Chinese tea culture
obere ụdị nke | tea culture, Chinese culture |
---|---|
Akụkụ nke | tea culture of East Asian cultural sphere |
ihu nke | China |
mba osi | China |
intangible cultural heritage status | Representative List of the Intangible Cultural Heritage of Humanity |
kọwara na URL | https://ich.unesco.org/en/RL/traditional-tea-processing-techniques-and-associated-social-practices-in-china-01884, https://ich.unesco.org/fr/RL/les-techniques-traditionnelles-de-transformation-du-th-et-les-pratiques-sociales-associes-en-chine-01884, https://ich.unesco.org/es/RL/tcnicas-tradicionales-de-elaboracin-del-t-y-prcticas-sociales-asociadas-en-china-01884 |
WikiProject na-elekọta ya | WikiProject Intangible Cultural Heritage |
Templeeti:Infobox ChineseOmenala tii China na-akowa otu esi emepụta tii ndị China, yana oge mmemme ndị mmadụ na -eri tii na China . Omenala tii na China dị iche na nke ndị mba Europe, dịka Britain, na mba ndị ọzọ dị n'ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ndịda Ọwụwa Anyanwụ mba ndị dị na Eshia, dị ka Japan, Korea, na Vietnam, na nkwadebe, ụtọ na mmemme mgbe a na-añụ ya. Na China, a ka na -añụ tii mgbe niile, ma n'oge nkịtị ma n'oge ọrụ . Na mgbakwunye na ịbụ ihe Nri a mara dịka ihe ọṅụṅụ, eji ya eme ọgwụ ọdịnala ndị China nakwa na nri ndị China .
Usoro ọmụmụ
dezieEchiche nke <i id="mwLA">omenala tii</i> ka ndị Chaịna mara dị ka chayi ("nka ịṅụ tii"), ma ọ bụ cha wenhua ("omenala tii"). Mkpụrụokwu cha (茶) na-enye nghọta ihe ọṅụṅụ nke sitere na Camellia sinensis, osisi tii. Tupu narị afọ nke asatọ BCE, Mmadụ niile mara tii d ịka mkpụrụokwu 荼 (pinyin: tú) yana ọtụtụ ahịhịa ndị ọzọ na-elu ilu. Ihe odide China abụọ a bụ yiri onwe ha ma ewezuga mgbakwụnye kwụ ọtọ ọzọ na mkpụrụedemede China, nke sụgharịrị ka tii. Aha ejiri mara ya gbo mejupụtara buu艸(pinyin: cǎo) ya belatara ụdị艹na agwa余(pinyin: YU), nke na-enyqqe ezigbo uda.
Omenaala ịṅụ tii
dezieEnwere ọtụtụ ọnọdụ pụrụ iche nke eji akwadebe ma ṅụọ tii na omenala ndị China, echekwara ya kpamkpam na Isi ala China na Taiwan.
- Ihe ịrịba ama nke nkwanye ùgwù
- Dị ka ọdịnala ndị China si dị, ndị otu ọgbọ na -eto eto kwesịrị igosi nkwanye ùgwù nye ndị ọgbọ ochie site n'onyinye iko tii. [1] Ịkpọ ndị okenye ha n'ụlọ nri maka tii bụ ọrụ ezumike ọdịnala. Di na nwunye lụrụ ọhụrụ na -enye ndị ezinaụlọ ha okenye. N'oge gara aga, ndị nọ n'ọkwa dị ala nke mmekọrịta ọha na eze na-enye ndị ọkwa ha dị elu n'etiti ọha mmadụ tii. Taa, ka otuto nwere onwe nke ọha China, iwu nke a na nkọwapụta ya a bịara ikiri.
- Ịrịọ mgbaghara
- Na omenala ndị China, enwere ike inye tii dị ka akụkụ nke ịrịọ mgbaghara. Ọmụma atụ , ụmụaka ndị mere omume ọjọọ nwere ike inye nne na nna ha tii dị ka ihe ngosi nke ịkwa ụta na ido onwe ha n'okpuru.
- Iji gosi ekele wee mee mmemme agbamakwụkwọ
- N'emume alụmdi na nwunye omenala ndị China, nwanyị na -alụ nwanyị ọhụrụ na -esekpuru ala n'ihu nne na nna ha, yana ndị ikwu meworo agadi dị ka nne na nna ochie wee jeere ha tii wee kelee ha, ọnụ nke na -anọchite anya ngosipụta ekele na nkwanye ugwu ha. Dịka omenala si dị, nwanyị a na -alụ ọhụrụ na -ejere ezinaụlọ abụọ ozi. Usoro a na -anọchite anya njikọta ezinụlọ abụọ ahụ.
