Nkemdilim Izuako
mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
ọrụ ọ na-arụOnye òká ikpe Dezie
onye were ọrụNnamdi Azikiwe University Dezie
ebe agụmakwụkwọObafemi Awolowo University Dezie

Nkemdilim Amelia Izuako Audio  bụ onye ọkikpe Naijiria. Kemgbe afọ 2009, ọ bụ otu n’ime ndị ọki ikpe atọ na United Nations Dispute Tribunal (UNDT).

Izuako natara asambodo iwu ya na Mahadum Ife . Ọ akụziola iwu na Mahadum Nnamdị Azikiwe yana n'ụlọ akwụkwọ Technical Institute nke Gambia .

Izuako ghọrọ onye ọka ikpe n’afọ 1998 mgbe a họpụtara ya n’ụlọ ikpe nke steeti Anambra; e mechara họpụta ya n'ụlọ ikpe ukwu nke Naịjirịa, ebe ọ nọrọ ruo 2003 . Site na 2004 rue 2006, o jere ozi dika oka ikpe na ulo ikpe ukwu na ulo ikpe mkpegharị nke Gambia. Na 2006, a họpụtara ya n'tolọikpe Kasị Elu nke Solomon Islands; ọ bụ nwanyị mbụ ikpe n'ụlọ ikpe nke Solomon Islands . na nke ọ bụla n'ime ikike ndị a, na dị ka onye ọka ikpe nke ụlọ ikpe nke ikike izugbe, ọ na-ahụ maka okwu gbasara ọrụ na njikwa iwu . Tupu ọkwaga na Solomon Islands, Justice Izuako rụrụ ọrụ ihe karịrị afọ iri abụọ na ngalaba ikpe Naijiria, gụnyere iso n'ụlọ Ọrụ Mba Ndị Dị n’Otu na-ahụ Maka Ọgwụ na Mpụ na-arụkọ ọrụ iji tinye akwụkwọ ntuziaka gbasara ụkpụrụ omume gbasara ikpe maka ụlọ ọrụ Naijiria. .

N’afọ 2009, a họpụtara ya ka ọ bụrụ ọkaikpe nke UNDT. Na UNDT, ọ nọ na Nairobi, Kenya . ụlọ ikpe a, nke dị na Nairobi, New York na Geneva, na-arụ ọrụ iji meziwanye usoro UN na-ahụ maka mkpesa ime na ikpe ịdọ aka ná ntị.

Nkem onye hụtara onwe ya dika onye na-akwado ikike na mmepe umu nwaanyị nyere aka n’inye ndi nkuzi oka iwu na Solomon Islands wee nyere aka zulite ikike ha nwere ino n’onodu ulo ikpe di elu.

N'èzí ụlọ ikpe ahụ, justice Izuako rụrụ ọrụ iji nyere aka na mmepe mmekọrịta ọha na eze site n'ịchịkọta ụmụ nwanyị nọ n'obodo ahụ ka ha hiwe Honiara Women's Initiative, nke na-amalite obere ọrụ maka ikike akụ na ụba na mmekọrịta ụmụ nwanyị na ụmụ agbọghọ.

Hụ kwa

dezie
  • ụmụ nwanyị ndị ọka iwu izizi gburugburu ụwa

Ebe m si nwete

dezie