Zainab Ibrahim Kuchi

Onye Ndoro Ndoro Ochichi Ala Naijiria
Zainab Ibrahim Kuchi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1958 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of State for Niger Delta Affairs Dezie

A họpụtara Hajiya Zainab Ibrahim Kuchi A họpụtara Hajiya Zainab Ibrahim Kuchi dịka onye ozi ala na-ahụ maka ọkụ na onye ozi ala n'ihe gbasara steeti Niger Delta site n'aka onye isiala Naijiria gara aga Goodluck Jonathan. A họpụtara ya na-ọnwa July n'afo 2011. Ọ bụkwa onye ọchụnta ego bụ onye choputara ma bụrụkwa onye isi nke otu Daralkuchi.

Ọrụ dezie

Zainab bụkwa onye ọka iwu na onye ọchụnta ego nwere ahụmihe afọ iri atọ na ise maka iwu na njikwa. Ọ malitere n’afọ 1981, ebe ọ rụrụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ ikpe na Niger steeti. Mgbe NYSC ya gachara, e jigidere ya n'ọrụ na Mịnịstrị nke Ikpe ziri ezi nke Minna o jere ozi ebe ahụ ihe dị ka afọ asatọ na ọkara. Zainab rụrụ ọrụ na Central Bank of Nigeria site na-onwa Mee afọ 1989 ruo onwa Disemba afọ 2004 mgbe ọ lara ezumike nká ịmalite ụlọ ọrụ nke ya na-ahụ maka ndụmọdụ gbasara iwu. Ya onwe ya bụ onye nchọpụta na onye isi ụlọ ọrụ nke otu Daralkuchi. [1]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dezie

Onyeisiala gara-aga bụ Jonathan họpụtara ya dịka minista na kabịnet ya ịnọchite Niger steeti. A họpụtakwara ya dịka minista steeti maka ọkụ. Na ọnwa Nọvemba afo 2011, ọ kwupụtara mbinye aka nke nkwekọrịta ya na ụlọ ọrụ Sinohydro . Ụlọ ọrụ ndị China nwere bụ nke ha ga-arụ ebe ana-enye ọkụ site mmiri dị megawatt puku atọ na iri na ise na ebe akpọrọ Mambilla plateau dị na Taraba steeti . N'ọnwa Ọktoba 30, n'afor puku abụọ n'iri na abụọ, mgbe ọgbakọ ndị isi gọọmentị Federal Executive (FEC) gachara, Onye isiala bụ Jonathan tụziri ka ka ọ gbanwee ọrụ ya na onye minista steeti n'ahụ maka Niger Delta gara aga bụ, Dairus Ishaku . Onye isi ala Jonathan kwuru na obere nchigharị kabịnet o mere bụ iji mee ka ngalaba dị iche iche nwee ike mezuo atụmanya nke ndị Naijiria

Na ọnwa Septemba 11, n'afo puku abụọ na iri na atọ, a chụrụ Zainab dị ka mịnịsta na-ahụ maka mịnịstrị okụ n'oge nzukọ FEC ya na ndị minista asatọ ndị ọzọ.   [2] [3] [4]

N’afọ puku abụọ na iri n'anọ, a họpụtara ya dịka onye nhazi mkpọsa ọkwa onyeisiala nke Goodluck Jonathan na Niger steeti. [5] [6] [7]

Ntụgharị dezie

  1. DARALKUCHI ECO FARMS AND FOOD LIMITED Nigeria company profile - address, contacts, owners. ng-check.com. Retrieved on 2020-11-19.
  2. Jonathan shocks FEC, sacks 9 ministers (en-US). Vanguard News (2013-09-11). Retrieved on 2020-11-19.
  3. Jonathan Sacks 9 Ministers (en-US). P.M. News (2013-09-11). Retrieved on 2020-11-19.
  4. "Nigeria's President Goodluck Jonathan sacks ministers", BBC News, 2014-02-12. Retrieved on 2020-11-19. (in en-GB)
  5. Zainab Ibrahim Kuchi (en). www.africa-confidential.com. Retrieved on 2020-11-19.
  6. Vanguard (31 October 2012). Nigeria: Jonathan Swaps Two Ministers. allAfrica. Retrieved on 19 November 2020.
  7. Power generation to hit 10,000mw in Dec., says govt (en-US). Latest Nigeria News, Nigerian Newspapers, Politics (2013-01-10). Retrieved on 2020-11-19.