Ọpịpị mkpịsị aka
dezieỌpịpị mkpịsị aka ọkụ bụ ụzọ na -ezighi ezi iji kelee onye nwe tii ma ọ bụ sava tii maka tii. Mgbe ma ọ bụ mgbe iko onye juputara na ya, onye na -anata tii nwere ike pịa mkpịsị aka mbụ na mkpịsị aka etiti (otu ma ọ bụ karịa na ngwakọta) iji kelee onye nyere tii ahụ. [2] Omenala a bụ ihe a na -ahụkarị na ndịda China, ebe nri ha na -esokarị ọtụtụ tii.
Ekwuru na omenala a bidoro na usoro ndị eze Qing mgbe Qianlong Emperor na -eme njem na mgbanwe na alaeze ukwu niile, a gwakwara ndị ohu ya ka ha ghara ikpughe onye nwe ha. [3] Otu ụbọchị n'ụlọ nri dị na ndịda China, eze ukwu wụsara onye na -ejere ya ozi tii. Nye ohu ahụ, ọ bụ nnukwu ihe ùgwù ka eze ukwu wụkwasị ya iko tii. N'ịbụ onye ọ na -adịghị ahụkebe, ọ chọrọ igbu ikpere n'ala kpọọ isi ala iji kelee eze ukwu, n'agbanyeghị na ọ nweghị ike ime nke a ebe nke ahụ ga -eme ka a mata onye eze ukwu ahụ bụ. Kama nke ahụ, o jiri mkpịsị aka gbadara tebụl ahụ iji gosi ikpere n'ala nye Eze Ukwu na igosi ekele na nkwanye ùgwù ya. N'echiche a, mkpịsị aka ndị a gbagọrọ agbagọ na -egosi onye na -akpọ isiala.
Na emume tii a na -ekwe n'isi ma ọ bụ ịsị "daalụ" dabara adaba.
Mmepụta tii China
dezie
Ụzọ dị iche iche esi emepụta tii China na dabere n'ụdị dị iche iche dị ka emume si aga, ụzọ ndị na -akwadebe ya na ụdị tii a na-eme. Dịka ọmụmaatụ, tii akwụkwọ ndụ dị n'ụdị n'esighi ike karịa tii oolong ma ọ bụ tii ojii ; ya mere, a ga -eji mmiri jụrụ oyi tee tii akwụkwọ ndụ Ụzọ kachasị mfe esi eme tii bụ ịtinye akwụkwọ n'ime ite nwere mmiri ọkụ. A na -ahụkarị usoro a ezinụlọ na ụlọ oriri dịka ọmụmaatụ, n'ihe metụtara Dim sum ma ọ bụ yum cha na ụlọ nri Cantonese . Ụzọ ọzọ esi enye tii bụ iji obere efere kpuchiri ekpuchi akpọrọ gaiwan. Eze Ukwu Hongwu nke usoro ndị eze Ming nyere aka n'ịzụpụta mmepụta tii di mfe site na mmechi imepụta tii abịakọrọ .
Gongfu cha (Kung fu tii)
dezie
Gongfu cha, nke pụtara "iji nka eme tii", bụ usoro a mara nke ọma na mmemme tii na China . Ọ na -eji obere it tii Yixingejide ihe dị ka 100-150 ml (anọ ma ọ bụ ise fl.oz.), nke a na -eche na ọ ga -eme ka ihe ịchọ mma dịkwuo mma yana '' megharịa '' ụtọ tii a na -eme. A na -eji obere iko tii yana teapot Yixing. A na-aṅụkarị tii Gongfu mgbe e rischara nri iji nyere mgbaze nri aka. Enwere ike ịme tii na ite tii Yixing iji mee onwe gị obi ụtọ yana ịnabata ndị ọbịa. Dabere na mpaghara China, enwere Ndị iche na usoro nke ime tii yana ngwaọrụ eji eme tii. Ọmụma atụ, ụdị gongfu chau nke Taiwanese na-eji ọtụtụ ngwa ndị ọzọ gụnyere ihe bekee kpọrọ tweezers na tea strainer. Usoro a na-emetụtakarị tii oolong, mana a na -eji ya eme pu'er na tii ndị ọzọ gbara ụka.
