Tonto Dikeh

Onye na-eme ihe nkiri Naijiria.
Tonto Dikeh
Mmádu
Ụlọ ọrụ mmepụta iheụlọ ọrụ ihe nkiri, Ihe nkiri nke Naịjirịa, ụlọ ọrụ ntụrụndụ Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya6 Jụn 1985 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Rivers Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, onye na-abụ abụ Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Sayensị Ọchịchị nke Rivers State Dezie
ogo mmụtabachelor's degree Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2006 Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
ụdịR&B dị ugbu a Dezie
webụsaịtịhttps://www.tontodikehent.com Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Tonto Wigo Charity Dikeh-Churchill (amụrụ ya n'ọnwa isii n'afọ 1985), onye amaara ka Tonto Dikeh, bụ onye egwuregwu nke onyo-onyoo, ogu egwu na Filantrọpist nke mba Naijiria. Dikeh bụ onye Ikwere na Steeti Rivas.

Ihe Onyo-onyoo n'igwe onyo-onyoo dezie

ọ bụ otu onye ndi mere egwuregwu onyo-onyoo nke akpọrọ 'Dirty Secret' nke butere nghọtaghie n'etiti ndi obodo Naijiria maka n'obu ihe ndi n'ekwesighi umuaka ile. ọ bụ ezie n'ụfọdụ mmadụ marayaikpe n'obighi ndụ kwesirii ekwesi dika ndi obodo anyi mana ndi ọzọ si  ọ na- abụ nnọọ onye ọkachamara.

ọrụ agụmegwu ya dezie

Mgbe O nwetachara obi aṅụri site n'ọtụtụ egwuregwu onyo-onyoo, Dikeh ekpebie igụwa egwu n'agbanyeghi n'o so n'otu egwu ndi Amaco Investments ebe ya na Patience Ozokwor gwuru egwu onyo-onyoo n'ekwughi okwu.Mpụta mbụ ya bụ egwu ndi ọkpọrọ 'Hi' na 'Itz Ova' nke Snypa so na ya. Na-agbanyeghi na ndi mmadụ toro mgbali ya, ufodu ndi nkatọ kwuru n'olu ya adighi mma. Ndi mmadu nwere obi-abụọ makwa na-aju onwe ha ma mkpebi ya igu egwu bụ nke kacha mma. N'abali iri-atọ n'ọnwa isii na-afọ 2014, otu onye ama-ama n'egwu nke a na-akpọ D'banj, kpughere Dikeh na Labelụ ya nke okporo DB Records' LEE family. N' ọnwa atọ na-afọ 2015, ọmara ọkwa ọpụpụ ya na DB records

Ndụ ya dezie

A mụrụ Dikeh n'ezi n'ụlọ mmadụ asaa. Nne ya nwụrụ mgbe ọdi afọ atọ. Dikeh bụ nwa nke atọ n'ụmụ ise na ụmụ abụọ nke nwunye nna ya mụrụ. Dikeh guru Petrochemical Engineering na Rivers State University of Science and Technology. N'ọnwa asatọ n'afọ 2015, Tonto na Oladunni Churchill mere omenala alụmdi na nwunye. N'ọnwa abụọ na-afọ 2016, ọ mụrụ nwa mbụ ya, (Andre Omodayo Churchill). N'abali iri abụọ na abụọ n'ọnwa  isii na-afọ 2016, Tonto Dikeh mere ememe maka nde(1 milion) mmadụ n'eso ya na Instagram.

N'ubọchi ndi Inyom di na mba ụwa nke akpọrọ (International Women's Day) na-afọ 2017, Tonto kwupụtara n'onyo-onyoo na ya bụ otu ndi di ha na-eti ihe (victim of domestic violence) tinyekwara na di ya (Oladunni Churchill) bunyere ya ọria  STDs n'alụmdi ha. Tupu nkea, akụkọ n'efeghari na ya na di ya ebighi n'udo maka akwamiko di ya na nwata nwanyi ọ na-akụziri(mentee) nke aha ya bụ Rosaline Meurer. N'ihu Instagram ya, Dikeh boro di ya Churchill ebubo na-ogburu nwa ya nọ na-afọ site n'itiya ihe nakwa ighọri ndi mmadụ n'igwe internet nke ndi mmadụmaara ka 'yahoo boy'.

Egwu ndi ọguru naani ya dezie

Title Year Refs
"Hi" 2012
"Itz Ova"
"Crazically Fit" (featuring Terry G)
"Jeje" 2013
"Sheba" (featuring Solidstar)
"Ekebe" 2014
"Sugar Rush" (featuring D'banj) 2015

Filmografi dezie

Leekwa dezie

  • List of people from Port Harcourt

Nrụtụaka dezie

Njikọ Mpụga  dezie