Mahadum Nnamdi Azikiwe

Mahadum ọha nke ala Naijiria
Mahadum Nnamdi Azikiwe
mahadum
Oge/afọ mmalite1991 Dezie
aha gọọmentiNnamdi Azikiwe University Dezie
akara alaNnamdi Azikiwe University Dezie
A gụrụ ahaNnamdi Azikiwe Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaỌká Dezie
dị na mpaghara ogeUTC+01:00 Dezie
ebeAnambra Steeti Dezie
nhazi ọnọdụ6°14′34″N 7°7′6″E Dezie
Onye òtù nkeAssociation of African Universities Dezie
asụsụ eji dee ọrụBekee Dezie
Asụsụ ọ na-asụBekee Dezie
webụsaịtịhttp://www.unizik.edu.ng/ Dezie
Map

Mahadum Nnamdi Azikiwe, Ọka nke a na-akpọ kwa UNIZIK maọbu NAU na nkenke bu mahadum nke ọchịchị gọọmenti etiti nke ala Nigeria. Ọ nwere ogige abụọ na steeti Anambra . [1] Isi ụlọ akwụkwọ ya dị n'Awka (isi obodo Anambra Steeti) ebe ogige ụlọ akwụkwọ nke ọzọ dị na Nnewi . E nwekwara ogige ndị ọzọ dị na mahadum Nnamdị Azịkwe, Ọka. Ndị a gụnyere Agulu dị n'okpuru ọchịchị Aniocha na Ifite-Ogwuari [2] dị n'okpuru ọchịchị Ayamelum na steeti Anambra . [3] Ọ bụ otu n'ime mahadum gọọmentị etiti nke otu a na-akpọ National Universities Commission na-ahụ maka ya ma nyekwa ikike. A kpọrọ mahadum ahụ aha Dọkịnta Nnamdi Azikiwe . [1] Ndị ọrụ agụmakwụkwọ nke Mahadum ahụ so n'otu akpọrọ Academic Staff Union of Universities (ASUU) n'okwu bekee. A maara ndị ọrụ otu ahụ inye ụmụ akwụkwọ ndị na-enweghi ka ọ ra ha ohere agụmakwụkwọ dị ka ndị ọrụ enyemaka ndị ọzọ. [4]

Ọnụ ụzọ ámá nke mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka

Akụkọ ihe mere eme na mgbe gara aga dezie

Mahadum Nnamdi Azikiwe biara dị ka ihe mputa dika ụlọ akwụkwọ mahadum steeti Anambra (ASUTECH) kwụsịrị. ASUTECH nke ehiwere site n'iwu nke asaa ka ọnwa Julaị gbara mkpụrụ ụbọchị iri atọ na afọ otu puku na nari iteghete na iri asatọ (30 Julaị 1980) nke sitere n'aka Gọọmenti Anambra ochie, nke rụrụ ọrụ dị ka mahadum nwere ọtụtụ ogige ụlọ akwụkwọ, nke nwekwara ogige dị na Abakiliki, Enugwu, Ọka na Nnewi. N'afọ otu puku na narị iteghete na iri iteghete na otu (1991), ka e kewasịrị steeti Anambra ochie wee nwezie steeti Anambra na steeti Enugwu, ogige ụlọ akwụkwọ Ọka na Nnewi nke ASUTECH ka e hiwereziri ka ọ buru mahadum Nnamdi Azikiwe site n'iwu nke ise nke Anambra Steeti ka ọnwa Nọvemba gbara mkpụrụ ụbọchị iri abụo na isii n'afọ otu puku na narị iteghete na iri iteghete na otu (26 Nọvemba 1991). Gọọmenti etiti weghaara nhazi na nlekọta mahadum Nnamdi Azikiwe site na iwu nke iri atọ na anọ ka ọnwa Julaị gbara mkpụrụ ụbọchị iri na ise n'afọ otu puku na narị iteghete na iri iteghete na abụọ (15 Julaị 1992). [5]

N'afọ otu puku na nari iteghete na iri iteghete na otu (1991), ka e kewasịrị steeti Anambra ochie iji wee nwee steeti Anambra na steeti Enugwu, e jikọtara ogige ụlọ akwụkwọ dị n'Ọka na Nnewi nke mahadum steeti Anambra mbụ (ASUTECH) wee bụrụzie mahadum Nnamdi Azikiwe, nke gọọmentị etiti mechara weghaara. A kpọrọ mahadum ahu aha Nnamdi Azikiwe, onye isi ala Naijiria mbụ. Ogige ụlọ akwụkwọ Ọka ghọrọ mahadum Nnamdi Azikiwe. N'afọ otu puku na narị iteghete na iri iteghete na abụọ 1992, Gọọmenti etiti Naịjirịa weghaara mahadum n'aka Anambra steeti. Mahadum Nnamdi Azikiwe, wee bụrụ mahadum nke ọchịchị gọọmentị etiti [6]

Ebe Mahadum a di dezie

 
Ụlọ nchịkwa nke Mahadum Nnamdi Azikiwe

Isi ụlọ akwụkwọ mahadum ahu dị n'akụkụ ụzọ awara awara si Onicha gaba Enugu nke dị n'Oka, ebe ụlọ akwụkwọ nke abụọ dị na Nnewi (NAUTH na Okofia) na ụlọ akwụkwọ nke atọ dị na Agulu (Ngalaba nke ọgwụ). [1] [7]

