Mayen Adetiba
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Mayen |
aha ezinụlọ ya | Adetiba |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1954 |
nwa | Kemi Adetiba |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | civil engineer, omee |
ebe agụmakwụkwọ | Virginia Union University, Columbia University |
ogo mmụta | Bachelor of Science, nzere masters |
Ebe obibi | Lagos |
Ebe ọrụ | Lagos |
agbụrụ | Ndi Yoruba |
Onye òtù nke | Nigerian Society of Engineers |
Afọ a mụrụ ya | 1954 |
---|---|
Obodo ya | Nigeria |
Agụm akwụkwọ | Mahadum nke Columbia |
Ọrụ | Injinịa |
Njiri mara | Injinịa nwaanyi nke Naijiria |
Di ya | Dele Adetiba |
Ụmụ | Atọ |
Mayen Adetiba (a mụrụ ya n'afọ 1954) bụ onye Naijiria na-eme ihe egwuregwu nkiri, ọ gara n’ihu ibu onye ọrụ Injinịa ama ama n' obodo .
Ndụ ya
dezieA mụrụ Adetiba n'afọ 1954 na Naijiria. [1] Na mbụ ọ chọrọ ị bụ onye odebe, mgbakọ ego bụ nke ndị oyibo kporọ Accountant, mana o mechara ga- gụọ ihe gbasara ịchụ nta akụkọ [2]
Ọ rụrụ ọrụ n'ihe nkiri a kpọrọ The Bar Beach Show , ọ kpara agwa dika nwunye Lakunle Ojo n'egwregwu Village Headmaster . Ọ sokwa mepụta ihe egwregwu Kongi's Harvest bụ nke pụtara ihe n'afọ 1980. [2] Ọ gara obodo oyibo na US maka agụmakwụkwọ nke mahadum ebe ọ nwetara ọrụ n'ihi nne na nna ya enweghị ike izitere ya ego n'ihi ihe mgbochi nwepụ ihe n'ala Naijiria. Ọ nọrọ nwantịtị oge na Mahadum nke New York tupu ọ gafee na Mahadum nke Columbia iji mụọ maka injinia nke na-ahụ maka eletriki. A gwara ya na injinia ịrụ okporo ụzọ, akwa mmiri, ụlọ di iche iche w.d.g bụ nke akpọrọ ''civil engineer'' ga aka nata ugwu na nsọpụrụ karia injinia eletriki, nke a mere ka ọ gbanwee gụwazie ''civil engineer''.
Mgbe ọ gbanwere ịgụ Civil injinịa na Mahadum Columbia, ọ bụghị naanị na ọ bụ naani nwaafọ Naịjirịa, kama kwa ọ bụ naanị ya bụ nwa nwaanyị ojii na-enweta ọzụzụ ị bụ injinia a. [3] Ọ gara n’ihu nweta nzere nke Mastas na Mahadum Cornell . [2]
Ọ lụrụ Mazi Dele Adetiba ha mụta nwa nwaanyị aha ya bụ Kemi onye nke a mụrụ na Lagos na Jenụwarị n'afọ1980. [4]
A hoputara ya dika onye isi ndi otu a kpọrọ Association of Consulting Engineers of Nigeria ma bụrụkwa osote onye isi n'otu ọzọ a kpọrọ Nigerian Society of Engineers ugboro ato. [3] Ọ bụ nwanyị mbụ ahọpụtara ka ọ bụrụ onye isi oche nke Executivi Kọmitii nke otu 'Nigerian Society of Engineers'. [4] Ọrụ ya gụnyere ịrụ ọrụ nke metụtara Ụlọ ọrụ African Union Southern Africa Regional nke dị na Malawi nakwa nnukwu ụlọ a kpọrọ Summerhill Baptist Church dị na Lagos. Ọ rụrụa ọrụ ebe a na anaghị ego maọbụ ihe nrite ndị ọzọ. [2]
N'afọ 2017 a họpụtara ya ịnọ n' ihe nkiri nwa ya nwaanyị a kpọrọ "King Women" ebe Kemi Adetiba gbara ya ajụjụ ọnụ. O sonyeere "King Women" ndị ọzọ bụ Chigul, Taiwo Ajai-Lycett, TY Bello na Tara Durotoye [5]
Nsinweta
dezie- ↑ Admin (2016-08-22). ADETIBA, Mayen Modupeola, (en-US).
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 Published. I set out to study accountancy, but graduated as an engineer –Adetiba (en-US).
- ↑ 3.0 3.1 There were just two of us in class — Mayen Adetiba, renowned Civil Engineer (en-US) (2016-05-12).
- ↑ 4.0 4.1 3 solid reasons why Kemi Adetiba's 'King of Boys' should NOT have been a hit (en-US) (2018-11-07).
- ↑ Mayen Adetiba speaks on how she dealt with patriarchy at work on the latest episode of King Women (en-US) (2017-06-28). Archived from the original on 2022-03-07. Retrieved on 2020-04-25.