Collete Nwadike
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 6 Eprel 1991 |
Ebe ọmụmụ | Makurdi |
ọrụ ọ na-arụ | model |
webụsaịtị | http://colletenwadike.com/ |
Collette Nwadike Audio (a mụrụ n'6 Eprel n'afọ 1991 bụ onye ngosi ihe nlere anya uwe nke Naijiria, eze nwanyị nma na onye na-eme ihe nkiri na Nollywood. Ọ nọchitere anya Naịjirịa n' Exquisite Face of the Universe Pageant na Sao Tome were pụta onye mmeri, bụrụ onye Afrịka mbụ mere nke a. [1] [2] N'afọ 2014. Ọ bụkwa onye mmeri nke Miss Tourism nke Naijiria. Otu ọnwa o merichara makwa mee njem nkwanye ugwu, e mere ya S.A nke Gọvanọ nke Anambra Steeti bụ Chief Willie Obiano. Ọ bụ onye nnọchianya nke akara Miss Tourism Nigeria.
Mbido ndụ
dezieA mụrụ Collette n'ụbọchị nke 6 n'Eprel afọ 1991 na Makurdi,dị na Benue Steeti, n'ezinụlọ Maazị na Oriakụ Simon na Angelina Nwadike. [3] O nwere ụmụnne nwanyị ise na nwanne nwoke ma bụrụkwa nwa nwanyị ikpeazụ na nwa nke abụọ. N’agbanyeghi na ọ bụ nwaafọ Nise di na Awka -South Local Government Area, n'Anambra Steeti, Nwadike tolitere na Makurdi n’etiti Naijiria, ebe ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke junịọ sekọndịrị tupu ya agaa Legos iji mechaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya.
N'ajụjụ ọnụ ya na Nwadike kwuru, o kwuru, sị: "Dịka nwata nwanyị na-etolite etolite, a na-ahụkarị onwe m dịka eze nwanyị mara mma mgbe m dị afọ atọ. A nọ m na-elekwasị ndị dị ka Bianca Odumegwu-Ojukwu, Regina Askia-Williams anya . A hụrụ m otú ha si maa mma na otú ha si a muke. E chere m ị dị ka ndị a otu ụbọchị! Nke a bụ nrọ m rọgoro ogologo oge. Ọ dịkwa ka m na-ebi nrọ m ugbu a. " Ọbụnadị ka nwatakịrị, o nwere ọchịchọ nke ịbụ eze nwanyị mara mma ; a kpọrọ ya adaeze n’etiti ndị ezi na ụlọ na ndị enyi ya. O nyeere ya aka n'afọ 2001 mgbe o lechara Agbani Darego, .
Mmụta
dezieCollette gara God's Heritage Nursery and Primary School, Makurdi,na Benue Steeti (1993-1995) na Holy Ghost Nursery and Primary School, Makurdi,na Benue Steeti n'afọ 2000. O mechara gaa Anglican Secondary School, Makurdi, Benue Steeti site n'afọ 2001 ruo afọ 2006, were gụchaa O'Level na Caro Secondary School, Olodi-Apapa, Legos Steeti . Mgbe ọ gbara afọ iri na isii n’afọ 2007, a nabatara ya na mahadum nke Nnamdị Azikiwe dị n’Awka ebe ọ gụrụ asụsụ bekee na agụmagụ n’okpuru prọfesọ Joy Chinwe Eyisi na Rems Umeasiegbu dịka ndị nkuzi a ma ama.
N'ajụjụ ọnụ Collette Nwadike banyere kọọsụ ọ gụrụ na mahadum, o kwuru, sị, "E nwetara fọọmụ ya na onwe m, m were denye Asụsụ Bekee na Agụmagụ n'oge mbụ, ma mgbe enyeghị m ya, m nwetara fọọmụ ọzọ ma denyekwa kọọsụ ahụ nke ugboro abụọ. Mmasị m nwere n’asụsụ Bekee bụ n’agụmagụ n'ezie. E nwere m mmasị n'ịgụ akwụkwọ,nke ahụ bụ otu n'ime ihe mere m ji gaa ị gụ kọọsụ a. E nwere m mmasị na akwụkwọ agụmagụ ndị Naijiria. " [4]
Ọrụ
dezieNgosi uwe na pajentịrị
dezieTupu Nwadike a bụrụ eze nwanyị mara mma, ọ gụpụtala ma sonye n'asọmpi ụdị dị iche iche ma gosipụta ya n'ọtụtụ ihe ngosi uwe. Ọ na-arụ ọrụ, ya na ụfọdụ ndị ọkachamara a maara ọfụma n'eyimeyi na ndị staịlisti na Naijiria. Nwadike e kpebiela ọtụtụ asọmpi ị ma nma, ya na asọmpi eyimeyi na ngosi uwe gụnyere Miss Tourism Nigeria 2015 na Mr. Universe Nigeria 2015.
Collette Nwadike e sonyela n’asọmpi ị ma mma dị iche iche dịka Miss Global Nigeria na Miss Earth Nigeria, ebe ọ bụ onye osote. N'afọ 2014,e kpuwere Nwadike okpu mmeri Miss Tourism Nigeria, e mere n'ọnwa Mee na Legos Steeti, na Naijiria . Ọ nọchitere anya Anambra steeti, n’ime ndị asọmpị iri atọ na ise ndị ọzọ na-anọchite steeti ha. Mgbe e mechara nyocha, e nyere Nwadike okpu mmeri n’abalị ahụ; anya ya juputara na anya mmiri nke obi uto. [5] [6] Otu ọnwa ka e kpnyechara ya okpu mmeri Miss Tourism nke afọ 2015, ọ gara njem nkwanye ugwu i leta Gọvanọ nke Anambra Steeti bụ Chief Willie Obiano . Ha gagharịrị na steeti i ji hụ ebe nlegharị anya dị iche iche. Na nleta ya, akpọpụtara ya ị bụ Onye ndumodu Gọvanọ maka njem. Kemgbe ahụ, Nwadike na-arụ ọrụ na Gọọmentị Steeti gụnyekwa ọrụ ọzọ ọ na-arụ.
