Onyeka Nwelue

Onye na- ede akwụkwọ akuko burukwa Onye na- eme ihe onyonyo ejije
Onyeka Nwelue
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya31 Jenụwarị 1988 Dezie
Ebe ọmụmụEzeoke Nsu Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie

Onyeka Nwelue onye amụrụ na abalị iri-atọ na otu n’ọnwa mbụ n'afọ 1988, bụ onye na-eme ihe nkiri na onye edemede nke Naijiria, onye akwụkwọ ya bụ Hip-Hop bu nani maka umuaka,ma turu ugo dịka ode akụkọ mere eme na 2015 nke Nigerian Writers ’Awards. Ọ gbanwere akwụkwọ akụkọ ya, Island of Happiness dịka ihe nkiri n’asụsụ Igbo, dịka Agwaetiti Obiụtọ wee merie Best Feature Film site n’aka onye ntụzịaka na 2018 Newark International Film Festival [1], a gakwara n'ihu ịhọpụta ya maka Best First Feature film nke Onye ntuziaka ya na nrite Ousmane Sembene maka Ihe Nkiri Kachasị Mma n'Asụsụ Afrika na 2018 Africa Movie Academy Awards . Ihe nkiri Island of Happiness bụ mkpali mmụọ gbasara ezi ihe mere na Oguta .[2] . Ọ bụ ya guzobere La Cave Musik, aha ndekọ, nke dị na Paris .

Nwelue gụrụ Sociology & Anthropology na Mahadum nke Naịjirịa, Nsukka wee nweta onyinye ọzụzụ mmụta ịgụmaka ntuziaka na Prague Film School na Czech Republic .

Ugbu a ọ bụ osote prọfesọ na- eleta na Onye Nleta Ọmụma nke Africa literature na ọmụmụ ihe na Ngalaba Asụsụ Bekee nke Ngalaba nke humanities, Mahadum Manipur na Imphal, India . Ọ bụ onye nleta nyocha na Center for International Studies, Mahadum Ohio [3], ebe ọ gburu oge na Atens, Ohio.

A hopụtara akwụkwọ akụkọ ya nke abụọ, maka akara ANA Prose Fiction Prize na 2018 ya na nchịkọta abụ ya, The Lagos Cuban Jazz Club, bụ ndị edepụtara aha maka ANA Poetry Prize n'otu afọ ahụ [4] .

Mmalite Ndụ dezie

A mụrụ Onyeka Nwelue na Ezeoke Nsu na Ehime Mbano na Imo State, Naịjirịa nye Honorable Sam Nwelue, onye ndọrọndọrọ ọchịchị na Knight nke St. Christopher na Lady Catherine Nwelue, onye nkuzi na Lay Reader.

Ndụ onwe dezie

A mụrụ ya n'ime ezinụlọ nke nọ na ogo dị elu, ọ bụ nwa nke anọ n'ime ụmụ isii nne na nna ya. Nne ya, onye a zụlitere n'ezina ụlọ ndị ama ama n'ọchịchị nke Obua Ajukwu (Ndanike), nke Oguta, bụ nwa nwanne nna Flora Nwapa, nke a na-ahụkarì dịka nwanyị Africa mbụ dere akwụkwọ nke ebipụtara na mba ụwa.

Ndị nne na nna ya ochie bụ Origbudu SBC Obiora na Ogbuefi Odiso Obiora (née Nwakuche na nwanne nwanyị nke okenye bụ Maazị Gogo Nwakuche [5], di Nwapa nke abụọ .Nwanne mama ya nke nwanyị, Prọfesọ Leslye Obiora, bụbu oṅye minista Naịjirịa n'ihe gbasara steel na mines [6]

Nwelu gara Lagos mgbe ọ dị afọ iri na isii ịga Ememe Wole Soyinka [7], emesịa akowaara Noble laureate bụ Soyinka onye ọ bụ. Afọ ole na ole ka nke ahụ gasịrị, Nwelue gara India maka emume nke abụọ maka International Writers festival ’,site n'ọkpụkpọ òkù nke India Cultural Association. Nobel Laureate, Wole Soyinka ka bụ otu n'ime ndị onye nkwalite Nwelue dịka Nwelue kwuru,"Ọ gụọla ihe niile m bipụtara," . O haziela nyocha nkeonwe [8] [9] nke ihe nkiri ya maka Nobel Laureate.

