Ibukun Awosika
Ụlọ ọrụ mmepụta ihe | onye ọchụnta ego |
---|---|
ụdịekere | nwanyị |
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Ibukun |
aha ezinụlọ ya | Awosika |
ụbọchị ọmụmụ ya | 24 Disemba 1962 |
Ebe ọmụmụ | Ibadan |
Dị/nwunye | Abiodun |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọchụ̀nta ego, motivational speaker, onye ọrụ ụlọ akụ, odee akwụkwọ |
ụdị ọrụ ya | theater arts |
ebe agụmakwụkwọ | Obafemi Awolowo University, Ụlọ akwụkwọ Lagos Business School, University of Navarre, IESE Business School, Methodist Girls' High School |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1989 |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
webụsaịtị | http://ibukunawosika.org |
Ibukunoluwa Abiodun Awosika (nee Bilkisu Abiodun Motunrayo Omobolanle Adekola onye nke a mụrụ na ụbọchị iri abụọ na anọ na ọnwa nke Disemba na aho 1962) bu nwanyi Nigeria onye na azu ahia, onye nekwu okwu na agba ume ya'na onye edemede akwukwo . Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka Onye isi oche nke ụlọ akụ First Bank of Nigeria . [1]
Mmalite ndu na agụmakwụkwọ
dezieAmụrụ ya dịka nwa nke atọ n'ime ụmụ asaa na Ibadan isi obodo Oyo State. Ibukun gụsịrị agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị na St. Pauls African Church Primary School, Lagos na Methodist Girls 'High School, Yaba tupu ya aga University nke Ife (nke akpọgharịrị aha Obafemi Awolowo University ) ebe ọ gụsịrị akwụkwọ nweta asambodo B.Sc na kemistri . [2] O nwekwara asambodo elu maka ndi gụsịrị akwụkwọ mahadum nke mbụ na nke abụọ, ya na asambodo MBA nke ọnwetara mgbe ọmechara ọtụtụ agụmakwụkwọ gbasara azụmaahịa na Lagos Business School na IESE Business School - Mahadum nke Navarra . [3]
Ọrụ
dezieMgbe ọ na-arụ ọrụ mmanye otu afọ iji ijere obodo ya ozi - National Youth Service Corps Ibukun rụrụ ọrụ dị ka onye na amụ ọrụ nyocha na Akintola Williams & Co. N'ihi ịhụnanya o nwere maka ije ịhazi ụlọ ọbido kwara ọrụ na Alibert Nigeria Ltd. dị ka onye njikwa ihe ngosi. [4] [5] N’ịchọ ịnọrọ onwe ya, o hibere ụlọ ọrụ na-arụpụta ngwa ahia oche, akwa na ihe ndi ọzọ ana-akpọ Quebees Limited n’afọ 1989 tupu ebe ọrụ ahụ agbanwe aha za wa The Chair Center Limited ma mechaa gbanwe aha ọzọkwa buru zia SOKOA Chair Center Limited. Nke mere mgbe ejikọrọ ya na SOKOA SA [6] site na Guaranty Trust Bank na afọ 2004. [7]
Ibukun bụ otu onye Otu African Leadership Initiative na Aspen Global Leadership Network. Ọ bụ kwa onye otu ndi Economic Summit Group, kọmitii nke Nigerian Sovereign Wealth Fund na onye isi oche mbụ, ma buru kwa onye otu ndị nlekọta Women in Management, Business and Public Service . [8] [9] Na afọ 2011, o guzobere ebe a na-azụ ndị gụchara mahadum ka ha wee nweta ọrụ akpọrọ Afterschool Graduate Development Centre na Nigeria. [7]
Na ọnwa Septemba, ụbọchị nke asaa na afọ 2015, Ibukun ghọrọ nwanyị izizi nke a họpụtara dịka onye isi oche nke First Bank of Nigeria mgbe Prince Ajibola Afonja tinyere akwụkwọ arụkwaghịm. [8] [10]
Ibukun Awosika bu onye otu ndị nlekọta IESE’s International Advisory Board (IAB). [11] Ọ sokwa na otu ndị nlekọta Digital Jewel Limited na Cadbury Nig Plc. [12]
Onye ama ama site n'aka ndị mgbasa ozi
dezieIgwe onyonyo
dezieN’afọ 2008, Ibukun so na mmadụ ise ndị na-achụ nta ego na Naịjirịa ndị pụtara na mbipụta mbụ nke usoro ihe omume nke Dragon Den na Africa. Ọ na-ewube ihe mmemme TV a na-akpọ Business His Way. O tinyekwara aka ma sokwa mee ihe nkiri "Citation" na afọ 2020 n'akụkụ Temi Otedola. Kunle Afolayan bukwa onye mepụtara ihe nkiri ahụ. [13]
Akwụkwọ
dezie- The "Girl" Entrepreneurs
- Business His Way
Ndụ onwe
dezieIbukun Awosika luru Abiodun Awosika nke ya na ya nwere umu ato.
- ↑ Ogwu, Sunday Michael. "As Ibukun Awosika scores another first for women in Nigeria", Daily Trust Nigeria, 11 September 2015.
- ↑ The Entrepreneur. Betcy Media.
- ↑ Ibukun Awosika –Entrepreneur Par Excellence. FinIntell. Archived from the original on 2020-10-20. Retrieved on 2021-03-09.
- ↑ "I live on the plane – Ibukun Awosika", 13 March 2016.
- ↑ ""Nobody Realized That We Were A Tiny, Little Dot" – Ibukun Awosika On How She Used The Little She Had To Build The Successful Business She Wanted", 5 April 2015.
- ↑ "I live on the plane – Ibukun Awosika", 13 March 2016.
- ↑ 7.0 7.1 "Ibukun Awosika: Imparting youths for employment", 4 July 2013.
- ↑ 8.0 8.1 "Ibukun Awosika: 3 reasons why her appointment as First Bank Chair is epic".
- ↑ » Ibukun Awosika (en). Archived from the original on 2017-12-31. Retrieved on 2021-03-09.
- ↑ Olapoju, Kolapo. "Ibukun Awosika becomes the first female chairman of First Bank", YNaija, 7 September 2015.
- ↑ Members of IESE's International Advisory Board, iese.edu
- ↑ "I live on the plane – Ibukun Awosika", Punch Newspapers. (in en-US)
- ↑ Okafor, Lovelyn (9 September 2015). Ibukun Awosika- The New Face of First Bank of Nigeria Holdings (FBNH). Konnect Africa.