Stéphane Legar

Onye Togo-Israel na abụ abụ, na-agba egwu nakwa onye na'eme ihe nlereanya
Stéphane Legar
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịTogo, Israel Dezie
aha n'asụsụ obodoStéphane Legar Dezie
Aha ọmụmụStéphane Gagba Dezie
Aha enyereStéphane Dezie
aha pseudonymStéphane Legar Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya13 Mee 1998 Dezie
Ebe ọmụmụBat Yam Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language, Hebrew, Ewe, African French Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2016 Dezie
agbụrụTogolese, African people, Ewe Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
ụdịegwu hip hop Dezie
akara ndekọWarner Music France, Unicell Dezie

  Stéphane Gagba (Hebrew: amụrụ na onwa Mee abali iri Na ato afo 1998), nke a maara nke ọma dị ka Stéphane Legar ( «), bụ onye mba Togo nwere akwụkwọ obibi Isreal na-agụ egwu, na-agba egwu, na onye nlereanya.[1][2] Aha ọgbọ ya bụ Legar ma ọ bụ Le Gar - na mkpirisi maka Le Garcon, "nwa nwoke" na asusu French. A na-akpọkarị ya aha ya bụ Stéphane.

Mmalite ndụ dezie

A mụrụ Stéphane Gagba na Bat Yam, Israel, nne na nna ya bụ Ndị Kraịst si Togo. Nne na nna ya bụ ndị nnọchi anya mba ọzọ na-arụ ọrụ na ụlọ ọrụ nnọchiteanya Naịjirịa na Israel n'oge ahụ. O nwere nwanne nwanyị tọrọ ya. Mgbe ọ bụ nwata, ọ nọrọ ọtụtụ oge ezumike ya na-eleta ndị ikwu ha na Togo.[3]

Mgbe ọ bụ nwata, a họpụtara ya maka ịchụpụ ya n'Izrel - n'ihi enweghị akwụkwọ nwa amaala - ebe ọ bụ naanị ọnọdụ obibi ka onwere Ọ bụ ezie na, ọ bụ nwa amaala Togo (paspọtụ Togo). Ruo mgbe ọ dị afọ iri, nne na nna ya chebere ya pụọ na mmata a. N'ikpeazụ, ọ nwetakwara nwa amaala Israel - mana ọ bụ naanị mgbe ọ gụsịrị ọrụ agha Israel, na abali ato nke onwa Mee 2021.[1][2]

Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, Legar na ezinụlọ ya kwagara Holon, Israel. Ọ gara ụlọ akwụkwọ obodo ndị ntorobịa Mikveh Israel, na mpaghara French ya. O debara aha ya n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2017 na Ndị agha nchekwa mba Israel, ma jee ozi na ngalaba na-ahụ maka ịkọwa usoro ntinye akwụkwọ na ụmụ akwụkwọ sekọndrị.[4]

Ndụ nke onwe onye dezie

Asụsụ ala ya bụ French, mana ọ na-asụkwa asụsụ Hibru, Ewe (Togolese), Bekee, na Spanish nke ọma.[5]

Njem egwu ike dezie

  • 2020: "Rak Banot" ll (ft. Itay Levi)
  • 2022: "SPEED LIFE" [citation needed]

Ihe nrite na nhọpụta dezie

Afọ Ihe nrite Category Ọrụ a họpụtara Nsonaazụ
2017 MTV Europe Music Awards[6][7] Iwu kacha mma nke Israel Ya onwe ya Ahọpụtara
2018 Ahọpụtara

Edemsibia dezie

  1. 1.0 1.1 סטפ אפ (31 May 2021).
  2. 2.0 2.1 סטפן לגר: "כשאני הולך ברחוב אני לא אומר 'אני שחור', אבל הסביבה מזכירה לי את זה" (4 June 2021).
  3. From Togo to Tel Aviv: Israel's Latest Christian Pop Sensation (13 March 2018).
  4. Vigevani (2018-03-13). From Togo To Tel Aviv: Israel's Latest Christian Pop Sensation (en-US). Breaking Israel News | Latest News. Biblical Perspective.. Retrieved on 2019-03-24.
  5. https://embassies.gov.il/eu/NewsAndEvents/Newsletter/Pages/The-new-Israeli-Mega-hit-%C2%AB-Comme-ci--Comme-%C3%A7a-%C2%BB.aspx
  6. Nigeria: Wizkid, Davido, Others Nominated for 2017 MTV Europe Music Awards. AllAfrica.com (October 5, 2017). Retrieved on February 26, 2019.
  7. Stephane Legar. MTV. Archived from the original on February 27, 2019. Retrieved on February 26, 2019.