Tunji Awojobi
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 30 Julaị 1973 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọkpụkpọ basketball, boxer |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | ike n'ihu |
ebe agụmakwụkwọ | Boston University, Trinity High School |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1997 |
Oge ọrụ ya (njedebe) | 2008 |
onye nsonye òtù egwuregwu | KK Cibona, Boston University Terriers men's basketball, BC Avtodor Saratov |
ụdị egwuregwu | Basketball |
otu egwuregwu | NCAA Division I men's basketball |
Tunji Femi Awojobi (amuru n'ọnwa Julaị n'abalị 30, n'afọ 1973) bu onye ọkachamara onye ọkpụkpọ bọọlụ nkatanke Naijiria lara ezumike nka. Awojobi bụbu onye ọkpọ ọkpọ, gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Boston n'afọ 1997. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ gbara bọọlu n'ọtụtụ mba Europe, karịsịa na Israel. Awojobi bụkwa onye otu Otu Mba Naijiria, wee sonye na Asompi Mba Uwa n'afọ 1998 na 2006 nke FIBA . Ihe kacha mma o nwetara na bọọlu nkata nke Europe bụ imeri iko ULEB dị ka ebe mmalite etiti maka Hapoel Jerusalem si Israel. N'asọmpi ikpeazụ, Jerusalem meriri Real Madrid 83:72.
Ọrụ Kọleji
dezieAwojobi gbara bọọlụ nkata kọleji na Mahadum Boston (BU) afọ anọ (1993–1997). Ọ bụ onye ọkpụkpọ mbụ na kọleji New England dekọtara isi 2,000 na nloghachi 1,000. Awojobi rubiri ọrụ ya pụta kwa dị ka otu n'ime ndị ọkpụkpọ Nkewa Mbu di ise e debanyere aha ọrụ ha nwere isi 2,000, nloghachi 1,000, na ngbochi 300. O sonyeere otu ahọpụtara nke mejupụtara Alonzo Mourning ( Georgetown ), Pervis Ellison ( Louisville ), Derrick Coleman ( Syracuse ), na David Robinson ( Ndị agha mmiri ). Awojobi guzobere ndekọ BU iri na atọ, nke gụnyere isi (2,308), nlọghachi (1,237), ngbochi (302), na goolu fiiludi (871). Ngụkọta nloghachi na isi ya sokwa n'usoro kachasị mma na akụkọ ihe mere eme nke America East. N'afọ 1996–97, Awojobi duuru BU gaa ndekọ ụlọ akwụkwọ ma nwee mmeri iri abụo na ise yana aha asọmpi oge niile nke America East, na asọmpi NCAA. N'ịkwado mbọ ya, Awojobi bụ MVP ugboro anọ na otu ya ma nọrọ kwa na nhọrọ nke mbu na ọgbakọ niile. N'ime afọ agadi ya, akpọrọ ya onye ọkpụkpọ nke afọ yana MVP nke asọmpi ọgbakọ, ma tinye kwa ọkpụkpọ nke afọ Nkewa Mbu nke New England na nsọpụrụ nke otu mbụ All-ECAC. A kpọbatara ya na Nnukwu Ọnụ Ụlọ Ndị Àmà Ama nke BU n'afọ 2002.