Kemi Adetiba

Onye isi ihe onyonyo egwu Naijiria.
Kemi Adetiba
mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoKemi Adetiba Dezie
Aha ọmụmụKemi Adetiba Dezie
aha enyereKemi Dezie
aha ezinụlọ yaAdetiba Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya8 Jenụwarị 1980 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
ŃnéMayen Adetiba Dezie
Dị/nwunyeOscar Heman-Ackah Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa, Asụsụ Yoruba Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
ebe agụmakwụkwọNew York Film Academy, University of Lagos, Atlantic Hall Dezie
ogo mmụtaBachelor of Laws Dezie
Ebe ọrụLagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2016 Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
Ọrụ ama amaKing of Boys, The Wedding Party, King of Boys: The Return of the King Dezie
Ihe nriteOkayAfrica 100 Women, City People Entertainment Awards Dezie
webụsaịtịhttp://www.kemiadetiba.com Dezie
ụdị metụtaraCategory:Films directed by Kemi Adetiba Dezie
award rationaleBest music video director of the year Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Kemi Adetiba bụ music video director na Naijiria, dairektọ na-ahụ maka fim, nakwa onyonyo nke aka ọrụ ya na-apụta ihe na Channel O, MTV Base, Soundcity TV, BET na Netflix. [1] [2]


Mbido ndụ ya.

dezie

Amuru ya na Lagos ka ọnwa Jenụwarị dị na mkpụrụ ụbọchị asatọ n'afọ 1980, [3] Nne ya bụ Mayen Adetiba bụ onye injinịa na onye na-emepụta ihe nkiri di iche iche. Kemi Adetiba bidoro njem ya n'ime mgbasa ozi dị ka nwatakịrị ebe ọ mere ihe mgbaza ozi azụmahịa nke ndị OMO bụ ncha eji asa akwa na ihe ndị ọzọ. Nke a bụ igbaso nzọ ụkwụ nna ya bụ Dele Adetiba. [4]

Ọrụ

dezie

Kemi bidoro ọrụ eji mara ya dịka onye na-akọwapụta ihe n'igwea redio nke Rhythm 93.7 FM , ebe ọ bụ olu na-ekwupụta okwu n'ihe akụkọ wuru ewu a kpọrọ ''Soul'd Out'' na ''Sunday at Seaside'' . Adetiba bidoro itinye aha ya na nchikọta egwu na ntanetị n'ihe di iche iche dika ''Spotify'' na ''Soundcloud'' site n'aha ọ kpọrọ onwe ya bụ 'hule'.

Kemi Adetiba malitere ịgbanwe ọrụ ya site na ịbụ olu na-ekwu okwu na redio wee bụrụ ihu ana ahụ anya n'onyonyo televishọn site na- ikwado ma gosipụta ọtụtụ ihe nkiri na Mnet, nke gụnyere Studio 53, Ọnwụnwa Naịjirịa nke ya na Ikponmwosa Osakioduwa gosipụtara. Kemi bụkwa onye na-eweta ihe nkiri na Soundcity TV ma kwado Maltina Dance All ugboro atọ n'usoro. [5]

Ka ọtụtụ afọ ịnọ nke ọma n’ihu igwe foto gachara, Adetiba debara aha ya na New York Film Academy iji mụọ nke ọma etu esi anọ n'ihu igwe foto , taa ọrụ aka ya dika dairektọ juru mpaghara Afirica nakwa ngafe Africa. Mkpirikpi ihe nkiri nke Kemi Adetiba mepụtara akpọrọ Bloodied Ocean gosiri n'afọ 2009 na Pan African Film Festival na National Black Arts Festival. [6][7]

N'ọnwa Septemba n'ụbọchi asatọ n'afọ 2016, ihe nkiri mbụ Kemi Adetiba gosipụtara '' The Wedding Party '(a Nigerian Rom-com film) gosipụtara n'abalị na Toronto International Film Festival (TIFF),na mmeghe fim nke a kpọrọ City-to-City Spotlight.

N'afọ 2017 ọ nọ na-egosi ihe nkiri ahụ a kpọrọ "King Women" ebe ọ gbara nne ya Mayen Adetiba ajụjụ ọnụ . Ndị ọzọ so na "King Women" gụnyere Chigul, Taiwo Ajai-Lycett, TY Bello na Tara Durotoye [8]

Nturu Ugo na nhọpụta

dezie

Ụfọdụ ọrụ aka ya nwetara ihe onyinye di iche iche, dika vidio egwu 'Ekundayo' nke ụmụ nwaanyị kacha mma bụ nke TY Bello gụrụ na Soundcity TV Music Video Awards', Vidio nke ụmụ nwaanyị kacha mma na egwu 'Today na Today' bụ nke Omawumi gụrụ n'afọ 2010 Nigeria Entertainment Awards. Ọrụ kachasị ọhụrụ nke Adetiba bụ rụrụ bụ n'egwu 'onye' nke Waje tiri ebe ọgosiri Tiwa Savage, Olamide's "Anifowose", "Sitting on the Throne" nakwa egwu Bez's R&B a kpọrọ "Say".

A họpụtara Kemi maka Onye Nchịkwa Egwu kacha mma na The Headies n' afọ 2014. Ọ nwetakwara ihe onyinye nke ndi City People Entertainment direktọ egwu kacha mma n'afọ 2015 nakwa ihe nrite HNWOTYmaka nwaanyị kacha nepụta ihe nkiri na fim nakwa onyonyo n' afọ 2017. [9]

Ihe nkiri

dezie
  • Ihe nkiri a kpọrọ 'The wedding party ' n'afọ 2016 na 'King of Boys'n'afọ 2018.

Vidio egwu ndi ahọpụtara so n'aka ọrụ ya.

dezie

Lekwa ọzọ

dezie
  • Ndepụta aha nke ndị cinematographers nke Nigeria

Nsinweta

dezie