2] Ụlọ akwụkwọ ahụ nwere Ogige ụlọ akwụkwọ abụọ ugbu a nwere ngalaba iri na ise gụnyere ọbá akwụkwọ etiti a na-akpọ John Harris Library.[3] A na-ewu ụlọ ndị dị na UNIBEN nke ọma, ha adịghị nso na ibe ha.

UNIBEN nwere ụlọ ọgwụ nkuzi a na-akpọ Mahadum nke Benin Teaching Hospital (UBTH), nnukwu ụlọ ọgwụ nwere ngalaba niile na ngalaba ahụike, e nwekwara ngalaba dị iche iche dị ka ngalaba nke SERVICOM, Medical Records, ụlọ ndị nọọsụ na ndị dọkịta, ọrụ ịsa ákwà, nri na ọtụtụ ndị ọzọ.[4]

Akụkọ ihe mere eme dezie

 
Ọnụ ụzọ ámá Mahadum Ugbowo Campus

E hiwere Mahadum Benin n'afọ 1970. National Universities Commission (NUC) enyela ikike nye ngalaba nke mahadum ahụ.[5][6]

Ọ́bá Akwụkwọ John Harris dezie

 
Ọbá akwụkwọ John Harris, UNIBEN

Ọbá akwụkwọ John Harris bụ ọbá akwụkwọ agụmakwụkwọ dị na ogige Ugbowo. A na-akpọ ọbá akwụkwọ ahụ aha onye ọsụ ụzọ na-ahụ maka ọbá akwụkwọ Mahadum, John Harris.Isi Ụlọ akwụkwọ nke ọbá akwụkwọ ahụ bụ Mahadum Benin nke e hiwere n'afọ 1970 nke a na-akpọbu Institute of Technology.[7]

Ọbá akwụkwọ a nke nwere nnukwu nchịkọta nke dị na ndị nke ebipụtara na nke na-ebipụtaghị dị kpọmkwem n'ihu Ụlọ obibi ụmụ akwụkwọ n'agụ nlenyere anya gbasara ụlọ ọgwụ n'ime Ogige mahadum ahụ. Akwụkwọ ndị e nwetara ma debe n'ọbá akwụkwọ ahụ, metụtara ọmụmụ niile a na-enye na mahadum ahụ. Ọ bụ onye na-nlekọta ọbá akwụkwọ mahadum na-elekọta ihe omume na-nduzi ya.

E guzobere Ọbá Akwụkwọ John Harris site na iwu nke Institute of Technology nke afọ 1970 mana National University Commission (NUC) nyere ya ogo nyefe nke mahadum n'abalị mbụ nke ọnwa Julai afọ 1971. Ma ahọpụtara John Harris dị ka ọbá akwụkwọ ahụ.[8]

Ọ́bá Akwụkwọ nke Ngalaba Mahadum dezie

Ọbá akwụkwọ John Harris agbasaala kemgbe ọtụtụ afọ. Mmụba nke ntinye ọgụgụ nke ụmụ akwụkwọ na ndị nchọpụta, yana nchọ ikekere nke National University Commission (NUC) mere ka e guzobe ọbá akwụkwọ ngalaba mahadum. Ọbá akwụkwọ ngalaba enwere bụ: [citation needed]

  1. Ọ́bá Akwụkwọ Ekehuan.
  2. Ọ́bá Akwụkwọ ngalaba Ọrụ Ugbo.
  3. Ọbá akwụkwọ ngalaba agụmakwụkwọ.
  4. Ọbá akwụkwọ ngalaba injinia.
  5. Ọbá akwụkwọ ngalaba iwu.
  6. Ọbá Akwụkwọ ngalaba njikwa Sayensi.
  7. Ọbá akwụkwọ ngalaba ahụike.
  8. Ọbá akwụkwọ ngalaba ọgwụ.
  9. Ọba akwụkwọ ngalaba sayensị n'elebanya gbasara ndụ bụ Life Science.
  10. Ọbá Akwụkwọ ngalaba gbasara Sayensi ihe ana ahụ anya bụ physical Science
  11. Ọba Akwụkwọ ngalaba gbasara sayensi metụtara ọha bụ Social Science .
  12. Ọbá akwụkwọ ahụike bụ Basic Medical .