Mmetụta n'omenala ndị China
dezieTea nwere mmetụta dị ukwuu na mmepe nke ọdịbendị China, yana ọdịnala China nwere njikọ chiri anya na tii China. [4] A na -ejikọkarị tii na akwụkwọ, nka, na nkà ihe ọmụma ma nwee njikọ chiri anya na Taoism, Buddha na Confucianism. O siri ike kemgbe usoro ndị eze Tang, ịnu tii abụrụla akụkụ dị mkpa nke ịkọ onwe onye. A na -ejikọkwa nkà ihe ọmụma China Chan (nke yiri Japanese Zen) na ịṅụ tii.
Ngwa Tii
dezieNa omenala, a na-ewere ndị na-aṅụ tii dịka 'ndị agụmakwụkwọ' na 'ndị ọkaibe' nke ọha. E weere omume ịnụ tii dị ka ngosipụta nke omume ọma, agụmakwụkwọ, ụkpụrụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ọnụ ego ịre ahịa tii dịgasị iche dabere na akụrụngwa ya na ịdị mma ya. Otu ngwa tii nwere ike na-eri narị puku kwuru puku ebe otu ngwa tii dị ala nwere ike dị naanị ihe na -erughị otu narị dollar. Mbawanye ịnụ ọkụ n'obi maka ịnu tii mere eji emepụta Ngwa tii, nke mere ka amata ọdịnala China nke ọma.
Ụlọ Tii
dezieNdị ọkà mmụta China oge ochie jiri ebe a na-ere tii dị ka ebe a na -ekerịta echiche. Ebe a na -ere tii bụ ebe ekwuru na nkwado ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ọkwá ọha ka akwụsịtụrụ nwa oge maka ikwu okwu eziokwu na ezi uche. Ịṅụ tii n'ogO ohere kwalitere mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Ebe a na-ere tii abụghị naanị obere ihe sitere n'ọdịbendị tii China ; ọ na -enye ihe akaebe akụkọ ihe mere eme nke akụkọ tii China. Taa, ndị mmadụ nwekwara ike ịhụ ụdị ọnọdụ mmadụ dị na Lao She Teahouse nke Beijing na ụlọ tii ndị ọzọ dị na ọwụwa anyanwụ China dị ka Hangzhou, Suzhou, Yangzhou, Nanjing, Wuxi, Shaoxing, Shanghai na ebe ndị ọzọ. Ọnọdụ ikuku tii ka na-agbanwe agbanwe ma na-agbasi ike.
Omenala Ọgbara ọhụrụ
dezieNa China ọgbara ọhụrụ, ihe fọrọ obere ihe ka ọ bụrụ ebe obibi ọ bụla - ọbụlagodi n'ụlọ ezumike kacha mfe - nwere ngwa ọrụ tii maka mmepụta tii dị ọkụ. Ha bụ akara nnabata maka ndị ọbịa ma ọ bụ ndị agbata obi. Na omenala, a na -atụ anya na onye bịara n'ụlọ onye China ga -anọdụ ala ṅụọ tii ka ọ na-ekwu okwu; ịbịa n'ụlọ onye China na-anọghị ala dịka ebe ị mere ihe n'adịghị mma. Ịkpachi akwa nhicha ahụ na mmemme tii bụ omume ọdịnala a na -eme na China iji wezuga ike qi dị njọ. Na Taiwan, mmemme tii abụghị naanị na ndụ kwa ụbọchị kamakwa n'oge ndị dị mkpa.
A na -ewere tii dị ka otu n'ime ihe asaa achọrọ kwa ụbọchị, ndị ọzọ bụ nkụ, osikapa, mmanụ, nnu, Ofe akịdị na mmanya vine . Enwere ọtụtụ ụdị tii dị ka: tii akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, tii oolong, tii uhie, tii ojii, tii ọcha, tii odo, tii puerh na tii ifuru. Na omenala, a na -atụgharị akwụkwọ tii ọhụrụ n'ime nnukwu efere. Usoro a na -enye ohere ka akwụkwọ ndị a kpọ nkụ n'ụzọ ga echekwa ụtọ zuru oke, dịkwa njikere maka iji ya eme tii
Hụkwa
dezieEbensidee
dezie
- ↑ The Cultural Heritage of China :: Food & Drink :: Tea :: Tea Cultures. www.ibiblio.org. Retrieved on 2021-08-09.
- ↑ Parkinson. The Origin of Finger Tapping - Chinese Tea History. About.com. Retrieved on 1 May 2013.
- ↑ Chiang. The yum cha rules you need to know (en). www.bbc.com. Retrieved on 2021-08-09.
- ↑ Tea in Ancient China & Japan (en). World History Encyclopedia. Retrieved on 2021-08-09.