Farida Bourquia
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Morocco |
aha enyere | Farida |
ụbọchị ọmụmụ ya | 23 Jenụwarị 1948 |
Ebe ọmụmụ | Casablanca |
Asụsụ obodo | Berber languages |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic, Berber languages |
ọrụ ọ na-arụ | onye nhazi ndu ihe nkiri, onye na-emeputa ihe nkiiri |
Farida Bourquia (amụrụ n'afọ 1948) bụ onye nduzi ihe nkiri Moroccan, "otu n'ime ụmụ nwanyị Morocco mbụ mere ihe nkiri na-arụ ọrụ ma na ihuenyo ma na telivishọn".[1]
Ndụ
dezieMgbe ọ gụsịrị gbasara ihe nkiri na Moscow site na 1968 ruo 1973, Bourquia kụziri ihe nkiri na Conservatory nke Casablanca. Maka ọtụtụ ọrụ ya, ọ rụrụ ọrụ maka ụlọ ọrụ mgbasa ozi ọha na eze, Radiodiffusion-Télévision Marocaine, na-eme ihe ngosi na mmemme ụmụaka.
Maka International Women's Year na 1975, Bourquia mere ọtụtụ ihe ngosi banyere ụmụ nwanyị Morocco - ihe ngosi Morocco mbụ nke nwanyị mepụtara ma duzie. Ihe nkiri ya nke afọ 1982 bụ The Embers kọrọ akụkọ banyere ụmụaka atọ na-enweghị nne na nna n'obodo.[2] Two Women on the Road (2007) bụ "ụdị Moroccan nke ihe nkiri ụmụ nwanyị America, Thelma na Louise".[1]
Ihe nkiri
dezieIhe nkiri ndị e mere maka telivishọn
dezie- Nkwupụta Ikpeazụ [The Last Promise]
- Mgbaaka [Mgbaaka]
- Agaghị m alọghachi [agaghị m alọta]
- Ihu na enyo [The face and the mirror]
- Igbe anwansi [Igbe anwanci]
- Ụlọ a chọrọ [The popular house]
Ihe nkiri ndị a ma ama
dezie- 1982: Ọkụ a na-akpọ braise
- 2007: Ụmụ nwanyị abụọ n'okporo ụzọ
- 2014: Zaynab, rose nke Aghmat
Ebensidee
dezie- ↑ 1.0 1.1 Valérie K. Orlando (2011). Screening Morocco: Contemporary Film in a Changing Society. Ohio University Press, 144–. ISBN 978-0-89680-478-4.
- ↑ Armes (2003). "Cinema in the Maghreb", in Oliver Leaman: Companion Encyclopedia of Middle Eastern and North African Film. Routledge. ISBN 978-1-134-66252-4.