N'ọnwa Disemba afọ 2015, ọ nọchitere anya Naịjirịa na Exquisite Face of the Universe nke e mere na Sao Tome and Principe, nke metụtara ihe karịrị ndị asọmpi iri ise sitere mba dị iche iche nke ụwa. O meriri were nweta okpueze nke mere ka ọ bụrụ nwanyị ojii mbụ meriri n'asọmpi ahụ. [7]
Ị me ihe nkiri
dezieYa na ndị ome ihe nkiri ochie na Nollywood arụkọọla ọrụ, dị ka Obi Emelonye, Ikechukwu Onyenka, Kasvid Movies, SimonPeaceMaker, Ndave David Njoku dgz. Ọ bụ onye isi ụlọ ọrụ nke Screen Goddess Global Productions ma nwee ọganihu na usoro ihe nkiri ya bụ African Beauty nke e gosipụtabeghi na ihe onyonyo [8]
Ihe nkiri
dezieIhe nkiri Igwe onyonyo | ||
Aha | Onye nrụpụta | Onyentuziaka |
---|---|---|
The Calabash | Obi Emelonye | |
Single's Diary | Crey Ahanonu | Simon Udo |
African Beauty | Collette Nwadike / Ndave Njoku | Ikechukwu Onyenka |
Ihe nkiri | ||
Aha | Onye nrụpụta | Onyentuziaka |
Royal Mission | Chijioke Nneji of Magic Movies | Caz Chidiebere |
Chase | Simon Udo | |
O42 | Caz Chidiebere | |
Vidio egwu | ||
Aha | Ndị ọgụegwu | Onyentuziaka |
Bonny and Clyde | Percy ft Solidstar | Unlimited LA |
Ndaghachi azụ na ihe ịga nke ọma
dezieDịka nwata,ọtụtụ ndị ngosi uwe mara mma na ndị na-eme ihe nkiri nwere uwe mara mma na-amasị ya. Ọ gara maka asọmpi ịma mma nke izizi ya ebe ọ sonyere na 2010 Miss National Association of Students of English and Literary Studies (NASELS), Unizik Chapter, mana ọ dara. Mgbe ahụ, ọ nọ n'afọ mbụ ya na mahadum . Ọ gara n’ihu ịzọ ọkwa Miss (UNIZIK) Mahadum nke Nnamdi Azikiwe ma daa. O chere maka ị nwale asọmpi na-bụghị asọmpi ụlọ akwụkwọ were gaa Most Beautiful Girl in Nigeria (MBGN), mana ọ dị mwute na ọ gafeghị nnyocha ahụ. O gafere nnyocha nke Port Harcourt mana ọ kwụsịrị na nke Legos . Mana ọ daghachighị azụ, ọ gara Miss Earth Nigeria, ebe ọ banyere n'ogige ha dị na Lekki,na Legos ma mee nke ọma n'ogige ahụ n'agbanyeghị na ọ pụtaghị otu n'ime ndị meriri n'ikeazụ. E mere mmemme a na "Incubator". E nyere ya nrite Miss Earth Photogenic. Ọsọ ya ịbụ eze nwanyị mara mma gara n'ihu n'afọ 2012 mgbe ọ zọrọ asọmpi Miss Global Nigeria. Nkwado nke nne ya gbara ya ume,o were chọpụta na ọ pụghị ị kwụsị, ị chọ i weta obi ụtọ na i me ka nrọ ya bịa na mmezu. Ọ zọrọ ọkwa Most Beautiful Girl in Abuja were pụta onye nke atọ n'afọ 2013. N’afọ 2014,ọ hụrụ ihe omume Miss Tourism nke Naịjirịa na ntanetị. Ọ gara nnyocha n'Owerri,nke Imo Steeti . Ọ nọchitere anya Anambra steeti. E mere ihe omume a n'ụbọchị nke 17 n'ọnwa Mee nke afọ 2014 ma mee ya na Ruby Gardens. [9]
Nrụtụaka
dezie- ↑ Nigerian Collette Nwadike wins Exquisite Face of the Universe 2015 beauty pageant in São Tomé
- ↑ the great pageant community The great pageant Community 24 December 2015
- ↑ Why I felt intimidated when I saw other girls –Collette Nwadike. Archived from the original on 2016-02-26. Retrieved on 2020-11-10.
- ↑ Interview with Collette by mynewswatchtimesng retrieved June 28 2014. Archived from the original on 2016-02-26. Retrieved on 2020-11-10.
- ↑ Collette Nwadike, 23-Year-Old Winner Of Miss Tourism Nigeria 2014 Releases Promo Photos. Archived from the original on 2020-11-11. Retrieved on 2020-11-10.
- ↑ MEET MISS TOURISM NIGERIA 2014 COLLETE NWADIKE
- ↑ she emerged winner EFOU. Archived from the original on 2016-06-23. Retrieved on 2020-11-10.
- ↑ screengoddessglobalproductions.com. Archived from the original on 2016-11-27. Retrieved on 2020-11-10.
- ↑ The News watch times with Collete Nwadike in an interview