Togo, nke a n'akpo Togolese Republic, bụ mba dị ọdịda anyanwụ mba Afrika .[a][b] Ọ dị n'ókè mba Ghana n'ebe ọdịda anyanwụ, Benin n'ebe ọwụwa anyanwụ na Burkina Faso n'ebe ugwu.[8] Ọ bụ otu n'ime mba ndị na-emepebeghị emepe ma gbasaa n'ebe ndịda rụọ golf nke gini,ebe isi obodo ya, n'ihi obodo Lomé, dị.[8] Ọ bụ obere mba n'ekpo ọkụ, nke gafere square 57,000 (22,000 square miles) nke nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ihe dị ka , ma nwee obosara nke ihe n'erughị kilomita 115 (71 mi) n'etiti Ghana na onye agbata obi ya dị n'ebe ọwụwa anyanwụ Benin. [12][13]

Togolese Republic
Motto"Travail, Liberté, Patrie"[1]
(Templeeti:Langx)
Anthem"Terre de nos aïeux"
(Templeeti:Langx)Templeeti:Parabr
Íshí oche
(and largest city)
Lomé
Spoken languages
Ethnic groups  non-African (5.6%)[2]
Demonym Togolese
Government Unitary parliamentary republic under an authoritarian dynasty system
 -  President Jean-Lucien Savi de Tové
 -  President of the Council of Ministers Faure Gnassingbé
Legislature Parliament
 -  Upper House Senate
 -  Lower House National Assembly
Independence Templeeti:Nobold
 -  German Togoland 5 July 1884 
 -  Togoland Campaign 6–26 August 1914 
 -  French Togoland partitioned 27 December 1916 
 -  Autonomy within the French Union 24 August 1956 
 -  Independence granted from France 27 April 1960 
Area
 -  Total 56,785[3][4] km2 (123rd)
22,008 sq mi 
 -  Water (%) 4.2
Population
 -  2024 estimate 9,583,381[5] (101st)
 -  2022 census 8,095,498[6] 
 -  Density 125.9/km2 (60th)
243/sq mi
GDP (PPP) 2023 estimate
 -  Total $25.103 billion[7] (151st)
 -  Per capita $2,767[7] (175th)
GDP (nominal) 2023 estimate
 -  Total $9.621 billion[7] (157th)
 -  Per capita $1,004[7] (170th)
Gini (2015) 43.1 
HDI (2022) 0.547 (163rd)
Currency West African CFA franc (XOF)
Time zone GMT (UTC+00:00)
Date formats dd/mm/yyyy
Drives on the right
Internet TLD .tg
Calling code +228

Ndị dị iche iche biri n'ókè nke obodo Togo nke oge a n'etiti narị afọ nke 11 na nke 16. N'etiti narị afọ nke iri 'isii na nke iri n'asatọ, mpaghara dị n'ụsọ oké osimiri rụrụ ọrụ dị ka ebe Ahịa ohu na Europe, n'eme ka mba Togo na mpaghara ndị gbara ya gburugburu nweta aha "The Slave Coast". N'afọ 1884 n'oge ọgụ maka Afrika, Germany guzobere onye nchebe n'mpaghara a n'akpọ Togoland. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, e wegara mba Togo na mba France na ókèala ya nke oge a. Togo nwetara nnwere onwe site na mba France n' afọ 1960. [9] N'afọ 1967, Gnassingbé Eyadéma duziri nnupụisi ọchịchị nke ndị agha gara nke ọma wee bụrụ onye isi ala nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị n' mmegide ọchịchị Kọmunist. N'afọ 1993, Eyadema chere ntuli aka dị iche iche ihu n'ihi mmebi iwu, wee merie onye isi ala ugboro atọ. N'oge ọnwụ ya, Eyadema bụ "onye ndu kachasị ogologo oge n'akụkọ ihe mere eme Ndị Afrịka nke oge a", ebe ọ bụ onye isi ala ruo afọ 38. N'afọ 2005, a họpụtara nwa ya nwoke Faure Gnassingbé dịka onye isi ala.

Togo bụ mba dị n'ebe okpomọkụ, nke dị na mpaghara Sahara [8] nke akụ na ụba ya dabere n'ọrụ ugbo. [9] Asụsụ gọọmentị bụ French, mana a n'asụ asụsụ ndị ọzọ, ọkachasị ndị nke Ezinụlọ Gbe.[9] 47.8% nke ndị bi na ya n'agbaso Iso Ụzọ Kraịst, n'eme ka ọ bụrụ okpukpe kachasị ukwuu na mba ahụ. Togo bụ onye otu United Nations, African Union, Organisation of Islamic Cooperation, South Atlantic Peace and Cooperation Zone, Francophonie, Commonwealth of Nations, na Economic Community of West African States.

Ihe nchoputa ihe ochie na-egosi na ndi mmadu nwere ike imepụta ite ma mepụta ígwè. A na-asụgharị aha Togo site n'Asụsụ Ewe dị ka "n'azụ osimiri".[10] N'oge site na narị afọ nke 11 ruo narị afọ nke 16, ndị Ewé si n'ebe ọdịda anyanwụ banye n'Mgbọ ahụ, na Mina na Gun si n'akụkụ ọwụwa anyanwụ. Ọtụtụ n'ime ha biri n'ụsọ oké osimiri. AzụmaAhịa ohu nke Atlantic malitere na narị afọ nke iri na isii, na narị afọ abụọ sochirinụ, mpaghara dị n'ụsọ oké osimiri bụ ebe azụmahịa maka ndị Europe na-achọ ndị ohu, na-enweta Togo na mpaghara gbara ya gburugburu aha "The Slave Coast [11] .[12]

  1. Constitution of Togo (2002).
  2. 2.0 2.1 Togo. Central Intelligence Agency.
  3. Togo country profile (24 February 2020).
  4. Accueil - Voyage Togo.
  5. Templeeti:Cite CIA World Factbook
  6. Togo-Les résultats définitifs du 5e RGPH (4 April 2023).
  7. 7.0 7.1 7.2 7.3 World Economic Outlook Database, October 2023 Edition. (Togo). International Monetary Fund (10 October 2023).
  8. 8.0 8.1 8.2 Republic of Togo (en). Islamic Development Bank (18 November 1998). Archived from the original on 3 February 2020. Retrieved on 26 January 2021. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Republic of Togo" defined multiple times with different content
  9. 9.0 9.1 9.2 Togo (Partner) – International Cultural Youth Exchange. International cultural youth exchange. Archived from the original on 8 June 2017. Retrieved on 27 January 2021. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "icye.org" defined multiple times with different content
  10. admin (2020-04-19). How Togo came to have its name (en-US). African Lisbon Tour. Retrieved on 2025-03-26.
  11. Benjamin (2009-02-16). The Atlantic World: Europeans, Africans, Indians and their Shared History, 1400–1900 (in en). DOI:10.1017/CBO9780511816604. ISBN 978-0-511-81660-4. Retrieved on 2025-03-26. 
  12. The transatlantic slave trade. National Museums Liverpool. Retrieved on 2025-03-26.