Chinwe Chukwuogo-Roy

Onye nka Naijiria (1952-2012)
Chinwe Chukwuogo-Roy
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereChinwe Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya2 Mee 1952 Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya17 Disemba 2012 Dezie
Ebe ọ nwụrụHacheston Dezie
Ụdị ọnwụeke na-akpata Dezie
ihe kpatara ọnwụọrịa kansa Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ese, onye na-akpụ ihe ọkpụkpụ Dezie
ebe agụmakwụkwọMiddlesex University Dezie
agbụrụNdị Igbo Dezie
Ihe nriteOnye otu Order nke Alaeze Ukwu Britain Dezie
onye nnọchite anya nwebiisinkaikike mmeputakwa nke CISAC-otu nọchiri anya ya Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Chinwe Ifeoma Chukwuogo-Roy MBE (ụbọchị nke 2 n'ọnwa Mee n'afọ 1952 [1] ruo ụbọchị nke 17 n'ọnwa Disemba n'afọ 2012) bụbu onye na-ese ihe nke amụrụ n'Awka (Oka), Anambra steeti, nke Naijiria, mana ọ nọrọ ọtụtụ ndụ nwata ya n'Ikom na Kamerun, tupu ọ laghachi n'ụlọ ezinụlọ ya dị n'Ụmụbele dị n'Awka . O bibu na Briten kemgbe afọ 1975. [2] Ihe osise ya, mbipụta ya na ihe ọkpụkpụ ya bụcha ihe ị ma atụ, n'ụdị eserese,oyiriihe dị ndụ, ala na akụkọ. O meriri anya mba uwa n’afọ 2002 n’ihi i bụ onye mbu [3] n’ime ndi omenkà abuo nke Naijiria (nke ozo bu Ben Enwonwu ) ndị e nyere ohere iji see ihe osise Queen Elizabeth II.

A họpụtara Chukwuogo-Roy dịka onye otu Member of the Order of the British Empire (MBE) na 2009 Birthday Honours.

Ndụ ya dezie

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ dezie

A mụrụ Chinwe Chukwuogo-Roy na Ondo Steeti, Naịjirịa, mana ya na ezinụlọ ya kwagara Ikom na Cross River steeti, ebe nna ya nwere ọtụtụ ugbo koko. Mgbe ọ dị afọ iri na ụma ọ bụ onye gbara ọsọ ndụ na agha Biafra ma mesịa kwaga n'ụlọ ezinụlọ ya dị n'Awka, n'Anambra Steeti mana n'afọ 1975, ọ kwagara Britain. [4] Ọ gụrụ akwụkwọ na kọleji East Ham were nweta nzere bachelọ na Graphic Design na Hornsey College of Art (nke bụzi akụkụ nke Mahadum nkeMiddlesex ) n'afọ 1978. Ọ malitere ọrụ i se ihe n'afọ 1988.

Ọrụ nka dezie

Chukwuogo-Roy bu onye a ma ama na mba uwa maka ihe osise nke Golden Jubilee nke Queen Elizabeth II, nke The Commonwealth Secretariat hụrụ mka ya . E kpuhere ihe osise a n'uju na emume na Marlborough Housesite n'aka onye isi odeakwụkwọ Commonwealth Don McKinnon na ụbọchị Commonwealth,n'afọ 2002. [5]

Usòrò:Portrait of HM Queen Elizabeth II by Chinwe Chukwuogo-Roy.jpg
Foto nke jubilii nke Queen Elizabeth II

Ọrụ eserese ya ndị ọzọ a na-anụ aha ha gụnyere foto Kriss Akabusi, Chief Emeka Anyaoku, Onye Isi Obodo nke Norwich. [6] Martin Keown nyere ya ọrụ ka ọ tee ama egwuregwu Highbury nke Arsenal penti. [7]

N'afọ 2003, Chukwuogo-Roy nọchitere anya United Kingdom na European Council Committee na Paris, na-adụ ọdụ na Contemporary African Art and Artists. N'ọnwa Disemba nke afọ ahụ, ọ tụkwara ma hazie ihe ngosi "Celebrate" Exhibition for the Commonwealth Heads of Government Meeting n'Abuja . [8]

Chinwe bụ onye guzobere otu a ma ama nke a kpọrọ Sudbourne Printmakers, metụtara ọtụtụ ndị na-ese ihe nke Suffolk . [9] [10]

N’ọnwa Disemba afọ 2012, ka ọ rịachara ọrịa ogologo oge n’ọrịa kansa, ọ nwụrụ n’ụlọ ya na Hacheston, nke dịdebere Framlingham,na Suffolk. [4]

