Nadia Benbouta

omenkà algeria (Amúrù na-1970)

Nadia Benbouta (amụrụ na ọnwa 21 Jenụwarị n'afọ 1970) bụ onye obodo Algeria n'ese ihe nke bi ma n'arụ ọrụ na obodo Paris . [1]

A mụrụ ya na Algiers, ọ gụrụ akwụkwọ na École supérieure des beaux-arts d'Alger na École nationale supérieure des Beaux-Arts . [2]

Ihe osise ya jikọtara ihe ndị yiri ihe ndị n'enweghị njikọ: ihe oyiyi sitere na mgbasa ozi, ihe nkiri ụmụaka na isi mmalite ndị ọzọ, ihe osise n'atọ ọchị, ọkọlọtọ, ngwá agha na ihe ịchọ mma.[1]

E gosipụtara ọrụ ya na ihe ngosi onwe ya na ọbọdọ France, Germany na Ukraine. O sonyere n'ihe ngosi otu na Paris, Lyon, Marseilles, Toulouse, Germany, Norway, Greece, Algeria na obodo New York .[1]

Benbouta natara Prix Albéric Rocheron n'afọ 1998 na Prix Fenêtre des Arts Européens nke Sprengel Museum nyere na Hanover n'afọ 1999. [1]

A n'edebe ọrụ ya na nchịkọta nke Bibliothèque nationale de France, École nationale supérieure des Beaux-Arts, Musée de Serignan na obodo Bobigny.[1]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Nadia Benbouta (fr). anne-marie et roland pallade art contemporain. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "pallade" defined multiple times with different content
  2. Eigner (2010). Art of the Middle East. ISBN 978-1-8589-4500-2.