Obiora Udechukwu

Onye na-ese ihe Nigeria
Obiora Udechukwu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1946 Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ese Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie
agbụrụNdị Igbo, Ndi Afrika nke Amerika Dezie

Obiora Udechukwu onye amụrụ na 1946 bụ nwaafọ Nigeria na-ese ihe òsìsè ma bụrụkwa ode abụ

Á mụrụ ya na Onitsha na 1946 nyere nne na nna si Agulu na Anambara Steeti, Naịjirịaa, ọ gụrụ akwụkwọ otu afọ na Mahadum Ahmadu Bello tupu ọ gafee na Mahadum nke Nigeria, Nsukka site na ibu agha megide ndị Igbo nọ na mpaghara ugwu Naịjirịa. N'oge alụrụ agha obodo Naịjirịa, nke a makwaara dị ka agha Biafran (1967-1970), Udechukwu rụrụ ọrụ na ngalaba Propaganda ma sonye na ọgbakọ ndị nka na ndị odee nke ode abụ bụ Gabriel Okara na onye omenkà Uche Okeke duziri . Mgbe agha biri, ọ laghachitere na Nsukka, mezue asambodo bachelo ya na ngalaba fine art, tinyere ederede banyere nka igbo Uli mural art, n’afo 1972. N’afọ 1973, a họpụtara ya dịka Onye Mmekọ na Ngalaba Fine Arts, ebe ọ natara nzere Master of Fine Arts ya ,na 1977. A matara ya dịka onye ndu n'ụlọ Akwụkwọ Nsukka, nke Uche Okeke dubuuru, onye jere ozi dịka onye isi nke ngalaba nka ruo 1985. Mgbe ọ nọ na Nsukka, Udechukwu ghọrọ onye guzobere Aka Circle of Exhibiting Artists, nke gụnyere El Anatsui, Tayo Adenaike, na ndị nka ndị ọzọ bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nigeria. O jere ozi na kọmitii nhazi Okike: African Journal of New Writing nke eguzobere na Nsukka site na onye ọde akwụkwọ Chinua Achebe . A họpụtara ya dịka Prọfesọ nke Painting na Nsukka na 1986. N’oge ọchịchị ya, ụmụ akwụkwọ ya gụnyere Tayo Adenaike, Olu Oguibe, Chika Okeke-Agulu, Marcia Kure, na Sylvester Okwunodu Ogbechie . N’afọ 1997, Udechukwu ghọrọ Dana Professor nke Fine Arts na Mahadum St. Lawrence, na Steeti New York. O bi na Canton, NY.

Udechukwu na etinye Uli n'ọrụ ya kwa mgbe ,Na 1970 gụrụ gawa ọ webatara akara nsibidi, ya na usoro eji asa ink nke ndị nka China mara akwụkwọ. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; refs with no name must have content Ọtụtụ n’ime ihe osise ya na mbipụta ya na-egosi ndị mmadụ nkịtị; oru ya n'oge agha bụ nkpalite mmụọ gosipụtara oke nhuju anya ọ hụrụ. Site na etiti 1970, isi okwu ya sitere na nkpuru ihe omuma banye na nkọwa nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ihe ngosi nka dezie

Udechukwu enwekarịala ihe ngosi karịrị iri abụo na ise nke naanị otu onye gosipụtara na Nigeria, England, Zimbabwe, Germany, na United States.

Nchịkọta ọha dezie

Ọrụ nka ya dị na nchịkọta nke National Gallery of Modern Art, Lagos; National Council nke Arts na Culture, Lagos; Center for cultural studies, Mahadum nke Lagos; Iwalewa-Haus, Mahadum nke Bayreuth, Germany; Museum fur Volkderkunde, Frankfurt / Main, Germany; Bradford City Museums and Galleries,Bradford, England; Smithsonian National Museum nke African Art, Washington, DC; Newark meseum.

Abu dezie

  • What the Madam said, (1990), onye mmeri nke Association of Nigerian Authors Poetry Prize, 1990.

Ịgbakwunye amamihe dezie

  • Chika Okeke-Agulu, Obiora Udechukwu: Line, Image, Text (Milan: Skira Editore, 2016)
  • Kristen Windmuller-Luna, “A Nigerian Song literatus: Chinese literati paint concept of the Song Dynasty in the modern art of Obiora Udechukwu,” Rutgers Art Review Vol. 29, 2014
  • Simon Ottenberg, sources and themes of Obiora Udechukwu, in African Arts, summer 2002.
  • Chika Okeke-Agulu, “Obiora Udechukwu,” Nka: Journal of Contemporary African Art 9 (1998), 46-51.

Ébém si de dezie

  • Bio from National Museum of African Art, Washington DC, [1]
  • Profile of the poet ,Sentinel poetry
  • Marie-Helene Boisdur de Toffol and others, An Anthology of African Art: The Twentieth Century, Distributed Art Publishers / Editions Revue Noire; English edition (2002),  ISBN 1-891024 

Nrụtụaka dezie