Zainab Usman Sa'idu Dakin Kara
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
ụbọchị ọmụmụ ya | 1979 |
Zainab Usman Saidu Dakingari (née Yar'Adua; amụrụ n'ubochi mbu n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1979) bụ nwa nwanyị nke ónyé bụbu onye isi ala Naịjirịa, Alhaji Umaru Musa na nwunye onye bụbu Gọvanọ nke Kebbi Steeti, Alhajii Usman Saadu Nasamu Dakingari.[1][2][3][4]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ Zainab Umaru Musa Yar'Adua na Katsina Steeti na ubochi mbụ n'ọnwa Ọktoba 1979 n'aka Umaru Musa yar'Adua. Ọ bidoro ọrụ agụmakwụkwọ ya na Katsina Steel Rolling Primary School n'etiti afọ 1986 na 1992. Ọ malitere agụmakwụkwọ sekọndrị ya na Government Girls Secondary School Bakori n'etiti afọ 1993 na 1996, ma mesịa sonye na Essence International School Kaduna n'etiti 1996 na 1999. Ọ bụ nwa akwụkwọ na Maiduguri, Borno State, site na 2000 ruo 2002. N'agbata afọ 2003 na afọ 2006, ọ bụ nwa akwụkwọ na Mahadum Huron, London, United Kingdom na Project Management College, United Kingdom.
Ndọrọ ndọrọ ọchịchị
dezieỌ bụ nwanyị mbụ nke Steeti Kebbi site na 2007 ruo 2015 yana ónyé mbido na ónyé isi oche ZADAF Foundation for Women and Children Empowerment.
Ihe nrite / Nsọpụrụ
dezie- Federal Medical Center, Birnin Kebbi Child Health Week, Equity 2009 (5 August 2009)
- Women for Peace International Global Peace Diplomat (30 Septemba 2009)
Akwụkwọ
dezie- Kabir, Hajara Muhammad,. Mmepe ụmụ nwanyị nke ugwu. [Naijiria]. . OCLC 890820657.
Edensibia
dezie- ↑ Kabir (2010). Northern women development. ISBN 978-978-906-469-4. OCLC 890820657.
- ↑ Usman Saidu Nasamu Dakingari biography, net worth, age, family, contact & picture. www.manpower.com.ng. Retrieved on 2022-05-16.
- ↑ Yar'adua's Family of Greed- A Photo Essay Of A Humble Beginning And Then A Super Luxurious Life. Sahara Reporters (2009-06-22). Retrieved on 2022-05-16.
- ↑ Alleged Corruption: EFCC moves against Saraki's wife, Yar'Adua's daughter | Premium Times Nigeria (en-GB) (2015-07-22). Retrieved on 2022-05-16.