Olisa Metuh

Onye ọka iwu Naijiria na kwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị
Olisa Metuh
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereOlisa Dezie
Ebe ọmụmụOtolo Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Olisa Metuh bụ onye ọka iwu n'ala Naijiria, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na kwa ode akwukwọ mkpọsa ochie nke otu People's Democratic Party . [1] [2]

Mmalite ndụ na ọrụ dezie

A mụrụ Chief Olisa Metuh na Otolo, Nnewi North, na Anambra Steeti, n'ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Nigeria . [3] O nwetara nzere bachelọ nke iwu na Mahadum Nigeria, Nsukka dị n'Enugwu steeti, e wee kpọbata ya n'otu ndị ọka iwu Naijiria n'afọ otu puku na narị iteghete na iri asatọ na asatọ (1988)[4] Ọ malitere ọrụ iwu ya na ụlọ ọrụ iwu Olisianunba, ụlọ ọrụ iwu nke nna ya nwere. N'afọ otu puku na narị iteghete na iri iteghete (1990), o hiwere ụlọ ọrụ mmekọ ọnụ nke a na-akpọ Metuh, Okafor & Associates, ebe ọ rụrụ ọrụ dịka onye ọka iwu njikwa. [5] N'afọ otu puku na narị iteghete na iri iteghete na otu (1991), a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke ụlọ ọrụ akpọrọ Legend Properties Limited, ụlọ ọrụ na-ahụ maka ijikwa ihe onwunwe. [6] O mechara debanye aha dị ka onye na-enye ndụmọdụ gbasara itinye ego n'otu Securities and Exchange Commission (SEC). [7] N'afọ otu puku na narị iteghete na iri iteghete na isii (1996), o guzobere Ụlọ Ọrụ Iwu, Olisa Metuh & Co, iji nye ọrụ n'ihe gbasara omume iwu, ala, na ịkekọrịta ihe nnweta. [8] [9]


Ndụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dezie

Ọ malitere ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị dịka onye nhazi ọgbakọ Igbo United Congress. [10] Mgbe ọ na-eje ozi n'ọkwa ahụ, ọ bụkwa onye so na kọmitii na-ahụ maka ego n'otu People's National Forum (PNF). [11] Ọ jere ozi dị ka otu onye izizi na kọmitii na-ahụ maka ego mba nke otu People's Democratic Party . [12] Na ọnwa Nọvemba n'afọ otu puku na narị iteghete na iri iteghete na iteghete (1999), na Mgbakọ Mba mbụ nke PDP, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke otu National Executive Committee (NEC) nke pati ahụ. [13] O mechara bụrụ odeakwụkwọ nke otu National Peace and Reconciliatory Committee nke pati ahụ afọ abụọ. [14] N'afọ puku abụọ na abụọ (2002), a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche ngalaba ntuli aka nke steeti Cross River. [15] E mechara họpụta ya ka ọ bụrụ onye otu ngalaba na-enyocha iwu nke People's Democratic Party. [16] N'afọ puku abụọ na isii (2006), ọ ghọrọ onye isi oche ụlọ ọrụ ntuliaka Abia steeti ma sorokwa na-elekọta ntuliaka na pati dị iche iche di na steeti Abia . [17] N'afọ puku abụọ na asaa (2007,) a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye na-enyocha ka ego si gaa na kwa onye so na kọmitii na-arụ ọrụ nke pati nke a kpọrọ National Working Committee (NWC) [18] E mechara họpụta ya ka ọ bụrụ osote onye isi oche nke pati na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ. [19] [20] Ọ jere ozi dịka odeakwụkwọ mgbasa ozi mba nke otu People's Democratic Party site n'afọ puku abụọ na iri na atọ (2013) wee ruo n'afọ puku abụọ na iri na ise (2015) mgbe otu ahụ tụfuru ikike gọọmenti etiti n'aka ndị mmegide All Progressives Congress, APC. [21] [22]

Njide dezie

Ka onwa Jenụwarị gbara mkpụrụ ụbọchị ịse n'afọ puku abụọ na iri na isii (2016), ndị Economic and Financial Crimes Commission, (EFCC) nwụchiri Olisa Metuh, [23] ka ọ bịa zara ọnụ ya n'okwu gbasara ụfọdụ ego metụtara nkwekọrịta ngwa ọgụ ka a chọpụtara na o metụtara ụlọ ọrụ ya. [24]

"Site na ndekọ dị iche iche, Metuh nwetara ihe karịrị narị nde naira anọ, o kwubeghị ihe ọ bụla n'ihi na anyị chọrọ ka e weghachite ego ọha na eze ka e were ya mee ihe maka ọdịmma ọha," Maazị Magu kwuru n'oge nzukọ ya na ndị na-ebipụta mgbasa ozi n'ịntanetị na Lagos nwere. [25]

Ka ọnwa Febụwarị gbara mkpụrụ ụbọchị ịse n'afọ puku abụọ na iri na asatọ (2018), Olisa Metuh rutere n'ụlọ ikpe gọọmentị etiti dị na Abuja na ụgbọ ihe mberede. [26] Ọ nọghị ya mgbe a nụrụ ikpe ahụ n'izu gara aga.

