Mohamed T. El-Ashry

Mohamed T. El-Ashry
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịEgypt Dezie
Ihe nriteFellow of the African Academy of Sciences Dezie

Mohamed T. El-Ashry bụ ya bụ onye isi oche na onye nchịkwa mbụ nke Global Environment Facility (GEF), ma mechaa bụrụ onye òtù dị elu nke UN Foundation.

Agụmakwụkwọ Ya dezie

Mohamed T. El-Ashry nwetara nzere B.Sc ya n'afọ 1959 site na Mahadum Cairo, na nzere M.Sc ya n'afọ 1963 na nzere Ph.D ya n'isi ọmụmụ Geolog, n'afọ 1966, site na Mahadum Illinois.[1][2]

Ọrụ Ya dezie

El-Ashry bụụrụ onye nkuzi na onye ome-nnyocha na Mahadum Cairo, na Pan-American-U.A.R. Oil Company, Mahadum Wilkes, nakwa Environmental Defense Fund. Ka nke ahụ gasịrị, ọ bụụrụ osote onye isi dị elu na World Resources Institute (WRI) nakwa onye isi nchịkwa na ngalaba Environmental Quality na Tennessee Valley Authority (TVA).[3]

O mechara rụwa na ọbá ego mba ụwa ebe ọ jiiri ọkwa Onye isi ndị ndụmọdụ gbasara gburugburu ebe obibi (1991–1993), onye isi ndị ndụmọdụ gbasara gburugburu ebe obibi nye onye isi oche (1993–1994), na onye isi oche ọkachasị (1994–2003).[4] Site n'ọbá ego mba ụwa, ọ rụwa na Global Environment Facility (GEF) ebe ọ bụụrụ onye isi oche ọkachasị nke ụlọ ọrụ ahụ ruo oge dị afọ iri na otu (1991-2002).[5][6]

Nnyocha El-Ashry mere legidere anya na ijikwa Akụnụba si na mmiri,[7][8][9] ijikwa na imelite Akụnụba si na gburugburu ebe obibi,[10][11][12] and iwu na-achị ike nke na-akwalite ikike na-enwogha enwogha. [13][14]

Òtù Ndị O sogasị na Ha dezie

A họpụtara El-Ashry dịka onye òtù Geological Society of America,[15] onye òtù American Association for the Advancement of Science,[6] onye òtù Third World Academy of Sciences n'afọ 1990,[16] nakwa onye òtù African Academy of Sciences n'afọ 2001,[3] na Onye òtù dị elu na UN Foundation. [15][17]

Ọ bụ onye òtù American Academy of Arts and Sciences kemgbe afọ 2012 na-eneye ndụmọdụ n'ihe gbasara ikike na-enwogha enwogha ,[18] ma bụrụkwa onye so na bọọdụ ndị isi nke World Wide Fund for Nature, Resources for the Future, na Renewable Energy Policy Network for the 21st Century.

Hụkwa dezie

Edensibia dezie

  1. Transcript of oral history interview with Mohamed T. el-Ashry held on May 29 and 30, 2003.
  2. United Nations Secretariat to the High Level Panel on System-wide Coherence.
  3. 3.0 3.1 El-Ashry Mohamed T. | The AAS. Archived from the original on 2022-11-23. Retrieved on 2023-12-07.
  4. el-Ashry, Mohamed T. | Archives.
  5. Environment, U. N. (2019-08-22). Dr. Mohamed El-Ashry (es).
  6. 6.0 6.1 Mohamed T. El-Ashry (en-US) (2022-03-28).
  7. Pollution, United States Congress Senate Committee on Environment and Public Works Subcommittee on Environmental (1977). Federal Water Pollution Control Act Amendments of 1977: Fort Collins, Colo (in en). U.S. Government Printing Office. 
  8. (2000-03-01) "Addressing the Global Water and Environment Crises through Integrated Approaches to the Management of Land, Water and Ecological Resources". Water International 25 (1): 115–126. DOI:10.1080/02508060008686803. ISSN 0250-8060. 
  9. How to access research remotely.
  10. (1999) Partnerships for Global Ecosystem Management: Science, Economics, and Law : Proceedings and Reference Readings from the Fifth Annual World Bank Conference on Environmentally and Socially Sustainable Development, Held at the World Bank and George Washington University, Washington, D.C., October 6-7, 1997 (in en). World Bank Publications. ISBN 978-0-8213-4265-7. 
  11. (1980) Notification to EPA of Hazardous Waste Activities: Region 4 (in en). U.S. Environmental Protection Agency. 
  12. "Opinion | How Biodiversity Can Be Preserved if We Get Smart Together", The New York Times, 2000-08-22. (in en-US)
  13. The Renewable Energy Era Has Already Started (en-US) (2015-11-05).
  14. El-Ashry, Mohamed T. (2012). "National Policies to Promote Renewable Energy". Daedalus 141 (2): 105–110. DOI:10.1162/DAED_a_00150. ISSN 0011-5266. 
  15. 15.0 15.1 Mohamed T. El-Ashry | Leaders | WWF (en).
  16. El-Ashry, Mohamed Taha (en).
  17. United Nations Secretariat to the High Level Panel on System-wide Coherence.
  18. Mohamed T. El-Ashry (en).