Oba Akinsemoyin chịrị dị ka Oba nke Lagos site n'afọ 1704 ruo 1749. Nna ya bụ Oba Ado na ụmụnne ya bụ Erelu Kuti na Oba Gabaro, ndị ọ nọchiri.[1]

Dị ka Justice J. O. Kassim tribunal of inquiry report nke 19 Septemba afọ 1978, e nwere ụmụ nwoke isii nke Akinsemoyin, ya bụ, Sadeko, Amore / Olukokun, Abisako, Jolasun, Gbosebi na Aina Egbe.[2]

Ndị na-esonụ bụ ụfọdụ n'ime ụmụ nwanyị Akinsemoyin: Onisiwo, Oniru, Oluwa, na Akogun.[3][4][5]

Ịgba ọsọ ndụ na Badagry n'okpuru ọchịchị Oba Gabaro na ọrụ azụmahịa dezie

Akinsemoyin na nwanne ya nwoke, Oba Gabaro nwere nghọtahie banyere itinye ụmụ Olofin dị ka ndị isi, nke mere ka a chụpụ Akinsemoyi na Badagry. Na Badagry, Akinsemoyin gosipụtara azụmahịa ma wulite mmekọrịta ya na ndị ahịa ohu Europe.[6]

Ịrịgo na iwebata ịgba ohu na Lagos dezie

Mgbe Gabaro nwụrụ, Akinsemoyin ghọrọ Oba n'ihe dị ka afọ 1704 n'agbanyeghị na Gabaro nwere nwa nwoke, Eletu Kekere ma ọ bụ na akụkọ ụfọdụ Eletu Omo.[1][3] Akinsemoyin guzobere ahia ohu na Lagos site n'ịkpọ ndị ahịa ohu Portuguese na Brazil bụ ndị ọ zutere na Badagry.[7] Ọkọ akụkọ ihe mere eme J. F. Ade Ajayi kwusiri ike na Akinsemoyin nyere ndị mmekọ ya na Brazil na Portugal ikike ịchịkwa ahịa ohu. Lagos, ka oge na-aga, meriri ọdụ ụgbọ mmiri Whydah na Porto Novo dị ka ọdụ ụgbọ mmiri ohu na-eduga na Bight of Benin.[1]

N'okpuru ọchịchị Akinsemoyin, e ji tiles kpuchie Iga Idunganran na nke mbụ ya, nke a kọrọ na ndị na-ere ohu Portuguese nyere ya dị ka onyinye.[8]

Ọnwụ dezie

Akinsemoyin nwụrụ n'afọ 1749. Ọ bụ ezie na o nwere ụmụ nwoke anọ, Eletu Kekere, nwa Gabaro, nọchiri ya dị ka Oba.[3][1]

Ihe Nketa dezie

N'ime ụmụ atọ nke Oba Ado - Gabaro, Akinsemoyin, na Erelu Kuti, ọ bụ naanị agbụrụ Akinsemoyi enwebeghị ike ịmepụta Oba nke Lagos. Ewezuga nwa Gabaro, Eletu Kekere, ndị Obas ndị ọzọ niile bụ ụmụ Erelu Kuti site na Ologun Kutere. "Ihe a na-adịghị mma" bụzi isiokwu nke esemokwu na ikpe dịka ụmụ Akinsemoyin na-ama aka n'ocheeze nke Oba nke Lagos ugbu a, Rilwan Akiolu, n'ụlọ ikpe.[2][9]

Edensibia dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Mann (2007). Slavery and the Birth of an African City: Lagos, 1760-1900. Indiana University Press, 2007. ISBN 9780253348845. 
  2. 2.0 2.1 Osuntokun (1987). History of the Peoples of Lagos State. Lantern Books, 1987, 44. ISBN 9789782281487. 
  3. 3.0 3.1 3.2 Cole (17 April 1975). Modern and Traditional Elites in the Politics of Lagos. Cambridge University Press, 1975. ISBN 9780521204392. 
  4. Chief Yesufu Abiodun Oniru. Facebook.
  5. Rufus T. Akinyele (2009). African Cities: Competing Claims on Urban Spaces. BRILL, 2009, 115–117. ISBN 9789004162648. 
  6. Mann (2007). Slavery and the Birth of an African City: Lagos, 1760-1900. Indiana University Press, 2007. ISBN 9780253348845. 
  7. Smith (January 1979). The Lagos Consulate, 1851-1861. University of California Press, 1979, 11–12. ISBN 9780520037465. 
  8. Smith (January 1979). The Lagos Consulate, 1851-1861. University of California Press, 1979. ISBN 9780520037465. 
  9. Oba Akiolu's Claim Being Challenged By Another Royal Family. Archived from the original on 2019-06-17. Retrieved on 2022-09-23.