Okey Wali
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 29 Ọktoba 1958 |
Ebe ọmụmụ | Obia/Akpor |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọka iwu |
ebe agụmakwụkwọ | University of Buckingham |
Okey Wali, SAN (a mụrụ n'ọnwa Ọktoba 29, afọ 1958) bụ onye ọka iwu Naịjirịa na onye isi oche nke iri abụọ na isii nke Nigerian Bar Association .[1][2]
Mmalite ndụ
dezieA mụrụ Wali n'abalị iri abụọ na itoolu n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1958 na mpaghara ọchịchị Obio-Akpor na obodo ukwu nke Port Harcourt, mpaghara ndịda Naịjirịa.[3] Ọ gara ụlọ akwụkwọ Port Harcourt Township School maka agụmakwụkwọ praịmarị ya mana ọ gụsịrị ya na St. Paul's Primary School na Diobu, Port Harcourt .[4] O mechara gaa Baptist High School, Port Harcourt, ebe o nwetara asambodo West African School n'afọ 1973 wee gaa Mahadum Buckingham, United Kingdom, ebe ọ natara nzere bachelọ nke iwu n'afọ 1983.[5] Ọ laghachiri Naịjirịa maka ọzụzụ ọkachamara na Nigerian Law School na Lagos Steeti a kpọọ ya na Nigerian Bar n'afọ 1984.[6]
Ọrụ iwu
dezieA kpọrọ ya na Nigerian Bar n'afọ 1984.[7] Mgbe afọ ole na ole nke ahụmahụ ọrụ gasịrị, a họpụtara ya dịka odeakwụkwọ nke Port Harcourt alaka nke NBA n'afọ 1992.[8] O mechara rụọ ọrụ dịka Attorney-General na Commissioner maka ikpe ziri ezi nke steeti Rivers tupu a họpụta ya dịka onye isi oche nke iri abụọ na isii nke Nigerian Bar Association, ebe o nwetara vootu 688 iji merie Emeka Ngige (SAN), onye nwere vootu 449.[9][10] Augusustine Alegeh, onye isi na-akwado Naịjirịa nọchiri ya.[11]
Esemokwu
dezieN'ọnwa Ọktọba afọ 2014, a kọrọ na ndị égbè a na-amaghị ama tọọrọ Wali na Rumualogu Town, Akpor City, Rivers State ma tọhapụ ya ụbọchị ole na ole mgbe a tọọrọ ya.[12][13]
Edemsibịa
dezie- ↑ Abducted ex-NBA president, Okey Wali released. Premium Times. Retrieved on 8 February 2015.
- ↑ Okey Wali, Ex-NBA president, kidnapped, Articles – THISDAY LIVE. thisdaylive.com (October 12, 2014). Archived from the original on February 8, 2015. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ Former NBA president 'Okey Wali' kidnapped in Rivers State. Nigerian Bulletin – Trending News & Updates. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ How NBA election was won and lost. Vanguard News. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ NBA presidency: It's a battle between hawks and doves – Vanguard News. Vanguard News. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ Okey Wali declared president-elect of Nigeria Bar Association - www.channelstv.com. Channels Television. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ NBA elects Wali as new president. The Punch. Archived from the original on February 8, 2015. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ Leadership Newspaper (July 15, 2014). NBA: Okey Wali's emergence as NBA president fraudulent – Falana. Nigerian News from Leadership News. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ Gunmen Abduct Former NBA president, Okey Wali, in Port Harcourt. Sahara Reporters. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ Yahaha. Okey Wali emerges as NBA new president. frontiersnews.com. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ Media Trust. Alegeh is Nigeria Bar Association’s new president. Daily Trust. Archived from the original on February 8, 2015. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ Former NBA president, Okey Wali, kidnapped in Rivers. Vanguard News. Retrieved on February 8, 2015.
- ↑ Kidnappers release ex-NBA President, Okey Wali. The Punch. Archived from the original on February 8, 2015. Retrieved on February 8, 2015.