Rababe Arafi
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Morocco |
obodo maka egwuregwu | Morocco |
ụbọchị ọmụmụ ya | 12 Jenụwarị 1991 |
Ebe ọmụmụ | Khouribga |
Dị/nwunye | Fouad Elkaam |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic, Berber languages |
ọrụ ọ na-arụ | asọmpi egwuregwu |
ụdị egwuregwu | egwuregwu |
ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpi | 800 metres, 1500 metres |
so na | athletics at the 2016 Summer Olympics – women's 1500 metres, athletics at the 2019 African Games – women's 800 metres |
Rababe Arafi (Arabic: رباب عرافي, amụrụ na 12 na onwa Jenụwarị, na afọ 1991) bụ onye na-agba ọsọ n'etiti etiti si Morocco, onye ọkachamara na mita 1500. A mụrụ ya na Khouribga, ọ bụ onye nwetara ihe nrite ugboro atọ na African Onyenmeri na Athletics, ebe ọ bụ onye mmeri kọntinent na afọ 2012 na ndekọ mmeri nke 4:05.80 nkeji.[1][2] O nwere ihe ndekọ mba Morocco na ọsọ kilomita na 1500m (3:58.84 nkeji - abalị iri na isii na onwa nke isii, na afọ 2019 - Rabat - Diamond League)[3][4][5]
Arafi so na ndị otu Morocco maka afo 2016 Summer Olympics ma bụrụ onye ikpeazụ 1500m.[1] Ọ nọchitere anya Morocco na Isompi nke Ụwa na Athletics na afọ 2013, 2015 na 2017, gụnyere nke asatọ na 1500 m na 2017 World Championships na Athletics.[6] Arafi bụ onye nwetara ọla nchara na afọ 2014 IAAF World Indoor Championships na 1500 m, mana e mechara wepụ ya n'ihi na ya na Heather Kampf kpọtụrụ ya nke mere ka Kampf daa.[7] O mekwara isọmpi na IAAF World Cross Country Championships na afọ 2007, mana o nweghị ike ịmecha ọsọ ahụ. O ritere ihe nrite ọla edo na 1500m na Arab Athletics Championships (2013), Islamic Solidarity Games (2013 na 2017) na Jeux de la Francophonie (2013 na 2017).
Egwuregwu mba ụwa
dezie1A na-enweghị ike iru eru na nke ikpeazụ
Hụkwa
dezie- Ndepụta nke ndị mmeri nke African Championships in Athletics
Ihe odide
dezie- ↑ 1.0 1.1 Rababe Arafi. Sports Reference. Retrieved 2018-02-16.
- ↑ Watta, Evelyn (2012-06-30). Montsho and Makwala take 400m titles in Porto-Novo – African champs, Day 3. IAAF. Retrieved on 2018-02-16.
- ↑ Mile Run Results. sportresult.com (11 September 2015). Archived from the original on 29 January 2016. Retrieved on 12 September 2015.
- ↑ Moroccan national records progression - run123. Archived from the original on 2022-11-29. Retrieved on 2022-06-22.
- ↑ Rababe Arafi. Track and Field Statistics. Retrieved on 2018-02-16.
- ↑ 1500 Metres Result | IAAF World Championships London 2017 | iaaf.org. Archived from the original on 2017-08-08.
- ↑ Nicole Sifuentes shares how she was promoted to bronze medal after originally finishing 4th.
Njikọ mpụga
dezie- Rababe Arafi at World Athletics