Sefi Atta

onye odee Naijiria na onye odee-egwu
Sefi Atta
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika, Naijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoSefi Atta Dezie
Aha ọmụmụSefi Atta Dezie
Aha enyereSefi Dezie
aha ezinụlọ yaAtta Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1964 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
ŃnàAbdul Aziz Atta Dezie
nwaTemi Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụode akwukwo ifo, odee ejije, chartered accountant, onye nhazi ederede Dezie
onye were ọrụNorthwestern University Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Birmingham, Antioch College, Millfield, Queen's College, Lagos Dezie
ogo mmụtaBachelor of Science Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2002 Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
Ọrụ ama amaEverything Good Will Come, The Bad Immigrant, A Bit of Difference, The Bead Collector Dezie
Ihe nriteNoma Award for Publishing in Africa, Ihe nrite Wole Soyinka maka edemede n'Africa, Caine Prize, Ihe nrite Wole Soyinka maka edemede n'Africa Dezie
ahọpụtara makaCaine Prize Dezie
webụsaịtịhttp://sefiatta.com Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie
SEFI ATTA
Afọ A mụrụ na Lagos na Jenuwarị n'afọ 1964
Obodo Niajiria na Amerika
Agụm akwụkwọ Queens' college Lagos

Millfield school

Mahadụm Birmingham

Ọrụ aka Odee akụkọ emeghị eme, akụkọ nkiri
Ọrụ eji mara ya 'Everything Good Will Come
Webụsite www.sefiatta.com

Sefi Atta onye nke amụrụ n'ọnwa mbụ (Jenụwarị) n'afọ 1964 bụ nwa afọ Naijiria bi n'America. Ọ nwere ihe nrite pụrụ iche site na-ide akwụkwọ, egwuregwu na egwuregwu ndi a na-ekiri n'onyonyo. [1] A tụgharịala ụfọdụ akwụkwọ ya n'ọtụtụ asụsụ di iche iche. Akwụkwọ ndi nke bụ egwurwegwu pụtara ihe bụ nke ndi BBC na-egosipụta n'igwe redio, egwuregwu ndi nke a na-eme na nkwago egwuruegwu bụ nke gara mba ụwa niile. Ihe nrite o nwetagoro gụnyere ihe nrite nke odee n'Afịrịka nke si n'aka Wole Soyinka n'afọ 2006 nakwa nke a na-akpọ Noma Award maka mbiputa akwụkwọ n'Afịrịka n'afọ 2009. . [2] [3]

Akụkọ ndụ dezie

A mụrụ Sefi Atta mụrụ na Lagos, Nigeria, n'ọnwa Jenụwarị n'afọ 1964, Ha dị ise n' ezinaụlọ a. Nna ya Abdul-Aziz Atta bụ odeakwụkwọ nke gọọmentị Naijiria bụrụkwa Onye Isi ndi ọrụ oyibo wee ganye n'ọnwa ya n'afọ 1972, nne ya bụ Iyabo Atta zụrụ ya.

Ọ gara Queen's College, Lagos na Millfield School nke England. N’afọ 1985, ọ nwetara nzere mmụta BA na Mahadum Birmingham . O tozuru etozu dika onye na -ahụ maka ego obodo n'obodo England nakwa mba United States, ebe o kwagara n'afọ 1994. [4] O nwetara nturu ugo mke MFA site na Mahadum Antioch n'afọ 2001.

Ọ lụrụ Gboyega Ransome-Kuti, onye dibia oyibo , ọ bụ nwa Olikoye Ransome-Kuti, ha mụrụ otu nwa nwanyị, aha ya bụ Temi. [4]

Ụlọ ọrụ ya di na-Lagos bụ nke na-enye nkwado n'ụmụ mwaanyị chọrọ imụta ka esi agụ agụmagụ bụ nke o guzobere iji nweta ego o ji enyere ndi chọrọ imuta ka esi agụ agụmagụ.

