Taiwo Abioye

Onye agụmakwụkwọ Naijiria
Taiwo Abioye
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya17 Jenụwarị 1958 Dezie
Ebe ọmụmụKaduna Steeti Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello Dezie

Taiwo Olubunmi Abioye bụ prọfesọ Asụsụ Bekee nke Naijiria na ọkachamara na Stylistics na applied linguistics. Ọ bụ nwanyị mbụ ịbụ osote onye isi ọchịchị na Mahadum Covenant University.

[1].

Mmalite ndu na mmuta dezie

Amụrụ ya na Jenụwarị 17, 1958 na Kaduna. Nne na nna ya si steeti Ogun, Abioye nwetara nzere mbụ ya na Language Arts site na Mahadum Ahmadu Bello. Ọ gụsịrị akwụkwọ na ngalaba nke abụọ dị elu na 1987. Ọ nwetara nzere mastas na PhD site na otu Mahadum ahụ n'afọ 1992 na 2004.[2] Na 1982, Abioye onye akwukwo kachasị mma na ngalaba mmuta English.[3]

Ọrụ dezie

Abioye bidoro ọrụ nkuzi ya dịka onye enyemaka gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Ahmadu Bello na 1988, n'ime afọ iri na-abịanụ ọ gbagoro n'ọkwa wee bụrụ onye nkuzi na ABU. Na 2005, ọ banyere na Mahadum Covenant wee bụrụ onye osote prọfesọ na 2010, mana kita, ọ bụ prọfesọ zuru ezu. N’ọnwa Eprel afọ 2016, ọ dụrụ ndị otu na-achị ụmụ akwụkwọ ọdụ ka ha kwekọọ n’atụmatụ ọrụ ha. Na 2011, o bipụtara akwụkwọ nke Language and Ideology in George Ehusani's Writings, George Ehusani na ndị nyocha onwe ha nabatara akwụkwọ ahụ nke ọma. Ọ bụbu onye DVC (maka ọrụ nchịkwa) maka afọ abụọ, tupu ọ bụrụ osote onye isi ọchịchị ụlọ akwụkwọ na 2014.

Google Scholar index tinyere na-ọkwa nke mbụ edemede isiokwu e depụtara na 2009 nke akpọrọ 'Typology of rhetorical questions as a stylistic device in writing.' Nchọpụta a lebara anya etu ndị Naịjirịa siri were asụsụ dị iche na asụsụ nne ha, tụmadụ etu ndị asụsụ ọzọ si asụ asụsụ ndị a, na etu usoro a siri metụta onye na-asụ ya. N'elu nke ahụ, ọmụmụ ihe ahụ mere nyocha nke isiokwu nke rhetorical questions, ebe ọ na-atụle uru na ọghọm banyere ndị Naijiria. Akwụkwọ akụkọ ahụ dị na International Journal of Language Society and Culture.[4]

Ebe m si dee dezie

  1. Oyedepo urges FG to Increase funding to education (January 18, 2018). Archived from the original on 2018-01-30. Retrieved on 2020-11-16.
  2. admin (2017-11-22). Taiwo Abioye.
  3. admin. Prof Taiwo Olubunmi Abioye. Archived from the original on 2017-09-24. Retrieved on 2020-11-16.
  4. Taiwo Abioye (2017-11-23). Archived from the original on 2021-05-21. Retrieved on 2020-11-16.