Academic Staff Union of Universities (ASUU) dezie

ASUU bụ otu jikọrọ ndị ọrụ agụmakwụkwọ niile na mahadum gọọmentị dị na Naịjirịa. O nwere mmetụta na usoro agụmakwụkwọ mahadum na Nigeria. [8] Otú ọ dị, ngalaba Unizik nke otu Academic Union of Universities (ASUU) na-emetụta ndụ ụmụ akwụkwọ na-enweghị ka ọ ra ha iji wee hụ na ụmụ akwụkwọ ndi ahụ akwụsịghị akwụkwọ. N'ime afọ agụmakwụkwọ 2019/2020, ahọpụtara ụmụakwụkwọ iri atọ ndi na-enweghị ka ọ ra ha na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka nime steeti Anambra site na ngalaba mmụta dị iche iche na mahadum ahụ. [9] Ha ritere ihe nrite nke ịgụ akwụkwọ n'efu site na ego dị otu nde naira na puku narị naira ise nke ndị otu Academic Staff Union of Universities (ASUU) nke ụlọ akwụkwọ ahụ nwetara. E nyere onye ọ bụla ritere uru a puku naira iri ise iji nyere ha aka nakwa n'ịkwado ha na ụlọakwụkwọ ahụ.

[10] E tutere ngalaba ASUU NAU n'afọ puku abụọ na iri na abụọ (2012). Ọkammuta Ike Ọdimegwu bu onye isi mbụ nke ngalaba ASUU NAU ka e mesịrị mmemme nraranye n'afọ puku abụọ na iri na abụọ (2012)

Ndị gụsịrị akwụkwọ ama ama dezie

Ngalaba na Ọnụ ọgụgụ dezie

Mahadum ahụ nwere ọnụ ọgụgụ dị puku iri abụo na anọ na narị asaa na isii maka umụ akwụkwọ na-agu oge niile nakwa ụmụ akwụkwọ puku iri na abụọ na narị anọ na iri asaa na isii maka ụmụ akwụkwọ mmemme nwa oge n'oge afọ agụmakwụkwọ 2004/2005. [17]

UNIZIK nwere ngalaba ukuu iri na anọ nakwa ngalaba nta iri ise na asaa. Mahadum ahụ nwere ngala ukuu ndị a:

1. Ngalaba Agriculture [18]

2. Ngalaba nka

3. Ngalaba nke Basic Medical Sciences

4. Ngalaba nke Biosciences

5. Ngalaba Education

6. Ngalaba Injinia

7. Ngalaba Sayensị Environmental

8. Ngalaba sayensị na teknụzụ ahụike

9. Ngalaba Iwu

10. Ngalaba nke Science Management

11. Ngalaba Ọgwụ

12. Ngalaba nke sayensị ọgwụ [19]

13. Ngalaba nke sayensị anụ ahụ

14. Ngalaba nke Social Sciences

Nsidee dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 About NAU (en-US). Nnamdi Azikiwe University. Retrieved on 2021-05-19.
  2. Anthony B.C. Chiegboka & Kanayo L. Nwadialor (2015). "› jrhr THE IMPERATIVE OF SOCIAL ENGAGEMENT FOR UNIZIK, AWKA: A SOCIORELIGIOUS DISCOURSE". Ajol: 1–9. 
  3. Why UNIZIK? (en-US). Nnamdi Azikiwe University. Retrieved on 2021-05-19.
  4. Philanthropist lifts 10 UNIZIK students | The Nation News Nigeria (en-US). Latest Nigeria News, Nigerian Newspapers, Politics (2021-05-13). Retrieved on 2021-05-22.
  5. Nnamdi Azikiwe University - Discipline, Self-reliance and Excellence (en-US). Nnamdi Azikiwe University. Retrieved on 2021-05-22.
  6. About Nnamdi Azikiwe University. www.unizik.edu.ng. Retrieved on 2015-02-22.
  7. Nnamdi Azikiwe University - Google Search. www.google.com. Retrieved on 2021-05-22.
  8. Etodike Victor Kosolucukwu (2020). The Staff Union Of Universities (ASUU) Strike On Public Universities in Nigeria. How Did it Impact Tertiary Education ?. Amazon.com. Archived from the original on October 20, 2020. Retrieved on May 23, 2021.
  9. ASUU offers scholarship to 30 most-deserving UNIZIK students (en-GB). Tribune Online (2021-02-24). Retrieved on 2021-05-23.
  10. ASUU awards N1.5m scholarship to 30 indigent UNIZIK students | The Nation (en-US). Latest Nigeria News, Nigerian Newspapers, Politics (2021-02-27). Retrieved on 2021-05-22.
  11. 11.0 11.1 11.2 11.3 7 Popular Nollywood Actresses Who Studied At UNIZIK (Photos) - Opera News. gh.opera.news. Archived from the original on 2021-05-23. Retrieved on 2021-05-23.
  12. rita edochie - Google Search. www.google.com. Retrieved on 2021-05-22.
  13. Great Zikites! Nine Popular Nigerian Celebrities Who Are UNIZIK Graduates - Opera News. ng.opera.news. Archived from the original on 2021-05-23. Retrieved on 2021-05-23.
  14. Prof Ogugua Ikpeze - Google Search. www.google.com. Retrieved on 2021-05-22.
  15. 9 Nollywood Actresses That Attended UNIZIK (Photos) - Opera News. ng.opera.news. Archived from the original on 2021-05-23. Retrieved on 2021-05-23.
  16. Rita Orji (en). Africans in STEM. Retrieved on 2021-05-23.
  17. List of Faculties in Nnamdi Azikiwe University. www.unizik.edu.ng. Retrieved on 2018-12-08.
  18. Faculty of Agriculture (en-US). Nnamdi Azikiwe University. Retrieved on 2020-05-25.
  19. Faculty of Pharmaceutical Sciences, Nnamdi Azikiwe University, Awka, Anambra State (en-US). Pharmacists Council of Nigeria. Retrieved on 2021-05-22.