Shina Peller
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Shina |
aha ezinụlọ ya | Peller |
ụbọchị ọmụmụ ya | 14 Mee 1974 |
Ebe ọmụmụ | Iseyin |
Dị/nwunye | Ayọ̀bọ́lá |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Asụsụ Yoruba |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | onye otu ulo nnochite anya Naijiria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria |
ebe agụmakwụkwọ | Ladoke Akintola University of Technology |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | All Progressives Congress |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
Shina Abiola Peller (a mụrụ ya na mkpụrụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Mee n'afọ 1976) bụ onye ọchụnta ego Naijiria, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye na-emepụta ihe, na onye otu nke itenanị nke National Assembly. Ọ bụ onye isi oche na onye nduzi nke Aquila Group of Companies na Club Quilox.[1] Shina Peller chịrị echichi nke Ayedero nke ala Yoruba na Akinrogun nke Ala Epe, Lagos Nigeria.[2]
Ihe ndị mere n'oge gara aga
dezieShina Abiola Peller bụ nwa Alhaja Silifat na Prọfesọ Moshood Abiela Peler.[3] Ọ tolitere n'ụlọ ndị Alakụba. Ọ malitere na Iseyin, Oyo State na South-Western Naịjiria. Ọ gụrụ injinia kemịkal na Ladoke Akintola University nke Teknuzu, Ogbomosho, Nigeria, ebe ọ nwetara akara ugo mmụta mbụ ya n'afọ 2002.[4] N'ikpeazụ, ọ nwetara nzere masta na Business Management site na Ladoke Akintola University of Technology n'afo 2013. Ọ rụrụ ọrụ na Abia State n'afo 2003 iji mezuo ọrụ otu afọ nke National Youth Service Corps (NYSC) ana-eme maka ndị niile gụsịrị akwụkwọ na Naijiria.[5]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
deziePeller bụ onye otu All Progressive Congress (APC), ma kwupụta ebumnuche ya ịsọ mpi n'okpuru ikpo okwu nke All progressives Congress dị ka onye nnọchi anya ụlọ maka mpaghara Iseyin / Itesiwaju / Iwajowa / Kajola Federal Constituency na Oyo Steeti.[6][7][8][9]
N'ụbọchị nke ise n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2018, Shina Peller meriri na ntuli aka nke onye nnọchi anya ụlọ maka mpaghara lseyin /ltesiwaju / Kajola /lwajowa Federal na ikpo okwu nke All Progressive Congress (APC) maka ntuziaka 2019 Nigeria General wee merie oche ahụ. Ọ meriri oche maka House of Representatives na mpaghara ya na ụbọchị nke iri abụọ na atọ nke onwa Febụwarị n'afọ 2019 mana a tụfuru ya ka ọ laghachi dị ka onye omeiwu.[10][11] Ọnọ ugbu a maka Senate nke Naijiria n'okpuru nchebe nke Accord Party.[12]
Ebensidee
dezie- ↑ Shina Peller Biography https://www.naija.ng/1120204-shina-peller-biography.html#1120204
- ↑ 2023: We shall donate our hard earned money to support you, group tells Shina Peller (en-US). Vanguard News (2021-12-29). Retrieved on 2022-02-22.
- ↑ Ayedero Shina Peller: The ‘King of night life’ now ‘King of hearts’ (en-GB). Tribune Online (2021-08-27). Retrieved on 2022-03-18.
- ↑ Shina Peller: 10 things you didn't know about Quilox boss (25 August 2015). Archived from the original on 16 September 2018. Retrieved on 28 May 2023.
- ↑ Henry. Who is Shina Peller? All you need to know about the son of a magician. Daily Advent. Retrieved on 26 January 2019.
- ↑ Why I want to serve my people – Shina Peller. Archived from the original on 2018-09-12. Retrieved on 2023-05-28.
- ↑ Olowookere. Shina Peller Flags off Campaign for House of Reps Seat.
- ↑ Alaafin endorses Shina Peller for House of Reps (25 August 2018).
- ↑ Abubakar (June 2018). Shina Peller declares intention to contest for house of reps in 2019.
- ↑ Nightclub Owner Shina Peller Wins APC House of Reps Ticket (5 October 2018).
- ↑ Okogba (24 February 2019). Shina Peller wins Iseyin Federal Constituency seat.
- ↑ Elijah (2022-07-05). Shina Peller secures Accord Party ticket for Oyo North senatorial district (en). Pulse Nigeria. Retrieved on 2022-07-14.