Kọleji nke Sayensị Ọgwụ dezie

Koleji UNIBEN nke ngalaba Ọgwụ na ọgwụgwọ bụ Medicine na-akụzi gbasara ọgwụ ma na-enye ndị dọkịta na-awa ahụ na ndị nwere nka gbasara Gburugburu gburugburu ọgwụgwọ nzere ọkachamara. Koleji ngalaba gbasara Ọgwụ na ọgwụgwọ bụ Medical Sciences nwere ụlọ akwụkwọ atọ na otu ụlọ ọrụ, ya bụ:

 
Faculty of Management Science University of Benin

Ụlọ Akwụkwọ gbasara Ọgwụ dezie

E guzobere ụlọ akwụkwọ ahụike n'afọ 1973, mgbe ahụ site na Faculty of Medicine buruzie Ụlọ akwụkwọ Medicine iji mee ihe omume nzere nke Bachelor of Medicine na Bachelor of Surgery (MBBS). Onye isi ngalaba ụlọ akwụkwọ mbụ bụ Prọfesọ T. Belo-Osagie. Ọ bụ onye isi ngalaba Ụlọ akwụkwọ site n'afọ 1973 ruo 1975. Site na ọpụpụ nke Prọfesọ T. Belo-Osagie, Prọfesụ K. Diete-Koki ghọrọ onye isi ngalaba nke ụlọ akwụkwọ ahụ. Kemgbe ahụ, ụlọ akwụkwọ ahụ enweela ndị isi ngalaba Ụlọ akwụkwọ na ndị isi ngalaba dị iche iche n'ime afọ iri atọ gara aga. Onye isi ngalaba ụlọ akwụkwọ ahụ gara aga bụ Prọfesọ. Dr. (med.) E. Oviasu ebe onye isi ngalaba nọ ugbu a bụ Prọfesọ Wilson E. Sadoh .[9]

Ụlọ Akwụkwọ nke Sayensị Ọgwụ dezie

E guzobere School of Basic Medical Science n'ọnwa Disemba afọ 2003, site na College of Medical Sciences ma mechaa malite ya na onwa Jenụwarị afọ 2004. Ụlọ akwụkwọ hụ na-eme omume agụmakwụkwọ B.Sc.

Na mgbakwunye, ụlọ akwụkwọ ahụ na-enye aka n'ọrụ nye ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ dị na Ogige kọleji ahụ: Ụlọ akwụkwọ nke Ọgwụ na nke ngalaba gbasara Eze bụ Dentistry yana ngalaba ndị ọzọ na mahadum ahụ: Sayensị na School of Pharmacy.

Ụlọ akwụkwọ Basic Medical Science nwere ngalaba asaa edepụtara:

  1. Anatomy
  2. Biochemistry Ọgwụ
  3. Sayensị nke ụlọ nyocha ahụike[10]
  4. Sayensị Nọọsụ
  5. Ọdịdị ahụike -physiology
  6. Ọgwụgwọ ahụike physiotherapy
  7. Radiography na Radiation Science.[9]

Ụlọ Akwụkwọ ngalaba gbasara Ọgwụgwọ Ezé dezie

Ụlọ akwụkwọ ngalaba ọgwụgwọ eze na-ahazi ọmụmụ na usoro mmụta n'ime kọleji na nsonye onyinye Bachelor of Dental Surgery (BDS). E guzobere ụlọ akwụkwọ ngalaba ọgwụgwọ ezé, dị ka a maara ya n'oge ahụ, n'afọ 1976 ma nabata ìgwè ụmụ akwụkwọ na oge agụmakwụkwọ afọ 1976/77. E guzobere ya dị ka akụkụ dị mkpa nke College of Medical Sciences n'afọ 1975 site na mmezigharị nke Ụ̀kpụrụ nke nguzobe Mahadum Benin. N'afọ 2012, site na nkwado site n'aka ndị International Federation of Endodontic Associations(IFEA), onyinye sitere na Mahadum Texas na Houston School of Dentistry, na ezinụlọ Owen, Dr. Mbachan Collins Okwen BDS. (Benin), DDS., MBA. webatara endodontics regenerative na endodontics microscopic nke oge a na Mahadum nke Benin Teaching Hospital.[9][11]

