Zakaria Zubeidi
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịỌchịchị Palestaịn Dezie
aha n'asụsụ obodoزكريا الزبيدي Dezie
Aha enyereZakaria Dezie
aha pseudonymقط الشوارع Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya1976 Dezie
Asụsụ obodoArabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaHebrew Dezie
Ọkwá o jimember of Fatah Revolutionary Council Dezie
Ebe obibiJenin, Ramallah Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịal-Aqsa Martyrs' Brigades Dezie
ihe omume dị ịrịba amaSecond Intifada, 2002 Beit She'an attack, Gilboa Prison break Dezie

Zakaria Muhammad 'Abdelrahman Zubeidi (Arabic; mkpụrụ okwu ndị ọzọ gụnyere Zakariyah Zbeidi, Zacharia na Zubaidi) (amụrụ n'afọ 1976) bụ onye bụbu onye isi Jenin nke Al-Aqsa Martyrs' Brigades.

A na-ewere ya dị ka “akara nke Intifada”, ọ nọkwa na ndepụta Israel kacha chọsi ike ruo ọtụtụ afọ. N'ajụjụ ọnụ na 2005 ọ weghaara ibu ọrụ maka mwakpo Beit She'an 2002 nke gburu mmadụ 6. O kwere nkwa ịhapụ ngwá agha ya dị ka akụkụ nke mgbaghara ndị Israel na 2007, n'agbanyeghị na ọ dịghị mgbe ọ hapụrụ egbe ya n'echiche nke ịhapụ ha n'aka ndị ọchịchị. Otú ọ dị, Zubeidi kwetara ịkwụsị ime ihe ike, na mgbe oge nyocha ọnwa atọ gasịrị, e wepụrụ na listi ndị Israel chọrọ. O mechara tinye onwe ya na 'mmegide omenala' n'ụdị nkwado maka Freedom Theatre na Jenin Refugee Camp.

N'abalị iri abụọ na asatọ n'ọnwa Disemba n'afọ 2011, Israel kagburu mgbaghara Zubeidi, na Mee n'afọ 2012, ndị Palestinian National Authority jidere ya n'ebughị ya ebubo ruo ọnwa isii.[1] N'abalị iri abụọ na asaa n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2019, e jidere Zubeidi ọzọ ma n'ọnwarị n"ọnwa Mee, e boro ya ebubo n'ihu ụlọ ikpe ndị agha Israel na ọ na-eme ma ọ dịkarịa ala mwakpo abụọ na bọs ndị nkịtị na West Bank.[2] Na Septemba 6, 2021, ya na ndị mkpọrọ Palestine ise ndị ọzọ gbapụrụ n'ụlọ mkpọrọ Gilboa dị n'ebe ugwu Israel, site na ọwa mmiri ha gwuru.[3][4][5] Ụbọchị ise ka e mesịrị, na Septemba 11, 2021, e jidere Zubeidi na nso obodo Israel nke Kfar Tavor.

  1. Phelan (30 December 2011). Israel revokes pardon for Zakaria Zubeidi, former Palestinian fighter turned theater director. GlobalPost. Retrieved on 14 September 2021.
  2. Kubovich. "Israel Charges Former Palestinian Militant Leader With Carrying Out Terror Attacks", Haaretz, May 20, 2019.
  3. "Zakaria Zubeidi, Israel's Most Wanted Fugitive, Hailed as Palestinians Celebrate Jail Break", Associated Press, September 11, 2021. Retrieved on September 14, 2021.
  4. Ahronheim (8 September 2021). Manhunt continues for Palestinian prisoners who escaped jail. Jerusalem Post. Retrieved on 14 September 2021.
  5. Who is the Escaped Prisoner from "Gilboa", Zakaria Al-Zubaidi? (6 September 2021).