A kowara ya dịka onye nkwado ụmụ nwanyị N'okwụ gbasara nkwuchite ọnụ ụmụ nwanyị. N'ajụjụ ọnụ, mgbe emechara The house of Nwapa, ọ sịrị: "Emere' The house of Nwapa', n'ihi na abụ m onye nkwuchite ọnụ Ụmụ nwanyị. Ekwenyere m na anyị niile hà nhata. " [10]

Ọrụ dezie

Na mbido ọrụ ya, Nwelue dere maka The Guardian na Naịjirịa, ohere ndapụta nke Jahman Anikulapo nyere ya [11], onye nchịkọta/nhazi akụkọ nke Sunday Edition nke a maara dịka The Guardian na Sọnde .

Nwelue na-anọchi anya onye na- ede akwụkwọ ọgụgụ, Priya Doraswamy nke Lotus Lane Literary Agency, nke dị na New Jersey [12] . N’afọ 2012, Debbie Edwards nke Debbie Edwards Talent Management, bụ onye njikwa ya. [13]

The Abyssinian Boy dezie

Nwelue bidoro ide edemede mbụ ya, The Abyssinian Boy mgbe ọ nọ n’India. Akwụkwọ ahụ kọwaturu ihe ọ hụrụ na India dị ka onye ojii, mbipụta ya gosipụtara Nwelue dịka onye ama ama na mba ụwa.

The Abyssinia Boy nwetara ntụle dị egwu na isi akwụkwọ akụkọ Naịjirịa na India dịka ("akụkọ Greek") [14] na Hindu ("the Indian ethos are original").

Burnt dezie

Akwụkwọ nke abụọ ya bụ akụkọ n'amaokwu [15] ma onye ọdee abụ Britain-Hungaria bụ George Szirtes kọwara ya dịka "breathless".Nwelue gazuru ala iri-abuo n’ise na Europe n’afo 2014, n’ịkwalite akwụkwọ a, asụgharịrị ya n’asusu Italia, Spanish, Igbo na Yoruba. Nsụgharị a bụ site n'aka onye edemede Venezuelan bụ Alberto Quero, e bipụtara ya na Peru, ebe ọ malitere ọrụ ya na Cusco Book Fair na 2015.

Hip-Họp bụ naanị maka ụmụaka dezie

Nwelue sooro ndị egwu na-arụ ọrụ n'okpuru La Cave Musik wee gaa mba dị iche iche iji zute ndị egwu dị iche iche ma wepụta akwụkwọ ḿgbaha kowara ọtụtụ ihe, nke na-akọwapụta nzụkọ ya onye na ndị egwu na ndị na-akwalite egwu. E wepụtara ya na Jenụwarị 2015 ka ọtụtụ kwadoro ya. E kwupụtara n'erelari otu nde. [16]

The House of Nwapa dezie

O weputara otu ihe omuma nke kowara ndụ Flora Nwapa, nwanyị Afrịka mbụ dere akwụkwọ n’olu bekee. [17] [18] A họpụtara ya dịka akwụkwọ ederede ihe ọmụma kachasi nke 2017 Africa Movie Academy Awards [19] .

Island of Happiness dezie

Na ngwụcha ọnwa Ọgọstụ, afọ 2017, Nwelue kwuputara site na edemede [20] na o kechiri ihe nkiri nke ọhụụ ya, "Island of Happiness, nke sitere na obere akụkọ n'ewepụtabeghi [21] [22] .

