Wunmi Mosaku
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria, Obodoézè Nà Ofú |
aha enyere | Wunmi, Oluwunmi, Olapeju |
aha ezinụlọ ya | Mosaku |
ụbọchị ọmụmụ ya | 31 Julaị 1986 |
Ebe ọmụmụ | Zaria |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | omee, omee ihe nkiri, stage actor |
ebe agụmakwụkwọ | Royal Academy of Dramatic Art |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2006 |
Wunmi Mosaku Audio (amuru n’afọ 1986) bu onye Naijiria nke Britain ejiri ọrụ ihe nkiri na ịtị egwu wee mara.[1] A maara ya maka ọrụ ya dị ka Joy na ihe ngosi BBC Two bụ Moses Jones (2009) na Holly Lawson na ihe ngosi ITV bụ Vera (2011–12). O meriri 2017 BAFTA TV Award for Best Supporting Actress maka ọrụ ya dịka Gloria Taylor na ihe nkiri TV bụ Damilola, Our Loved Boy (2016). Na 2019, ọ putara n'usoro nke ise Luther.[2]
Ndụ mmalite
dezieA mụrụ Mosaku na Naijiria, ma o mechara kwaga Manchester, England, mgbe ọ dị otu afọ. Ọ gara Trinity Church of England High School na Xaverian Sixth Form College. Ọ gụrụ egwu ruo afọ iri na otu na otu ụmụ egwu nke Manchester Girls Choir. Ndị mụrụ ya bụ ndị prọfesọ na Naijiria mana ha enweghị ike ịrụ otu ọrụ ahụ na UK. Nne ya bidoro ọrụ azụmahịa na nna ya mechara laghachi Naịjirịa.[2]
Ọrụ
dezieMosaku gụsịrị akwụkwọ na Royal Academy of Dramatic Art na 2007 wee mee ọrụ ihe nkiri mbụ ya na Arcola Theatre na mmepụta nke Pedro Calderón de la Barca ' The Great Theatre of the World. Kemgbe ahụ ọ pụtawo na Rough Crossings, nke Rupert Goold duziri ma dabere na akwụkwọ Simon Schama na Lyric Hammersmith; The Vertical Hour nke David Hare na Truth & Reconciliation, ha abụọ gosiri na Royal Court Theatre; Mules na Young Vic. Na 2009, ọ pụtara na Katrina, ejije nke gosipụtara akụkọ mmadụ isii banyere ọgụ ha maka idị ndụ mgbe Hurricane Katrina mebiri obodo New Orleans na August 2005. Mosaku mere dị ka Sophie na ihe ngosi nke Ruined nke Lynn Nottage duziri ma gosi na ụlọ ihe nkiri nke Almeida Theatre.
Na 2008, ọ pụtara na mmepụta izizi nke UNDEREXPOSED na National Portrait Gallery, ezubere iji bulie mmata ndị dị ojii a n'asọpụrụ ma na-agbapụta ikike dị n'etiti obodo ndị dị ojii na Britain. Foto ya pụtara na Commerce Way, Peckham, London. Na 2009, ọ pụtara na uhe ngosi nke BBC Two bụ Moses Jones, nke o meriri Best Actress in a Miniseries na mmemme Roma Fiction Festival.
O gosipụtara na mkpuchi ihu akwụkwọ nke Screen International magazin June – July 2009 dị ka otu n'ime UK Stars of Tomorrow, na 2011 ọ pụtara na mbipụta Nylon Magazine nke afọ 2011.
N’afọ 2010, akpọrọ Wunmi Mosaku otu n’ime ihu ndị ohuru asaa na mmemme Toronto International Film Festival, maka ọrụ ya na ihe nkiri nke I Am Slave, [3] Ọ na-mere dịka Malia; nwa agbọghọ a tọọrọ n'obodo ya na Sudan, ma resị ya ịbụ ohu. Maka ọrụ ya Mosaku nwetara akara ngosi dịka Nwaanyị ọrụ ihe nkiri Kachasị Mma na Birmingham Black Film Festival, Ọrụ ihe nkiri kacha mma na mmemme Cultural Diversity Awards na Okachasi mma nwaanyị ọrụ ihe nkiri na Screen Nation Awards. Na 2011, Mosaku sonyeere ndị ọrụ maka ihe nkiri Vera, ebe ọ meere dịka Holly Lawson, mana ọ hapụrụ ihe nkiri ahụ ka otu afọ gachara.
Na 2015, Mosaku gosipụtara na-ọrụ nkiri dika Quentina, onye polis na-ahụ maka okporo ụzọ, ihe ngosipụta nke BBC Capital dabere na akwụkwọ akụkọ John Lanchester dere nke otu aha.[4] Na 2016, ọ pụtara na Playtest, ihe omume nke ngosi bụ Black Mirror.
