Ọjà (ngwa egwu)

Ngwa egwu ọdịnala ndị Igbo
Ọja
ngwa egwu
mba/obodoNaijiria Dezie
ebeNdịda ọwụwa anyanwụ Naijiria Dezie
ndị ji ya eme iheNdị Igbo Dezie
ihe eji ya emeomenala, egwu nka Dezie

Ọjà bụ ngwa egwu si n'ọwụwa anyanwụ Naijiria nke a na-ejikarị ngwa ndị Naijiria ndị ọzọ dị ka ekwe, udu, igba, okwa na ichaka/osha eji agu egwu. Ngwá egwú a pụrụ iche ‘na-ekwu okwu’ ka ndị na-akụ egwu na ndị na-agba egwú, na-agba egwu. N'oge a na-agba egwu mmawu na ọwụwa anyanwụ Naijiria, onye ọfụfụ oja na-edu egwu na abụ otuto.[1][2] [3] Onye isi ofufu ọjà na-enwe ike iwepụta ọtụtụ ụda dị ka okwu ọnụ. Ọ bụrụ na onye dị mkpa abanye n'ime oghere igba egwu, onye n'afu ọjà nwere ike iji ngwá egwu a kpọsaa aha onye ahụ. [2]

Nkọwa dezie

 
ngwa egwu Afrika

Ọjà bụ ngwa egwu agụnyere na ngwa egwu ikuku. E nwere ihe abụọ a na-eji arụ ya, nke mbụ bụ osisi, nke na-abụkarị osisi dị nro ma na-egbuke egbuke; nke abụọ bu nke e ji achara mee. N'ime ụdị ihe abụọ a e ji arụ ya, nke osisi na-aka nọtee aka ruo ogologo oge. Ọjà dị ezigbo mkpa, nwekwa ike na ọrụ dị omimi ọ na-arụ na omenala nakwa ndụ ndị Igbo. Ihe e ji mara ọjà bụ ụdị ụda dị elu dị iche iche ọ na-emepụta, na-agbanyeghị na ọ bụ ngwá egwu dị ntakịrị. Ọjà kachasị ukwuu onye odeakwụkwọ bụ Paul Basu chọpụtara dị ihe dịka 26cm n'ogologo, ma nke kacha nta dị 14cm n'ogologo. Ogo ọjà ọbụla na-ekpebi ịdị elu nke ụda ya nakwa ịdị mma ya na ọrụ dịka ngwá egwu. [2]

Ụdị ọjà dezie

Ndepụta ndị a dị n'okpụrụ n'akọwa ụdị ọjà di iche iche na ala Igbo

  • Ọjà Mmanwụ: ọjà eji eme mmemme mmanwụ
  • Ọjà Okolọbia: ọjà nke a bụ nke a na-eji eme emume ụmụ nwoke topụtara dimkpa
  • Ọjà Igede: Nke a bụ ọjà uda ya kacha dị ala. Igede bụ ịgba a na-eji eme emume olili mmadu. A na-eji Ọjà igede eme ihe n'ụzọ abụọ, nke mbụ bụ ọjà nwoke, nke na-akpọ oku; nke abụọ bụ ọjà nwanyị; nke na-aza aza.
  • Ọjà Ukwe: a na-eji nke a eme mmemme maka ịgba ụdị egwu ụmụ nwanyị ọ bụla.[2]

Ngwa egwu Igbo ndị ọzọ dezie

Reference dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 7 traditional Igbo musical instruments (pictures) - Opera News. ng.opera.news. Archived from the original on 2023-02-10. Retrieved on 2023-02-10.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Paul Basu (2018-10-25). Alele, Ọja, Flute (en-GB). [Re:]Entanglements. Retrieved on 2023-02-10.
  3. Michael Chiedoziem Chukwudera (2021-07-21). Oja, The Musical Instrument That Mirrors Igbo Spirituality (en). Retrieved on 2023-02-10.
  4. 4.0 4.1 Adrianna Simwa (2017-09-22). Top 10 Igbo Traditional Musical Instruments (en). Legit.ng - Nigeria news.. Retrieved on 2023-02-10.

External links dezie