Olatunde Ojo
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Olatunde |
ụbọchị ọmụmụ ya | 14 Febụwarị 1963 |
Ebe ọmụmụ | Ilobu |
ọrụ ọ na-arụ | civil servant, onye na-ese ụkpụrụ ụlọ |
ebe agụmakwụkwọ | Obafemi Awolowo University, Obafemi Awolowo University |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
Ojo Amos Olatunde (a mụrụ n'abalị 14 n'ọnwa Febụwarị n'afọ 1963), bụ onye Naijiria na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ nakwa onye odeakwụkwọ ugbu a nke National Assembly of Nigeria kemgbe ụbọchị iri atọ n'ọnwa Septemba n'afọ 2020, ọ rụọla ọrụ dịka onye odeakwụkwọ site na 17 Julaị afọ 2020 mgbe ọ nọchiri Mohammed Sani-Omolori .
Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ Ojo na Ilobu, Irepodun, Oyo State, Nigeria . Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndrị na Ilobu Secondary Commercial Grammar School, ebe ọ gụsịrị na 1983. Bido n'afọ 1985 ruo n'afọ 1990, ọ gara Mahadum Obafemi Awolowo ebe ọ gụsịrị akwụkwọ na nzere na iwu ụlọ, tupu ọ nweta nzere masta n'afọ 1992 n'otu mahadum ahụ.[1][2]
Ọrụ
dezieOjo bidoro ọrụ ya na ọrụ onwe ya, tupu ọ banye na nzukọ mba nke Naịjirịa n'afọ 2004 dịka onye isi na-ewu ụlọ nke ngalaba ala na ọrụ. E bugotere ya n'ọkwa osote onye isi, mgbe nke ahụ gasịrị, ọ ghọrọ osote onye isi na onye isi. Ọ bụ onye otu Nigerian Institute of Architect, NIA na Architects Registration Council of Nigeria, ARCON .[1]
Onye odeakwụkwọ na nzukọ mba Naịjirịa
dezieN'abalị 17 ọnwa Julaị 2020, a họpụtara Ojo dịka onye na-arụ ọrụ na nzukọ mba Naịjirịa iji dochie Mohammed Sani-Omolori.[3][4] Na 30 Septemba 2020, e mere nhọpụta ya ka ọ bụrụ nke na-adịgide adịgide.[5]
Edemsibịa
dezie- ↑ 1.0 1.1 Ogunyinka (22 July 2020). As Olatunde Ojo steps in as Clerk to the National Assembly. Vanguard Newspaper. Retrieved on 7 October 2020. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name "VA" defined multiple times with different content - ↑ Ade-Omotosho (24 July 2020). Clerkship of National Assembly: a triumph of integrity. The Nation Newspaper. Retrieved on 7 October 2020.
- ↑ Umoru (17 July 2020). NASS appoints Clerk of Senate, 4 others. Vanguard Newspaper. Retrieved on 7 October 2020.
- ↑ Olatunde Replaces Omolori As NASS Clerk. Channels TV (17 July 2020). Retrieved on 7 October 2020.
- ↑ Dyepkazah (2 October 2020). N’assembly commission confirms Ojo Olatunde as clerk. TheCable. Retrieved on 7 October 2020.