The Beginning of Everything Colourful dezie

Ka afọ asaa nke DADA Books bipụtara The Boy Abyssinian, Nwelue bipụtara akwụkwọ akụkọ ọhụụ bụ'The Beginning of Everything Colourful. .

Mmụta na nkuzi dezie

Mgbe ọ laghachiri India, Nwelue debara na Mahadum nke Naịjirịa, Nsukka, iji mụọ Sociology & Anthropology. Ọ gara n'ihu na-amụ Akwụkwọ maka edemede akụkọ na Asia School of Media Studies na Noida, India, mgbe nke a gasịrị, ọ kuziri Ntuziaka Ihe nkiri na Center for Research in Art of Film & TV (CRAFT). O lekọtara Sandwich Class nke English Language Department nke Mahadum Lagos dịka ọ na-arụ ọrụ dị ka onye nchịkọta akụkọ nke FilmAfrique, ihe mmalite nke ihe nkiri Afrika, nke Africa Film Academy bipụtara, ndị na-elekọta Africa Movie Academy Awards . E nyere ya ohere ịgụ akwụkwọ onye ntuziaka n'efu na Prague Film School na Czech Republic .

Ọrụ ya ka Emechara dezie

Kemgbe ọganihu nke akwụkwọ akụkọ ya ,Nwelue sonyere dee ihe nkiri Namaste Naija, nke Teco Benson duziri wee mee ya na Hyderabad na Lagos ma bụrụ nke Lilian Bach mepụtara . O sokwa chepụta echiche obere ihe nkiri, The Beginning of Everything Colourful ya na onye omee Britain na onye nlere anya ejiji Dudley O'Shaughnessy .

Na mbido afọ 2012, e debanyere Nwelue na Pontas Agency na Spain. [23]

Ọ tọrọ ntọala Blue & Hills Consultancy, nke ọ na-elekọta La Cave Musik. Site na Blue & Hills, egosipụtara ya na MTV Meets MTN ya na Ben Mụrray Bruce .Ndị ọrụ Nwelue haziri Bayelsa Book & Craft Fair nke mbụ na mbụ ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ntụzi. Ọ malitekwara idezi na ibipụta FilmAfrique, bụ ihe nkiri mbụ na sinima Afrika, nke ndị nyere Nkwado ego bụ Africa Film Academy, ndị na-ahụ maka nhazi ihe nkiri Africa Movie Academy (AMAA).

N’ọnwa Ọgọstụ afọ 2016, ihe nkiri Nwelue dere maka Flora Nwapa, nke akpọrọ The House of Nwapa, bidoro na Harare, Zimbabwe .

Ọgbaghara dezie

Kemgbe o biputere The Abyssinian Boy na 2009, Nwelue jiiri otutu oge ya kwuo okwu na mmemme, emume na ọgbakọ dị iche iche.

Ka a kpọchara ya na emume agụmagụ nke Man Hong Kong, a jụrụ ịnye Nwelue visa na Hong Kong, nke butere itimkpu ndị mgbasa ozi, ihe kpatara nke bụ ikpaoke ọdịdị anụahụ ya. Agbanwere mkpebi ahụ ma ọ nwetara visa ịga ememme ahụ. [24]

N’afọ 2017, ụmụ nwoke ndị agha mekpara Nwelue ahu n’ihi na ọ chọrọ igbochi ha idina onye ji ahụ ya achụnta ego n'ike [25] . Otu afọ mgbe nke a gasịrị, e jidere Nwelue n'ụlọ ezumike nke Onomo Hotel na Kigali wee tụọ ya mkpọrọ ụbọchị asatọ, maka ebubo 'na-okparịrị Onye isi ala Rwandan, Paul Kagame na Twita na RwandAir [26] . A tọhapụrụ ya site na ntinye ọnụ nke onye isi ala Naịjirịa, Olusegun Obasanjo . Tupu e jide ya, ọ bụ onye nkuzi afọ ofufo na Kwetu Film Instịtut, nke onye na-emepụtai ihe nkiri, Eric Kabera [27] hiwere.