Ndị Isi Mahadum dezie

  • Kenneth Robson Hill, onye isi Mahadum [12]
  • T.M. Yesufu, onye isi Mahadum mbụ bụ Nwa amaala Benin [12]
  • Grace Alele-Williams, nwanyị mbụ bụ onye isi Mahadum na Naịjirịa. O jere ozi site n'afọ 1985 ruo 1991[13]
  • Andrew Onokheroraye[14]
  • Anao[14]
  • Emmanuel Nwanze
  • Osayuki Godwin Oshodin, 2009-2014[15]
  • Faraday Osasere Orumwense, 2014- 2019[16]
  • Lilian Salami, 2019 ka ọdị ruo ugbu a[17]

Ndị gụsịrị akwụkwọ na Mahadum a ama ama dezie

  • Enyinnaya Abaribe, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị si Steeti Abia [18]
  • Oladipo Agboluaje, onye na-eme ihe nkiri[19]
  • Emmanuel Agwoje, onye na-nchekwa ego[20]
  • Aigboje Aig-Imoukhuede, onye guzobere Access Bank Plc na onye nguzobe na onyeisi oche, Africa Initiative for Governance[21]
  • Josephine Anenih, onye ọka iwu na onye bụbu minista[22]
  • Helen Asemota, prọfesọ nke biochemistry na biotechnology[23]
  • Lota Chukwu, onye na-eme ihe nkiri[24]
  • George Edozie, onye na-ese ihe[25]
  • Mitchell Elegbe, GMD/CEO Interswitch[26]
  • William Erese. onye bụbu onye Afrịka nwere ndekọ mgbalị nke, 110 Meters High Hurdles
  • Abiodun Falodun, rector, Edo State Polytechnic[27]
  • Babatunde Fashola, onye bụbu gọvanọ Lagos Steeti, onye jere ozi ugboro abụọ site na Mee 29, 2007, ruo Mee 29, 2015, na minista na-ahụ maka ike, ọrụ na ụlọ na Naịjirịa ugbu a[28]
  • James Ibori, onye bụbu Gọvanọ nke Delta State site na 29 Mee 1999 ruo 29 Mee 2007[29]
  • Tom Ilube, onye guzobere na onye isi oche, Crossword Cybersecurity[30]
  • Wellington Jighere, 2015 WESPA Scrabble onye mmeri[31]
  • Patience Maseli, nwanyị mbụ osote onye nduzi nke Upstream Division na Ngalaba Petroleum Resources[32]
  • Richard Mofe-Damijo, onye na-eme ihe nkiri Nollywood[33]
  • Darlington Obaseki, dọkịta na prọfesọ[34]
  • Omoni Oboli, onye Naijiria na-eme ihe nkiri, onye nduzi ihe nkiri na onye na-emepụta ihe nkiri[35]
  • Bright Okpocha ("Basketmouth"), onye na-eme ihe ọchị[36]
  • Suyi Davies Okungbowa, onye edemede na ọkà mmụta[37]
  • Ovie Omo-Agege, onye omeiwu na Senate nke asatọ nke Naịjirịa[38]
  • Osonye Tess Onwueme, onye edemede na prọfesọ[39]
  • Victor F. Peretomode, ọkà mmụta na prọfesọ[40]
  • Benedict Peters, onye guzobere otu Aiteo[41]
  • Amaju Pinnick, Onye isi ala Nigeria Football Federation[42][43]
  • Ijeoma Uchegbu, ọkà mmụta sayensị na prọfesọ[44]
  • Emmanuel Uduaghan, onye bụbu gọvanọ, Delta State[45]
  • Sabina Umeh, onye na-agụ egwu[46]