Ụdị na echiche dezie

Chukwuogo-Roy mepụtara eserese, mbipụta na akpụrụakpụ ndị kachasị bụrụ ihe atụ, n'ụdị eserese,ihe eserese yiri ihe dị ndụ, la na akụkọ. Ihe osise ya nke ihe okike bu ihe olile anya ma obu mmemme. Kosiladị, ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ nke, dị ka Sandra Gibson nke Nerve si kwuo, na-egosipụta "mmetụta dị mgbagwoju anya nke enweghị olileanya, ụjọ na ọchịchọ". Ndị a ma ama n'etiti ọrụ ya ndị a bụ "Migrants" na ya "African Slave Trade". [11]

Ọba ya na ihe ngosi dezie

Ọmụmaatụ ọrụ Chukwuogo-Roy dị n'ọtụtụ ọba eserese ọha na nke onwe, gụnyere nke Queen Elizabeth II, na nke Olusegun Obasanjo, onye bụbu onye isi ala Naijiria.

Usòrò:Water Moon Monotype by Chinwe Chukwuogo-Roy.jpg
Water Moon Monotype site n'aka Chinwe Chukwuogo-Roy

Chukwuogo-Roy gosipụtara na Briten niile, yana mba ụwa. A na-egosi ọrụ ya na ọba eserese ọha na nke onwe na Antigua, Argentina, Australia, France, Grenada, Ireland, Kenya, Malaysia, Moçambique, Netherlands, Nigeria, Portugal, South Africa, Spain, Swaziland, United Arab Emirates, United Kingdom na Amerịka. [12] O nwere ọtụtụ ngosipụta nke naanị ya gụnyere ndị nke Christchurch Mansions, Ipswich; The Mall Galleries, London; The Royal Commonwealth Society, London; Sainsbury Centre for Visual Arts, University of East Anglia; Reve's Cork Street Gallery, London; Connecticut University, Connecticut; Didi Museum, Lagos; UNESCO, Paris; Aldeburgh Festival Gallery, Suffolk; Colchester and Ipswich Museum Saatchi Gallery; Suffolk,,

Ihe osise Chukwuogo-Roy nke onye Commonwealth Secretary-General Emeka Anyaoku nke afọ 1990 ruo 2000 bụ nke Queen Elizabeth II kpughere n'afọ 1999 were kowe ya n'akụkụ foto Golden Jubilee nke onwe ya na Marlborough House . E nweela ngosi ebighebi nke ọrụ ya na Menzies & Hancock Rooms na School of Advanced Study nke University of London kemgbe Mee afọ 2006.

Ihe nhubama na nrite dezie

Chukwuogo-Roy nwetere ọtụtụ ihe nhuba ama ma gosipụta nke ọma n'ihe mgbasa ozi mba ụwa, ma maka nka ya na kwa ọrụ ebere na ọrụ nkuzi ya na ndị na-eto eto. Akwukwo ihe omuma nke aha ya bu Chinwe Roy - Artist, nke Tamarind Books biputara, ka umuaka nọ na UK na-agụ ugbu a dika akụkụ nke National Curriculum.

N’afọ 2003, Mahadum nke East Anglia nyere Chukwuogo-Roy onyinye Honorary Doctorate of Letters.

Ọrụ ya pụtara na stampụ akwụkwọ nzipu ozi nke mba asaa n'afọ 2006. [13] N'afọ 2008, a kpọrọ ya ka ọ gwa ndị Cambridge Union okwu. N’afọ 2010 Chukwuogo-Roy bụ onye e mere Member of the Most Excellent Order of the British Empire (MBE) maka ntụnyeoke ya na nka.

Ebe m si dee dezie

1. "Chinwe Chukwuogo-Roy, M.B.E. (Nigerian, born 1952)", Bonham's, 16 March 2011.
2. Verna Wilkins, "Chinwe Chukwuogo-Roy obituary", The Guardian (London), Other Lives, 30 January 2013.
3. Bosah, Chukwuemeka (2017). The art of Nigerian women, Okediji, Moyosore B. (Moyosore Benjamin). ISBN 978-0-9969084-5-0. OCLC 965603634.
4. 4.0 4.1 Craig Robinson, "Hacheston: Tributes to acclaimed artist Chinwe Chukwuogo-Roy after three year battle against cancer", East Anglian Daily Times, 22 December 2012.
5. "Portrait shows Queen as head of nations", The Telegraph, 11 March 2002.
6. "Chinwe… Brushing Kings and Lords", Arts with Tajudeen Sowole, 8–14 January 2006.
7. Artists Profile: Chinwe Chukwuogo-Roy, MBE, Alexandra Gallery.
8. "Chinwe Chukwuogo-Roy", AfricaResource, 27 June 2006.
9. "EADT", 17 April 2009.
10. Sudbourne Park Printmakers.
11. "Chinwe Roy, Queen’s Portraitist Passes On", The Guardian (Nigeria), 29 December 2012.
12. [1]
13. Saatchi Gallery.