Nwanneka Okwelogu
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria, Njikota Obodo Amerika |
obodo maka egwuregwu | Naijiria |
Aha ọmụmụ | Nwanneka Mariauchenna Okwelogu |
aha otutu | Nikki |
ụbọchị ọmụmụ ya | 5 Mee 1995 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | shot putter, discus thrower |
ebe agụmakwụkwọ | Harvard University, Clovis West High School |
Ebe obibi | Fresno |
onye nsonye òtù egwuregwu | Harvard Crimson |
ụdị egwuregwu | track and field, egwuregwu |
ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpi | shot put, discus throw |
so na | 2014 African Championships in Athletics, 2016 African Championships in Athletics, 2014 Commonwealth Games, egwuregwu n'egwuregwu Olimpik Summer 2016 |
Nwanneka Mariauchenna "Nikki" Okwelogu (amụrụ 5 May 1995) bụ nwa afọ Naijịrị n'egwuregwu track na field onye na -asọ mpi n''ihe omume akpọrọ shot put na discus throw. Ọ bụ onye nrite ọla edo n'afọ 2016 nke discus na asọmpi egwuregwu Afrịka. Amụrụ ya na United Steeti, o debere ndekọ Ivy League na ịtụ mgbe ọ nọ na Mahadum Harvard.
Ọrụ
dezieAmụrụ ya na Fresno, California mana nne na nna ya si naijịrịa[1]. Nikki gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị Clovis West ebe ọ sọrọ mpi na shot put na discus[2]. Ọ gara n'ihu gaa Mahadum Harvard site na 2013 wee sọọ mpi ndị otu track Harvard Crimson ha. N'afọ mbụ ya ebe ahụ, ọ mebiri ndekọ Ivy League na discus site na ịtụfe 53.31 m (174 ft 10+3⁄4 in) wee debe ndekọ ụlọ akwụkwọ na shot put na 16.05 m (52 ft 7+3⁄4) n'ime)[3]. Nwanne ya nwanyị Nonny nwọkwara onye na -atụ Ivy League, na -aga Princeton.[4]
N'oge 2014 ahụrụ mmeri nke mbụ ya nke mba site na shot put n'asọmpi egwuregwu ndị Naịjirịa.Ọ mere mpụta mba ofesi n'afọ ahụ.N'afọ 2014 asọmpi mba uwa egwueregwu nke obere ọ sọrọ mpi shot put na discus ma burukwa onye ikpeazụ[5]. Ihe nrite mbụ ya sochiri obere oge na asọmpi 2014 nke ndị Afrịka, ebe ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ nke anọ na shot put mana ọ were ihe nrite ọla ọcha nke discus n'azụ Chinwe Okoro.Mgbe ọ dị afọ iri na itoolu, ọ bụ ya bụ nke obere banyere na asọmpi ndị ahụ.[6] Ọ sọrọ mpi n'egwuregwu Commonwealth nke 2014 n'oge ọkọchị, na -agwụ na itoolu[7] Ọ kwalitere ihe kachasị mma ya na oge 2015, na -agbakwunye ihe karịrị otu mita na shot put na 17.32 m (56 ft 9+3⁄4 in) yana inwe discus kacha mma nke 53.31 m[5]. shot put kacha mma bụ ndekọ Ivy League.Etinyere ya na nke isii n'asọmpi 2015 NCAA Division 1 indoor Track na field[3].N'afọ sochirinụ, ọ rutere na klaasị kọleji mbụ ya na ebe nke atọ shot put etinyere na asọmpi NCAA nke afọ 2016. Ọ bụkwa onye ikpeazụ n'egwuregwu NCAA, na -ewere nke asatọ.[8][9]
Okwelogu guzoro onwe ya n'etiti ndị kacha asọ mpi n'Afrịka n'egwuregwu asọmpi Afrịka nke 2016 site na iwere medal discus na ndekọ nke 56.75 m (186 ft 2 + 1⁄4 na), nke nyeere Naịjirịa aka ị nweta ihe nrite ya na onye mmeri 2014 Okoro na Chioma Onyekwere. Ọ gbakwụnyere na shot put tinyere ihe nrite ọla ọcha n'azụ Auriol Dongmo nke Cameroon.[10]
Asọmpi mba ofesi
dezieAfọ | Asompi | Ebe | Okwa | ihe omume | ndetu |
---|---|---|---|---|---|
2014 | World Junior Championships | Eugene, United States | 11th | Shot put | 14.77 m |
6th (q) | Discus throw | 49.07 m | |||
Commonwealth Games | New Delhi, India | 9th | Shot put | 15.13 m | |
African Championships | Marrakech, Morocco | 4th | Shot put | 15.14 m | |
2nd | Discus throw | 51.66 m | |||
2016 | African Championships | Durban, South Africa | 2nd | Shot put | 17.07 m |
1st | Discus throw | 56.75 m | |||
Olympic Games | Rio de Janeiro, Brazil | 29th (q) | Shot put | 16.67 m |
Aha Mba
dezie- Asọmpi egwuregwu ndị Naịjirịa
- Eserese agba: 2014
Ebe m si nweta
dezie
- ↑ "Nikki Okwelogu", The Harvard Crimson, 10 August 2016.
- ↑ State track meet: Clovis West discus star Nikki Okwelogu's legacy of success. RunnerSpace. Retrieved on 2016-07-03.
- ↑ 3.0 3.1 Nikki Okwelogu. Harvard Crimson. Retrieved on 2016-07-03.
- ↑ Nonny Okwelogu. Princeton Tigers. Retrieved on 2016-07-03.
- ↑ 5.0 5.1 Nwanneka Okwelogu. IAAF. Retrieved on 2016-07-03.
- ↑ Okwelogu Brings Home Silver Medal at the 2014 African Athletics Championships. Harvard Crimson (2014-08-14). Retrieved on 2016-07-03.
- ↑ Nwanneka Okwelogu. Glasgow2014. Retrieved on 2016-07-03.
- ↑ Okwelogu, Smith Crowned First Team All-America at NCAA Indoor Championships. Harvard Crimson (2016-03-1). Retrieved on 2016-07-03.
- ↑ Okwelogu Nets All-America Honors in Shot Put, Three Student-Athletes Advance to Finals at NCAA Championships. Harvard Crimson (2016-06-09). Retrieved on 2016-07-03.
- ↑ Fierro, Julio (2016-06-29). Okwelogu Shines on International Stage in African Championships. The Harvard Crimson. Retrieved on 2016-07-03.