Nkà mmụta a ma ama dezie

  • Alexander Oppenheim (1973-1977), onye mgbakọ na mwepụ[47]
  • Epiphany Azinge, onye bụbu onye nduzi nke Nigerian Institute of Advanced Legal Studies

Ngosi foto dezie

Ihe odide dezie

  1. Departments -Tertiary (en-US). Ministry of Education (Nigeria). Archived from the original on 2011-07-23. Retrieved on 2019-07-07.
  2. UNIBEN… X-raying a 48-year-old (en-US). The Nation Nigeria (2018-03-22). Retrieved on 2019-07-07.
  3. Umukoro (2017-12-01). "Determinants of e-library services’ use among university students: A study of John Harris Library, University of Benin, Nigeria" (in en). Journal of Librarianship and Information Science 49 (4): 438–453. DOI:10.1177/0961000616653176. ISSN 0961-0006. 
  4. Uneasy calm as UBTH awaits new CMD (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2017-08-04). Retrieved on 2022-05-23.
  5. Uniben retains 2nd position in Nuc programme accreditation-VC. Vanguard News (2018-11-15). Retrieved on 2019-07-06.
  6. Brief History (en-CA). University of Benin. Retrieved on 2019-07-06.
  7. View of The Pioneers: William John Harris (1903-1980) | World Libraries. worldlibraries.dom.edu. Retrieved on 2021-07-13.
  8. University of Benin, Nigeria (en). Top Universities. Retrieved on 2021-07-13.
  9. 9.0 9.1 9.2 About – College of Medical Sciences (en-US). colmed.uniben.edu. Retrieved on 2018-10-02.
  10. 2022 Updated List of UNIBEN Faculties and Departments (en-US). Latest JAMB News | All Nigerian Universities News (2021-01-31). Archived from the original on 2022-02-08. Retrieved on 2022-02-08.
  11. "Star of the South Table Clinic winners announced | UTHealth School of…", 2013-03-20. Retrieved on 2018-10-02.
  12. 12.0 12.1 University of Benin | Nigerian Optometric Association. noang.org. Retrieved on 2021-07-16.
  13. Grace Alele-Williams - Biography (en). Maths History. Retrieved on 2021-07-16.
  14. 14.0 14.1 UNIBEN VC tussle: A contest of indigene or merit? (en-US). Vanguard News (2009-08-09). Retrieved on 2021-07-16.
  15. OSHODIN: A Study In University Administration (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2015-02-27). Retrieved on 2021-07-16.
  16. UNIBEN’S giant strides at 48 (en-US). The Sun Nigeria (2018-05-31). Retrieved on 2021-07-16.
  17. UNIBEN appoints second female vice-chancellor | Premium Times Nigeria (en-GB) (2019-10-27). Retrieved on 2021-07-16.
  18. Kassim (2021-12-30). Abaribe, Ramatu Tijjani Aliyu bag HURIWA Man/Woman of the year award (en-GB). Platinum Post News. Retrieved on 2022-05-24.
  19. Oladipo Agboluaje (en). International Research Center. Freie Universität Berlin (10 October 2008). Retrieved on February 25, 2019.
  20. Fyn-Sydney. "Emmanuel Osa Agwoje, a phenomenal example in Nigeria Capital Market", Modern Ghana, May 1, 2010. Retrieved on February 25, 2019. (in en)
  21. Company Overview of Coronation Capital (Mauritius) Limited. Bloomberg (February 25, 2019). Retrieved on February 26, 2019.
  22. ANENIH, Barr Josephine Nwogo. BLERF's Who's Who in Nigeria. Biographical Legacy and Research Foundation (11 November 2016). Retrieved on February 25, 2019.
  23. HELEN ASEMOTA PROMOTED TO PROFESSOR | Marketing and Communications Office, The University of West Indies at Mona. www.mona.uwi.edu. Retrieved on 2019-12-21.