Otu ndị ọkachamara dezie

  • Onye otu ndị ọka iwu Naijiria
  • Onye otu International Bar Association
  • Onye otu Association of Business Lawyers of Nigeria.

Hụkwa dezie

Nsidee dezie

  1. PDP: Where is Olisa Metuh?. Vanguard News (23 May 2014). Retrieved on 15 January 2015.
  2. The Madness Of Olisa Metuh And The Tragedy Of The Nigerian Nation. Sahara Reporters (17 April 2014). Retrieved on 15 January 2015.
  3. PDP ELECTION: Why they are after me – Olisa Metuh – Vanguard News. Vanguard News (24 August 2013). Retrieved on 15 January 2015.
  4. "Frustrated PDP Spokesman, Olisa Metuh, 'Ready To Resign' | Sahara Reporters", Sahara Reporters, 2013-04-05. Retrieved on 2018-01-02.
  5. A Government Full Of Lies: Reuben Abati And Olisa Metuh As Agents By Tobi Idaomi. Sahara Reporters (15 September 2014). Retrieved on 15 January 2015.
  6. Olisa Metuh, the PDP is not the APC. The Punch - Nigeria's Most Widely Read Newspaper. Archived from the original on 15 January 2015. Retrieved on 15 January 2015.
  7. Nigeria Leadership Summit – by Anabel Leadership Academy – nigerialeadershipsummit.com. Archived from the original on 15 January 2015. Retrieved on 15 January 2015.
  8. Media Trust. Manipulators of public perception: Between Olisa Metuh and Lai Mohammed. Daily Trust. Archived from the original on 15 January 2015. Retrieved on 15 January 2015.
  9. Our Correspondent. New Telegraph – Olisa Metuh: A bull in an Abia shop. Archived from the original on 15 January 2015. Retrieved on 15 January 2015.
  10. APC free to boycott national dialogue – PDP. The Punch - Nigeria's Most Widely Read Newspaper. Archived from the original on 15 January 2015. Retrieved on 15 January 2015.
  11. PDP: As the behemoth shrinks. The Punch - Nigeria's Most Widely Read Newspaper. Archived from the original on 14 January 2015. Retrieved on 15 January 2015.
  12. PDP's Publicity Secretary, Olisa Metuh Resigns – Channels Television. Channels Television. Retrieved on 15 January 2015.
  13. PDP's NWC Reviews Sack of Adamawa, Ebonyi Excos, Articles – THISDAY LIVE. Archived from the original on 15 January 2015. Retrieved on 15 January 2015.
  14. Spokesman Olisa Metuh resigns. Premium times (19 June 2013). Retrieved on 15 January 2015.
  15. Cross River PDP electoral panel denies bribe allegation. The Punch - Nigeria's Most Widely Read Newspaper. Archived from the original on 15 January 2015. Retrieved on 15 January 2015.
  16. Leon Usigbe And Jacob Segun Olatunji-Abuja. We are ready for election —PDP. Nigerian Tribune.
  17. Our Reporter. Abia polls: Controversy over disqualification of Gov Orji's son. Retrieved on 15 January 2015.
  18. Jonathan, Tafawa Balewa for Screening Today, Articles – THISDAY LIVE. Archived from the original on 14 January 2015. Retrieved on 15 January 2015.
  19. Our Reporter. Why we sacked Adamawa PDP executive – Olisa Metuh. Retrieved on 15 January 2015.
  20. PDP S'EAST EXECUTIVE PASSES VOTE OF CONFIDENCE IN METUH. thenigerianvoice.com. Retrieved on 15 January 2015.
  21. Re: False Reports On The National Publicity Secretary Of The PDP, Chief Olisa Metuh. Sahara Reporters (7 April 2013). Retrieved on 15 January 2015.
  22. Seized $5.7million: APC used by 'foreign interests' to destroy Nigeria - PDP - Premium Times Nigeria. Premium Times Nigeria (7 October 2014). Retrieved on 15 January 2015.
  23. Court finds Olisa Metuh guilty of N400m fraud. guardian.ng (25 February 2020). Retrieved on 2020-05-28.
  24. EFCC arrests PDP spokesperson, Olisa Metuh, over alleged corruption – Premium Times Nigeria (en-GB). Premium Times Nigeria. http://google.com/+Premiumtimesngr+(5 January 2016). Retrieved on 2016-01-14.
  25. Why we released APC's Jafaru Isa, still detain PDP's Olisa Metuh – EFCC – Premium Times Nigeria (en-GB). Premium Times Nigeria. http://google.com/+Premiumtimesngr+(11 January 2016). Retrieved on 2016-01-14.
  26. "Alleged N400m Fraud: Ex-PDP spokesman, Olisa Metuh, appears in..", oak.tv, Oak TV, 5 February 2018.

 

Njikọ mpụga dezie