Ndị Ìgbò

Otu agbụrụ nke dị na mba Nigeria
(Dupụ̀rụ̀ sì Ndị Igbo)
Ndị Igbo
agburu
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin, njikota asụsụ igbo Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
subject has roleeponym Dezie
has listlist of Igbo people Dezie

N'ala Naigeria, Ndị Ìgbò bụ ndị nke atọ ma a bịa na ọnụ ọgụgụ ebo ndị e nwere na Naijirịa . Asụsụ eji mara ndi Ìgbò bu asụsụ Ìgbò. Asụsụ ọzọ ha na-asụkarị bụ "broken English". Imerime ndị mmadu nọ n'ala Igbo na-asụkwa asusu bèkeè, n'ihi agụmakwụkwọ ha nwetaworo na asụsụ bèkèè.

Ụfọdụ n'ịme steetị Naijirịa nke ndị Igbo kacha dị ọtụtụ na ha bụ: Ọ̀hà Abia, Ọ̀hà Ọmambala, Ọ̀hà Ebonyi, Ọ̀hà Enugu, ma na Ọ̀hà Imo. Ọ̀hà Delta (Anioma) na Ọ̀hà Rivers.[1]

Enwekara asụsụ ndi ọzọ a na-asụ na ala Naigiria nke gbara ndị Igbo gburugburu gụnyere: Igala, Urhobo, Isoko, Itshekiri, Ibibio, Idoma, Tiv, Edo, Eshan d.g.z.

Ákụkọ Mba Anyị

dezie
 
9th century bronze ceremonial pot, Ìgbò-Ukwu, Naigeria
 
Ijele

Dịkwa ka e kwụrụ na mbụ, na ala Naijiria, ndi Ìgbò mejụpụtara Ọ̀hà Abia, Ọ̀hà Anambara, Ọ̀hà Ebonyi, Ọ̀hà Enugwu na Ọ̀hà Imo. Ọ bụkwa ndi Ìgbò bi na ebe ugwu nke Ọ̀hà Delta na Ọ̀hà Rivas.

A gụwa ebo kachadi n'ọnụ ọgụgụ na Naijiria, ndị Ìgbò bu ndị nke atọ. A gbasoro ọgụgụ isi e mere n'afọ 2007, ndị Hawusa kacha na ọnụ ọgụgụ, ndị Yoruba bụ ndị nke abụọ, ndị Ìgbò bụ ndị nke atọ. Amachaghị ọnụ ọgụgụ ndi Ìgbò nọ n'ụwa, maka na ndi Ìgbò gbasara na mba dị ịche ịche, na-azụ ahịa, ma ọ bu na-agụ akwụkwọ. N'ịme Naijirịa, ndị Ìgbò bi na steeti dum.

Ndi Ìgbò jukwara eju bara a bara na Delta; Rivas, ufodu akuku Ọ̀hà Edo, Ọ̀hà Akwa Ibom, Ọ̀hà Cross River, Ọ̀hà Bayelsa nakwa Ọ̀hà Benue. Ebe ndi Ìgbò gboro kasa na-abughi ala nna ha, bu Ọ̀hà Lagos, Ọ̀hà Kano, Ọ̀hà Kaduna na steti ndị ọzọ na Naigeria).

Ndi Ìgbò bu ndi njem. I ruo obodo dị iche iche na Afrịka, Obodo Békè, Amerikạ ma o bu Asia, i ga-ahu imerime ndi Ìgbò. E nwere onye kwụrụ na obodo ndị Ìgbò anọghi abughi ezigbo obodo. Obodo ọbula ndị Ìgbò nọ, ha na-enwe ọgbakọ ụmụ-Ìgbò. Ọgbakọ ndia na-enye aka ịhụ na omenala Ìgbò nakwa ọdinma ndi-Ìgbò na-aga n'ihu.

Ásụ̀sụ̀ Ị̀gbò

dezie

Nka Ìgbò

dezie

Onye Ìgbò

dezie

Lee nke özö

dezie

Literature

dezie
  • Chidi Leonard Ilechukwu: Ìgbò - Indigenous Economy and the search for Sustainable Development in Post Colonial African Society. Cidjap Press, Enugu 2008, ISBN 978-978-087-181-9.

References

dezie
  1. James Minahan, "Encyclopedia of the Stateless Nations", Vol. II D-K, pp. 762 (chapter Ibos. Greenwood, Westport, Conneticut - London 2002.