Jagun Jagun
Jagun Jagun (Onye Agha) bụ ihe nkiri Yoruba nke Netflix nke 2023 nke Femi Adebayo Salami na Euphoria360 Media mepụtara. [1]Ọ bụ Adebayo Tijani na Tope Adebayo Salami duziri ya. [2]Ndị soro me ihe nkiri a bụ Femi Adebayo, Adedimeji Lateef, Bimbo Ademoye, Faithia Balogun, Maazị Macaroni, Bukunmi Oluwasina, Ibrahim Yekini na Muyiwa Ademola. E buputere ya na ihe nkiri Netflix na 10 August 2023.[1]
Nkowa
dezieJagun Jagun na-akọ akụkọ banyere onye agha, Ogundiji onye malitere ị nwe ụjọ na ikike nke onye agha na-eto eto, Gbotija onye ebumnuche ya bụ ịgbu onye gburu nna ya. [3]Ogundiji a bụrụla onye ọchịchị aka ike nke n'eji ike anapụta ala n'aka ndị nwere ha nyefe ndị ọchịchị ndị ọjọọ. N'oge na-adịghị anya ọ bido tụwa egwu site na mbata nke nwa okorobịa agha, Gbotija.[4][5]
Ndị mere ihe nkiri
dezie- Femi Adebayo dị ka Ogundiji
- Lateef Adedimeji dị ka Gbotija
- Odunlade Adekola dị ka Jigan
- Ibrahim Yekini dị ka Gbogunmi
- Bukunmi Oluwasina dị ka Kitan / Agemo
- Adebayo Salami (Oga Bello) dị ka Oba Alayaki
- Fathia Balogun dị ka Erinfunto
- Bimbo Ademoye dị ka Morohunmbo
- Dayo Amusa dị ka Ajepe
- Maazị Macaroni dị ka Moyale
- Yinka Quadri dị ka Amoye
- Ibrahim Chatta dị ka Ikulende Agbarako
- Kunle Afod dị ka Ditemola
- Yemi Elesho (Alfa Ebenezer)
- Muyiwa Ademola dị ka Oniketo
- Aisha Lawal dị ka Ajitoni
- Dele Odule dị ka Alarinka
- Ayo Ajewole (Woli Agba) dị ka Agbeloba
- Soji Taiwo dị ka Enyi Prince Modede
Mmepụta na ntọhapụ
dezieE mere Jagun Jagun ihe nkiri ihe karịrị otu ọnwa na ala ndị ofe mmanụ, ndị akpọrọ ndị Yoruba n'ala Naịjirịa . [1]Onye na-eme ihe nkiri Bukunmi Oluwasina kpughere na Femi Adebayo Salami họọrọ ya maka ọrụ ya na ihe nkiri ahụ otu afọ tupu mmepụta amalite. O toro mmepụta nke ihe nkiri ahụ, na-akọwa ọrụ ahụ dị ka "ọrụ dị ịrịba ama".[6]
Femi Adebayo bụ onye nke mepụtara <i id="mwTA"><i id="mwTg">Eze nke Ndị Ozu ohi</i></i>, kwuru na nrọ Jagun Jagun bụ ịgafe ọrụ ọma nke ihe ndị Eze nke Ndị Ezu ohi depụtara.[7]
N'abalị iri n'ọnwa Ọgọstụ, na afọ 2023, a buputere Jagun Jagun na Netflix ka a mara ya nke ọma. N'ime awa iri anọ na asatọ nke nbupute ya, ọ malitere n'eje eje na United Kingdom na mba iri na asaa ndị ọzọ. [8]O nwetara 2,100,000 nlele n'ime ụbọchị atọ mbụ ya, na 3,700,000 nlele site na iri abụọ nke Ọgọstụ, 2023, na-eme ka ọ bụrụ otu n'ime ihe nkiri iri kachasị anya na-abụghị ihe nkiri Bekee n'ụwa niile n'oge ahụ. [9]
Ebe m si de
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 Oloruntoyin (2023-07-21). Here is your first look at Netflix's 'Jagun Jagun' (en). Pulse Nigeria. Retrieved on 2023-07-22.
- ↑ Netflix Unveils 'Jagun Jagun (The Warrior)': An Epic Yoruba Tale of Power, Love, and Honor! » YNaija (en-GB). YNaija (2023-07-22). Archived from the original on 2023-08-17. Retrieved on 2023-07-22.
- ↑ Yoruba film 'Jagun Jagun' set to premiere on Netflix (en-US). P.M. News. Retrieved on 2023-08-12.
- ↑ Oadotun (2023-08-12). MOVIE REVIEW: Jagun Jagun raises bar for Nigerian epic films (en-GB). Premium Times. Retrieved on 2023-08-12.
- ↑ Mosadioluwa (2023-08-10). Femi Adebayo's Netflix epic 'Jagun Jagun' earns fans' applause (en-GB). Tribune Online. Retrieved on 2023-08-12.
- ↑ Oluwayemi. Actress Bukunmi Oluwasina unveils daring role in "Jagun Jagun" - P.M. News (en-US). Retrieved on 2023-07-22.
- ↑ Acho (2023-08-10). Nigerians Hail Actor Femi Adebayo's Netflix Epic Jagun Jagun (en-US). Leadership. Retrieved on 2023-08-12.
- ↑ Afigbo (2023-08-12). "Record-breaking": Femi Adebayo's new film hits top 10 in 18 countries in 48 hrs (en). Legit.ng - Nigeria news.. Retrieved on 2023-08-12.
- ↑ Netflix. Weekly Top 10 lists of the most-watched TV and films (en-US). Retrieved on 2023-08-17.
Njikọ mpụga
dezieJagun Jagun na IMDb