Eedris Abdulkareem

Nigerian Hip-hop Artiste and song writer.Amuru ya na kano mana nna ya bu onye Ilesha Osun steeti ma nne ya bu onye Ogun State.
Eedris Abdulkareem
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Disemba 1974 Dezie
Ebe ọmụmụSteeti Kano Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akapidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye egwu, onye ọrụ ugbo, rapper Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1996 Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ụdịAfrican hip hop, R&B dị ugbu a Dezie
akara ndekọKennis Music Dezie
webụsaịtịhttp://www.eedrisabdulkareem.com/ Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Eedris Abdulkareem bụ onye Naịjirịa na-agụ egwu hipụ họpụ .

Amụrụ Eedris Turayo Abdulkareem Ajenifuja n’ezinaụlọ a lụrụ karịa otu nwanyị [1] na Kano, Naịjirịa, nna ya si obodo Ilesha, Osun Steeti, ma nne ya si Ogun steeti . N’ịbụ onye tolitere na Kano, ọ nakweere Kano steeti dị ka steeti ya. Nna na umunne ya nwoke asatọ nwụrụ mgbe ọ dị afọ abụọ. [2]

Ọrụ dezie

Abdulkareem na ndị otu egwu hipụ-họpụ ya The Remedies gosipụtara egwu ha site 1997 rue mgbe ha kewara na 2002. Ọ gara n'ihu dị ka onye na-eti egwu wee wepụta abọm PASS ("Pain and Stress= Success") na 2002. [3] Egwu ya "Wackawickee MC's" katọrọ Tony Tetuila, Plantashun Boiz na Double X Posse . N’ime otu afọ ahụ, o wepụtara abọm nke akpọrọ "Mr Lecturer" . Egwu ya na-egosi ụmụ akwụkwọ nọ na kọleji na mahadum ndị Naịjirịa na-enweta ego na mmekọahụ maka nnukwu akara ule.

N’afọ 2004, Abdulkareem weputara abọm nke atọ ya bụ “ Jaga Jaga”, okwu Yoruba pụtara ihe mebiri emebi, [4] na-ekwupụta ire ure na ahụhụ na Naịjirịa. Onye isi ala Olusegun Obasanjo machibidoro egwu a ịkpọ na redio, mana ọ gara n'ihu na-akpọ egwu a na klọb abalị. [5] Ihe mkpuchi abọm ahụ bụ onye na-ese ihe, Lemi Ghariokwu , amaara maka ịmepụta ọtụtụ mkpuchi abọm nke Fela Kuti bụ onye mepụtara ya.

N’ọnwa Nọvemba nke afọ 2005, Abdulkareem weputara akwụkwọ egwu ya, La Kreem Music wee wepụta egwu nke anọ ya, "Letter to Mr President". Aha egwu a kwuru banyere nkatọ Obasanjo katọrọ "Jaga Jaga"; abọm ahụ gosikwara "Flash Up Unu Lighter", ụtụ maka nwunye Obasanjo, Stella, onye nwụrụ mgbe ọ na-awa ahụ na Spain, ya na ndị ihe mberede ụgbọelu nke "Bellview Airlines" nke Ọktoba 2005. [6]

O weputara usoro nke "Jaga Jaga" na Jenụwarị 2012 n'oge ngagharị iwe nke Naịjirịa maka ịwepụ enyemaka mmanụ ụgbọala.

O mekwala egwu na nke ndị egwu ndị ọzọ tinyere “Bad Guy Baller” nke gosiputara Mode 9 na VTEK na egwu nke Oba Mmega. [7]

Ndụ onwe dezie

Abdulkareem lụrụ Yetunde na 2004. N’afọ 2019, onye na-agụ egwu a gara na soshal midia ya ka ọ maa ọkwa maka ọmụmụ nke nwa ọhụrụ ha. Di na nwunye a nwere ụmụ nwanyị abụọ na otu nwoke. [8]

Ihe omume ndị ọzọ dezie

Na 2000 Abdulkareem so na ndị Naịjirịa họpụtara ka ọ bụrụ ọwa ọkụ Olimpik na mba ahụ. [9]

Ihe nkiri dezie

Studiyo abọm dezie

  • P.A.S.S (2002)
  • Mr. Lecturer (2002)
  • Jaga Jaga (2004)
  • Letter to Mr. President (2005)
  • King Is Back (2007)
  • Unfinished Business (2010)
  • Nothing But The Truth (2020)

Otu egwu dezie

  • "Jaga Jaga part 2 (2012) otu
  • "Wonkere ft Fatai Rolling dollar (2011) otu
  • "Sekere ft Vector (2013) single
  • "Fela ft Femi Kuti (2013) otu
  • "I Go Whoze You ft Vtek (2013) otu
  • " Trouble Dey Sleep ft Konga (2016) otu

Nsidee dezie

  1. Peace or War: An Interview with Eedris Abdulkareem
  2. Youtube Interview
  3. I’ve been vindicated again because Nigeria is still jaga jaga - Eedris Abdulkareem (en-US) (2020-01-13).
  4. Nigeria and the Jaga Jaga Prophecy. The Tide Newspaper Corporation (16 December 2016).
  5. Obasanjo still fighting Eedris over Nigeria jaga jaga (31 August 2012). Archived from the original on 19 May 2017. Retrieved on 26 November 2020.
  6. Obasanjo is my mugu- Eedris Abdulkareem (en-GB) (2012-09-03).
  7. ‘Buhari Is Nigeria’s Most Successful Fraudster In History’, Eedris spits fire! (en-US) (2018-10-31).
  8. Oluwafunmilayo, Akinpelu (2018-12-27). New photos of singer Eedris Abdulkareem's adorable kids surface online (en).
  9. Nigerian celebrities who have carried the Olympic Torch. Ringier Nigeria (8 August 2016).