Ọ na - eke oge ya n’agbata Naịjirịa, England na United States.

Ederede ya dezie

Atta gụrụ akwụkwọ na Mahadum Antiọk dị na Los Angeles ebe a na-akụzi ka esi eji nka ede ederede nke ọma. Mkpirisi akụkọ ụfọdụ o dere pụta ihe n'akwụkwọ Jonal ha bụ 'The Los Angeles Review, Mississippi Review nakwa World Literature Today. Ederede ya apụtala n'akwụkwọ mbipụta dika Time and Libération A tụgharịala akwụkwọ ya n'ọtụtụ asụsụ di iche iche. Akwụkwọ agụmagụ izizi ya a kpọrọ Everything Good Will Come, nwetara ihe oyinye nke Wole Soyinka Prize for Literature in Africa.

Akwụkwọ agụmagụ ya

Nchikota nkenke akụkọ

Akwụkwọ ụmụaka

Nchịkọta egwuregwu

Egwuregwu emere na nkwago

  • The Engagement, MUSON Centre, Lagos n'afọ 2005
  • The Cost of Living, Lagos Heritage Festival n'afọ 2011:
    • Hagel auf Zamfara, Theatre Krefeld, na Germany n'afọ 2011
    • The Naming Ceremony, New World Nigeria, Theatre Royal Stratford East, London n'afọ 2012
    • An Ordinary Legacy, The MUSON Festival, MUSON Centre, Lagos n'afọ 2012
    • Last Stand, Terra Kulture, Lagos n'afọ 2014
    • Renovation, The Jos Festival of Theatre n'afọ 2018
    • The Death Road, The Jos Festival of Theatre n'afọ 2019

Egwuregwu ekwupụtara na Redio

  • The Engagement na BBC Redio n'afọ 2002
  • Makinwa's Miracle, na BBC Redio n'afọ 2004
  • A Free Day, BBC Radio n'afọ 2007

Egwuregwu nke onyonyo

    • Leaving on Your Mind, quarter-finalist for the American Zoetrope Screenplay Competition n'afọ 2009
    • Valid, finalist for the WeScreenPlay Diverse Voices Lab n'afọ 2019
    • Valid, finalist for the American Zoetrope Screenplay Competition n'afọ 2020

Ihe onyinye na njirimara dezie

  • Macmillan Writers Prize For Africa, n'afọ 2002
  • Onye nke abụọ na BBC African Performance, n'afọ 2002
  • Onye nke atọ na Zoetrope Short Fiction Contest, n'afọ 2002
  • Onye nke izizi na Red Hen Press Short Story Award, nafọ 2003
  • Glimmer Train 's very short Fiction Award, n'afọ 2003
  • Onye nke abụọ na BBC African Performance, n'afọ 2004

Onye edemede nleta


Atta sọ na ndị kara ikpe maka Neustadt International Prize for Literature,[5] n'afọ 2010 ma bia bụrụ nnukwu ọka ikpe n'afọ 2019 maka Caine Prize for African Writing. .

Nnyocha dị omimi banyere ọrụ ya, Writing Contemporary Nigeria: Ka Sefi Atta si kọpụta omenaala na ọdịnaala bụ nke Prọfesọ Walter P. Collins, III haziri ka ndị Cambria Press ebipụtara n'afọ 2015. .

Nsinweta dezie

  1. Sefi Atta – Short bio – Q&A (panellist) – Australian Broadcasting Corporation, 27 August 2012. Retrieved 2 September 2012.
  2. "Sefi Atta", Myriad Editions.
  3. Janine, "New: Acclaimed NOMA Award Winner Sefi Atta’s Latest Novel, A Bit of Difference", Times Books LIVE, 22 August 2014.
  4. 4.0 4.1 "Atta, Sefi 1964–", Encyclopedia.com.
  5. Jury & candidates for 2010 Neustadt Prize, announced March 2009.