Uche Nduka

Odee Abụ Onye Naijiria - Amerika
Uche Nduka
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Ọktoba 1963 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụodee egwu, odee uri Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie
Ebe obibiNew York City Dezie

Uche Ndụka (amụrụ ya na 14 Ọktoba1963) bụ onye Naịjirịa na onye Amerịka na-ede abụ, onye na-ede egwu, onye nkuzi na onye na-ede akwụkwọ. E nyere ya awọdụ maka nke ndị Abụ na Association of Nigerian Authors na 1997 [1] . O bi na New York City ugbu a .

Ndụ dezie

Amụrụ Uche Ndụka na Naịjirịa na ezinaụlọ ndị otu Kristi. Aha ọmụmụ ya bụ Williams Uche Nduka, "O gosipụtara njimara Afrịka site na aha ya. O mere nkea mgbe Dr. Juliet Okonkwo dere otu akwụkwọ dị ogologo na-akuzi maka "ọdịbendị agbụrụ nke Afrika" [2] Ọ bụ onye azụlitere n'asụsụ abụọ, ha bụ Igbo na Bekee, ọ nwetara BA ya na Mahadum Nigeria, Nsukka na MFA ya na Mahadum Long Island, Brooklyn .

Ọ hapụrụ Nigeria na 1994 were biri na Germany mgbe ọ nwetasiri ihe ndị otu agụm akwụkwọ na Goethe Institute . O biri na Germany na Netherlands afọ iri sochirinụ tupu ọ were kwaga United Steeti na 2007.

Ọrụ Nduka bụ ihe ama ama maka ike ya na ngwa ngwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Dịka Joyelle McSweeney siri kwue: " Na akwụkwọ m na-agụ, ọrụ Nduka niile bụ nrọ n'ihi nke a ọ bụ akụkọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ụdịrị ya anaghị ekwu ihe nwere ike ime maobụ kwute maka ya, kama ha ga na-agba eziokwu okirikiri. Ihe a na-ahụ anya n'ọrụ Ndụka bụ ka o si enwe nnukwu mmetụta naanị sọọsọ na ọ bụ onye Naịjirịa na ọgụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mana ọ bụ maka na ọ bụ onye si ala nna ya were gaa mba ọzọ were na-ebi ka ohu n'ala ahụ". Ndụka n'aka nke ọzọ kwuru: "Na njete aka, A bụ m onye na-eme ihe sọrọ m na-eleghi mmadụ anya, mata ma ha, a na-ebugo iwu asụsụ bekee elu maọbụ nke ndị na-asụ ya nke ọma; nke ọdịnala maọbụ nke ogbara ọhụrụ.A na m eji ụdịrị nka asụsụ ọbuụa sọrọ m, dika ọnọdụ m siri dị oge ahụ, na kwa isiokwu ọbụla m nwere mmasị na ya. Na ọmụmụ asụsụ, enwere ebe ndị di iche iche a na-emetụbeghị aka na Abụ. A na m anwa oke m ịchọpụta ihe ndi ahụ. A chọghị m ịche na ndị mmadụ na-atụ anya ka m were ihe ịhere were na-ede bekee". Ndụka bi na Brooklyn kịta. O so na otu Kristiania, nchịkọta ndị odee edemede nke Brooklyn.


[3][4]

Ọrụ dezie

Ndụka edeela ọtụtụ akwụkwọ na Abụ na ịdụazị nke gụnyere Nine East (2013), Ijele (2012), na eel on reef (2007), e bipụtara ha niile mgbe o rutere United Steeti. Nchịkọta akwụkwọ ya mbụ gụnyere Heart's Field (2005); If only the Night (2002); Chiaroscuro (1997), nke a turu ugo mmeri na Association of Nigerian Authors nke Abụ ya; The Bremen Poems (1995); Second Acts (1994); na Flower Child (1988). Belltime Letters (2000) bụ mkpokọta Ịdụazị [5] .

Akwụkwọ Ya dezie

Nchịkọta Abụ dezie

  • Flower Child (Update Communications, 1988)
  • Second Act (1994)
  • The Bremen Poems (New Leaf Press, 1995)
  • Chiaroscuro (Yeti Press, 1997)
  • Belltime Letters (New Leaf Press, 2000)
  • Heart's Field (Yeti Press, 2005)
  • eel on reef (Akashic Books, 2007)
  • Tracers (Wheelhouse Press, 2010) * [1]
  • Ijele (Overpass Books, 2012)
  • Nine East (SPM Publications, 2013)
  • Facing You (City Lights Publishers, 2020)

Nchịkọta Abụ edegharịrị dezie

  • Poets in Their Youth (Lagos: Osiris, 1988)
  • Und Auf den Strassen Eine Pest (Bad Unkel: Horleman Verlag, 1996)

Nsidee dezie

  1. UCHE NDUKA: I don’t play to the gallery (en-US) (2016-08-01).
  2. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  3. "The Flame in the Grate", 2014-12-16.
  4. "intransigence is my calling card": Interview with Uche Nduka (2013-09-24). Archived from the original on 2021-04-15. Retrieved on 2020-11-17.
  5. Intern (2014-11-13). The Flame in the Grate (en).

Ihe ndị ọzọ na mpụga dezie