  24. Meet Lota Chukwu The Nollywood Elixir | Celeb Of The Week - Evatese Blog. www.evatese.com. Retrieved on 2021-02-08.
  25. "New Nigerian Conjunctures: The Art of George Edozie", Artstrings, September 21, 2018. Retrieved on February 25, 2019.
  26. Company Overview of Interswitch Limited. Bloomberg (February 25, 2019). Retrieved on February 25, 2019.
  27. DVC delivers UNIBEN's 150th inaugural lecture (en-US). The Nation Newspaper (2015-03-11). Retrieved on 2019-07-20.
  28. "Fashola Reunites With Former Law Classmates At UNIBEN For 30 Years Anniversary", National Helm, November 13, 2017. Retrieved on February 25, 2019.
  29. "Ibori, our convocation speaker? Not here! UNIBEN students, staff and alumni tell Acting VC Kubeyinje", Sahara Reporters, November 12, 2009. Retrieved on February 26, 2019.
  30. "Tom Ilube receives honorary degree from City", City, University of London, January 30, 2018. Retrieved on February 25, 2019. (in en)
  31. Wang. With the word 'felty,' for 36 points, Wellington Jighere becomes the first African world Scrabble champion. Washington Post. Retrieved on 25 February 2019.
  32. Thomas-Odia. "Women must work hard to be relevant in male- dominated field", 13 April 2019. Retrieved on 16 April 2019.
  33. "Biography & Net Worth of Nollywood Actor RMD", Business Day Liberia, March 20, 2018. Retrieved on February 26, 2019.
  34. FG appoints Obaseki substantive CMD of UBTH. Vanguard News (2017-08-26). Retrieved on 2019-07-05.
  35. Omoni Oboli (en-US). Alumni | New York Film Academy. Retrieved on 2021-07-15.
  36. Kagire. "Basketmouth to perform in Kigali", New Times (Rwanda), February 22, 2019. Retrieved on February 25, 2019.
  37. Reader. "Interview with Suyi Davies Okungbowa", Civilian Reader, May 23, 2019. Retrieved on January 18, 2022.
  38. Adurokiya. "Things you should know about Senator Ovie Omo-Agege", Nigerian Tribune, April 18, 2018. Retrieved on February 25, 2019.
  39. Tess Osonye Onwueme. African Books Collective. Retrieved on February 25, 2019.
  40. Okafor. "How we tamed Cultism in DELSU, by vice chancellor", Guardian Newspapers, May 17, 2019. Retrieved on June 27, 2019.
  41. Mikva. "12 Things You Didn't Know About Nigerian Billionaire Benedict Peters", Moguldom, February 19, 2015. Retrieved on February 25, 2019.
  42. Amaju Pinnick, others For UNIBEN Alumni Awards. guardian.ng. Archived from the original on 15 April 2019. Retrieved on 15 April 2019.
  43. Error on call to template:cite web: Parameters archiveurl and archivedate must be both specified or both omittedPost UNIBEN honours NFF President and others for sports excellence. aitonline.tv. Archived from the original on 28 August 2018. Retrieved on 28 August 2019.
  44. BioPharm International Editors (December 2, 2006). The Talent Pool. BioPharm International. Retrieved on February 25, 2019.
  45. Company Overview of Niger Delta Power Holding Company Limited. Bloomberg (February 25, 2019). Retrieved on February 25, 2019.
  46. "Entrepreneur Kese Jabari & his Beauty Queen/Musician Wife Sabina Umeh cover Mode Men Magazine's February Issue as they dish on their 30-Year Romance", BellaNaija, February 9, 2017. Retrieved on February 25, 2019.
  47. Greenfield. "Obituary: Sir Alexander Oppenheim", The Independent, December 15, 1997. Retrieved on March 12, 2021. (in en)

Njikọ mpụga dezie

  • Official website