Ihe Mberede dezie

N'ọnwa mbụ nke February 2018, ka oji otu ụbọchị gafee ụbọchị ncheta ọmụmụ ya nke afọ iri atọ ya [28], Onyeka nwere ihe mberede okporo ụzọ, nke o nwetara ọtụtụ mmerụ ahụ na mgbara azụ ya. Ọ nọ na oche ọlụsị ọnwa abụọ,tupu ojiri ihe eji enyere njem aka eme njem.

Hụ kwa dezie

  • List of Nigerian film producers

Nrụtụaka dezie

  1. Onyeka Nwelue's Agwaetiti Obiụtọ: Pushing for Africa's socioeconomic and political emancipation (16 October 2018).
  2. #LiterallyWhatsHot: What Defines Happiness in Onyeka Nwelue's "Island of Happiness?" (18 April 2018).
  3. What Young Africans Are Writing - an Africa Crossroads event.
  4. https://www.independent.ng/ana-releases-shortlist-of-2018-literary-prizes/
  5. As Violet Odiso 'SBC' Obiora Goes Home.
  6. Archive copy. Archived from the original on 2020-11-26. Retrieved on 2020-11-28.
  7. Is the next Nobel Laureate this 30 year old Nigerian maverick?.
  8. Photos | Wole Soyinka Hosts Private Screening of Onyeka Nwelue's AMAAs-Nominated Film, Agwaetiti Obiụtọ.
  9. Onyeka Nwelue: What Soyinka told me when I wanted to start making films.
  10. Why I made a documentary on Flora Nwapa.
  11. INTERVIEW: Why I'm Not married at 50 - Jahman Anikulapo - Premium Times Nigeria (24 August 2013).
  12. Fiction-Literary Fiction (30 April 2020). Archived from the original on 12 May 2021. Retrieved on 28 November 2020.
  13. https://www.informationnigeria.com/2014/12/hip-hop-is-only-for-children-onyeka-nwelue.html
  14. Amina Alhassan (8 February 2014). No full-time writer in Nigeria - Onyeka Nwelue. dailytrust.com.ng. Archived from the original on 4 March 2016. Retrieved on 28 November 2020.
  15. Writing Is Only for Children: My Stroll with Onyeka Nwelue (23 April 2015).
  16. https://m.guardian.ng/art/nwelue-on-world-tour-with-new-book-hip-hop-is-only-for-children/>
  17. "Flora Nwapa and the house that Onyeka Nwelue built for her", 2016-11-27. (in en-US)
  18. Onyeka Nwelue releases documentary feature 'House on Nwapa' on Youtube (en-GB) (13 January 2017).
  19. "AMAA 2017: Nollywood movies top nominations [Full list - Daily Post Nigeria]", 2017-05-16. (in en-US)
  20. "Preying From Paris: Why Oguta Will Remain The Way It Is", Olisa Blogazine, 2017-09-04.
  21. #LiterallyWhatsHot: What Defines Happiness in Onyeka Nwelue's "Island of Happiness?" (18 April 2018).
  22. Wole Soyinka hosts Onyeka Nwelue to a private screening of his movie 'Agwaetiti Obiụtọ' in celebration of his AMAA nominations (4 September 2018).
  23. https://www.pontas-agency.com/onyeka-nwelue-a-new-nigerian-literary-voice-in-english-language/
  24. https://ynaija.com/the-wrong-passport/
  25. Military Brutality Against Nigerians: The Incident of Bonny Cantonment by Elias Ozikpu (25 February 2017). Retrieved on 1 May 2020.
  26. Rwandan government reacts to assault allegation leveled against its investigation Bureau by writer, Onyeka Nwelue (6 November 2018). Retrieved on 1 May 2020.
  27. An evening with Nigerian writer Onyeka Nwelue (11 June 2018). Retrieved on 1 May 2020.
  28. A tale of 2 Onyekas and one birthday (3 February 2018).

Ọgụgụ ọzọ dezie

Njikọ dị na mpụga dezie