Ruff 'n' Tumble (clothing)
Ruff 'n' Tumble bụ akara ejiji Naijiria nke na-ahụ maka uwe ụmụaka[1][2][3][4]
Akụkọ ihe mere eme
dezieE guzobere Ruff 'n' Tumble n'afọ 1996 mgbe Adenike Ogunlesi chọrọ pyjama maka ụmụ ya.[2][5][6] Ebe ọ bụ na ọ na-eme uwe maka ụmụ nwanyị, o kpebiri ime uwe site n'enyemaka nke nne ya, onye na-emepụta ejiji.[7][2] Na mbụ, o jiri ihe ndị dị n'ógbè ahụ gụnyere Ankara na Adire.[6] Mmepụta malitere ma mesịa gbasaa ọrụ na ezinụlọ ndị ọzọ Naijiria nwere ụmụaka. Mmepụta uwe (maka ụmụaka site na afọ efu ruo afọ iri na isii), jiri nwayọọ nwayọọ na-aga n'ihu site n'ụlọ ya (na-ere site na buutu nke ụgbọ ala ya) gaa n'ebe dị na Victoria Island, Lagos Steeti.[2][7] Ruff 'n' Tumble na-arụ ọrụ ụlọ nkwakọba ihe, ụlọ ọrụ mmepụta ihe, nkesa ma nwee ihe karịrị ndị ọrụ iri ise.[8][2] Ọ gbatịkwara alaka ya na Surulere na Lagos, na Ikeja, yana, obodo ndị ọzọ dị na Naijiria, gụnyere, Ibadan, Kano na Port Harcourt.[9][1][10] Ụlọ ọrụ ahụ nwere ihe dị ka alaka ụlọ ọrụ iri na ise gafee mba ahụ.[8] Ruff 'n' Tumble nwekwara akara "Trendsetters" na "NaijaBoysz" - uwe maka ụmụ okorobịa dị afọ asatọ ruo afọ iri na isii. [2][9][10][11] Ruff 'n' Tumble jikọtara aka na Nigerian Employers Consultative Association (NECA) na Industrial Training Fund (ITF) iji nyere aka belata enweghị ọrụ na mba ahụ.[12]
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 Kemi Ajumobi. "Adenike Ogunlesi, leading contemporary kids clothing brand in Nigeria", Businessday. Retrieved on December 24, 2014.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 building an African clothing empire Adenike Ogunlesi. Ventures Africa. Archived from the original on July 1, 2014. Retrieved on August 29, 2014.
- ↑ "Ruff 'n' Tumble introduces promo for kids", Punch. Retrieved on December 24, 2014.
- ↑ Don Tudoran (2005). Democracy at Large: Listen to Africa.
- ↑ "Government does not support the garment industry-Adenike Ogunlesi", The Punch. Retrieved on December 25, 2014.
- ↑ 6.0 6.1 "How we started Ruff 'n' Tumble by Mrs Ogunlesi", Daily Independent, February 1, 2013. Retrieved on November 28, 2014.
- ↑ 7.0 7.1 Adenike Ogunlesi – Ruff N Tumble. Financial Freedom Inspiration. Archived from the original on November 22, 2014. Retrieved on December 24, 2014.
- ↑ 8.0 8.1 Adenike Ogunlesi. Summit Speakers. Archived from the original on December 26, 2014. Retrieved on November 28, 2014.
- ↑ 9.0 9.1 "Adenike Ogunlesi: Ruff 'n' Tumble", Houston Forward Times. Retrieved on December 24, 2014.
- ↑ 10.0 10.1 "Advertisement Ruff 'n' Tumble introduces new brand "NaijaBoysZ" and opens new stores in Port Harcourt & Lagos", BellaNaija. Retrieved on December 24, 2014.
- ↑ Adenike Ogunlesi. Open Africa. Archived from the original on 2014-12-26.
- ↑ News Agency of Nigeria. "40 million Nigerians still unemployed", Nigerian Guardian, December 3, 2014. Retrieved on December 25, 2014.