Mosaku meriri 2017 BAFTA TV Award for Best Supporting Actress maka ime ka Gloria Taylor na ihe nkiri onyonyo bụ Damilola, Our Loved Boy .
Ndụ ya niime
dezieMgbe ajụrụ ya ka o depụta ndị ọ na-asọpụrụ, Mosaku gụnyere nne nne ya bụ Anike Adisa, bụ onye ọ kọwara dịka onye "kuziri m ọtụtụ ihe"; onye ọrụ ihe nkiri Albert Finney onye bụ onye gbara ya ume maka ịga Royal Academy of Dramatic Art; onye ọrụ ibe ya na onye nkụzi mbụ na RADA, William Gaskill; Paul Newman, onye ọ masịrị, ọ bụghị naanị maka ime ihe nkiri, kamakwa maka mbọ enyemaka ya site na Newman's Own; na Oprah Winfrey, onye Mosaku weere dị ka "nwaanyị siri nnukwu ike." [5]
Ndetu ihe nkiri
dezieIhe Ngosi
dezieAfọ | Ihe ngosi | Dị ka | Ndetu |
---|---|---|---|
2007 | Sold | Firefighter | Episode #1.5 |
2008 | Never Better | Server | Episode: "First Week Euphoria" |
Doctors | Nurse Kelly Strathairn | Episode: "Who Do You Think You Are Kidding?" | |
The Bill | Sophie Oduya | Episode "Trial and Error: Part 1" | |
2009 | Moses Jones | Joy | |
2010 | Silent Witness | Charlie Gibbs | |
One Night in Emergency | Beautiful Nurse | ||
Father & Son | Stacey Cox | ||
Law & Order: UK | Tamika Vincent | ||
2011 | Vera | Holly Lawson | |
32 Brinkburn Street | Joy | ||
The Body Farm | Rosa Gilbert | ||
Jo | Angélique Alassane | ||
2013 | Dancing on the Edge | Carla | |
Truckers | |||
2014 | In the Flesh | Maxine Martin | |
2015 | Don't Take My Baby | Belinda | |
Capital | Quentina | ||
2016 | Black Mirror | Katie | Episode: "Playtest" |
Damilola, Our Loved Boy | Gloria Taylor | BAFTA TV Award for Best Supporting Actress | |
2017 | Fearless | DCS Olivia Greenwood | |
The End of the F***ing World | DC Teri Darego | ||
2018 | Kiri | DI Vanessa Mercer | |
2019 | Luther | DS Catherine Halliday | |
Animal Babies: First Year on Earth | Narrator | 3 part wildlife series | |
Temple | Mercy King | ||
2020 | Lovecraft Country | Ruby Baptiste | Main role |
2021 | Loki | In production |
Fim
dezieAfọ | Ihe nkiri | Dị ka | Onye nduzi |
---|---|---|---|
2006 | The Women of Troy | Helen of Troy | Phil Hawkins |
2010 | Honeymooner | Seema | Col Spector |
Womb | Erica | Benedek Fliegauf | |
I Am Slave | Malia | Gabriel Range | |
2011 | Stolen | Sonia Carney | Justin Chadwick |
Citadel | Marie | Ciaran Foy | |
2013 | Philomena | Young nun | Stephen Frears |
2016 | Batman v Superman: Dawn of Justice | Kahina Ziri | Zack Snyder |
Fantastic Beasts and Where to Find Them | Beryl | David Yates | |
2018 | Leading Lady Parts | Herself | Jessica Swale |
2019 | Sweetness in the Belly | Amina | Zeresenay Berhane Mehari |
2020 | His House | Rial | Remi Weekes |
Redio
dezie- Drama on 3: The Vertical Hour (2008) na BBC Radio 3, dịka Terri Scholes
- Drama on 4: Normal and Nat (2009) na BBC Radio 4, dịka Shanice
- Drama on 4: Amazing Grace (2010) na BBC Radio 4, dịka Grace
Ebe m si dee
dezie- ↑ TEN MINUTES WITH... WUNMI MOSAKU. Archived from the original on 23 September 2015. Retrieved on 23 November 2014.
- ↑ 2.0 2.1 "Wunmi Mosaku interview: Idris Elba's new Luther sidekick on how she got into acting by watching Annie". Retrieved on 6 January 2019.
- ↑ Peter J. Thompson. I AM SLAVE’S WUNMI MOSAKU ON BEING MENDE NAZER. Retrieved on 24 November 2014.
- ↑ BBC One: Capital. Retrieved on 24 November 2015.
- ↑ "Wunmi Mosaku: my heroes and heroines".
Njikọ dị na mpụga
dezie- Wunmi Mosaku at RADA
- Wunmi Mosaku on IMDb
- Wunmi Mosaku at tv.com