Jumoke George
Ụlọ ọrụ mmepụta ihe | ụlọ ọrụ ihe nkiri, Ihe nkiri nke Naịjirịa |
---|---|
ụdịekere | nwanyị |
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Jumoke George |
Aha ọmụmụ | Olajumoke Amoke Olatunde George, Jumoke George |
aha enyere | Jumoke |
aha ezinụlọ ya | George |
Ebe ọmụmụ | Naijiria |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa, French language |
ọrụ ọ na-arụ | omee |
ụdị ọrụ ya | theater arts |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ihe nkiri | Love Castle, The Ghost and the Tout, My Wife & I, The Wedding Party |
Ihe nrite | City People Entertainment Awards |
nnọchiaha nkeonwe | L485, L484 |
Jumoke George Audio bụ nwaafọ Naijiria onye na-eme ihe nkiri ma na-emepụta ihe nkiri. Aha ya niile bụ Olajumoke Amoke Olatunde George. Ọ meela ihe nkiri ihe karịrị afọ iri anọ ma meekwa ọtụtụ ihe nkiri di iche iche na Ngalaba Yoruba na Bekee nke Nollywood.
Mmalite Ndụ na Mmụta
dezieA mụrụ Jumoke George n'abalị iri na asatọ nke onwa Febụwarị. O tolitere n'ezinụlọ siri ike, ebe ya na nna ya, onye so na ndị agha nakwa nne nne ya bụ Nọọsụ ndị agha bi. Ọ gara akwụkwọ na Command Children School Ann's Barracks Yaba, Lagos ; Army Children School Kano; Anglican Grammar School,Orita mefa, Ibadan ma mecha gaa n'ihu igụ na Government Technical College, Osogbo ebe ọ gụrụ Business Administration. Jumoke si n'ezinụlọ nwee nkewa. Nne ya na nna ya kewara mgbe ọ ka dị obere ma o kpebiri ibi na nke nna ya na nne nne ya. Ya na nne nne ya mechara nwee nsogbu nke mere ka nna ya jụ ya ma chụpụ ya n'ụlọ mgbe ọ ka na-aga ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Nne ya anabataghi ya nke mere ka ọ ga biri na nke ndị enyi ya. [1]
Ọrụ
dezieJumoke George malitere ime ihe nkiri mgbe o dị afọ asatọ site n'aka enyi nna ya. Ọ mere ihe nkiri na nkwago na National Television Authority ( NTA ), Ibadan. E debanyere aha ya na otu ihe nkiri na NTA Ibadan site n'aka otu nwoke aha otutu ya bụ 'Water Aqua'. O mechara zute onyeisi ya bụ Comrade Victor Ashaolu, onye kpọbatara ya n'ụlọ ọrụ ihe nkiri yoruba. Comrade Victor kụziiri ya ihe nkiri n'ihe dị ka afọ iri na otu. N'otu oge n'ọrụ ya, ọ gosighi n'ihe nkiri ọ bụla ihe dị ka afọ iri na anọ na-enwetaghi ọrụ ọ bụla n'aka ndị nduzi na mepụta ihe nkiri n'ihi na ya nwere oke nlezianya n'ebe ụmụ nwoke nke ndị ụlọ ọrụ ahụ nọ. N’oge ezumike a si n'ụlọ ọrụ ihe nkiri, Jumoke bụurụ onye otu Freelance and Independent Broadcasters Association of Nigeria; (FIBAN). Ọ kwadoro ihe omume ise nke mere ka ọ ghara inwe efe n'ime ihe nkiri. [2]
Ihe Nkiri
dezieEekan soso, 2009[3]
The Wedding Party, 2016
Nrite
dezieCity People Movie Matriarch Recognition Award 2018[4]
Ebe m si dee
dezie- ↑ "How I was disowned by my father, rejected by mum at 8 — Olajumoke George", Tribune, 2018-07-22. (in en-GB)
- ↑ "How I survived after movie producers abandoned me – Actress Olajumoke George | Nollywood Community", Nollywood Community, 2018-05-16. (in en-US)
- ↑ Jumoke George.
- ↑ "Winners Emerge @ 2018 City People Movie Awards | City People Magazine", City People Magazine, 2018-09-24. (in en-US)