Mansur Dan Ali
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 25 Ọgọọst 1959 |
Asụsụ obodo | Asụsụ Hausa |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Hausa, Arabic, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | ndị agha |
Ọkwá o ji | Minister of Defence of Nigeria |
ebe agụmakwụkwọ | Nigerian Defence Academy, Bayero University Kano |
okpukpere chi/echiche ụwa | Okpukpere Alakụba |
ọkwa agha | izugbe |
Mansur Muhammad Dan Ali (amụrụ n'abalị iri abụọ na ise n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1959) bụ onye agha Naịjirịa lara ezumike nká na onye bụbu Minista na-ahụ maka nchekwa nke Naịjirị nke Onye isi ala Muhammadu Buhari họpụtara na Nọvemba n'afọ 2015.[1]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ Dan-Ali na Ọgọst 25, na afọ 1959 na Zamfara Steeti. Ọ gara Birnin Magaji Town Primary School afọ (1966 -1972) maka agụmakwụkwọ elementrị ya na Government Secondary School, Shinkafi (1972-1977) maka agụmakmakwụkwọ sekọndrị ya.[2] Ọ natara Higher National Diploma (HND) ya na Photogrammetric na Surveying site na Kaduna Polytechnic (1977-1982) ma nwee nzere masta na Public Policy and Administration (MPPA) site na Mahadum Bayero Kano (2004-2005) na nzere masta n'ihe ọmụmụ nchekwa site na Machịkwa Bangladesh (2009).[3]
Ọrụ ndị agha
dezieE nyere Dan Ali ọrụ dị ka onye isi nke abụọ na ndị agha Naịjirịa na afọ 1984 site na Short Service Commission na Nigerian Defence Academy.[3] Dan-Ali jere ozi n'ọchịchị na ikike ndị ọrụ dị iche iche, ụfọdụ n'ime ha gụnyere ịhazi ndị agha Naijiria na-akwado United Nations Africa Hybrid Mission na Sudan. Dan Ali nọ na Directing Staff nke Armed Forces Command and Staff College, Jaji site na afọ 2003 -2005 ma bụrụ Chief Instructor (CI) na Nigerian Defence Academy na afọ 2010. Ọ bụkwa onye na-anọchite anya onye nduzi ọzụzụ agha tupu e zigara ya na Ngalaba Nhazi nke Ministry of Defence dị ka osote onye nduzi. Ọ lara ezumike nká na ndị agha Naijiria n'abalị iri atọ n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2013.[3]
Minista na-ahụ maka nchekwa
dezieNdị Senate Naịjirịa kwadoro Dan Ali dị ka Minista na-ahụ maka nchekwa n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2015 ma bụrụ Minista na Nọvemba n'afọ 2015.[4][1]
Ebenside
dezie- ↑ 1.0 1.1 Odunsi. Change team unveiled: See full list of Buhari’s Ministers and their portfolios. Daily Post Nigeria. Retrieved on 8 February 2016.
- ↑ Who Is General Mohammad Mansur Dan Ali (RTD)?. Nigerian FM. Archived from the original on 6 October 2017. Retrieved on 8 February 2016.
- ↑ 3.0 3.1 3.2 BRIG. GEN MANSUR DAN-ALI (RTD) - HONOURABLE MINISTER. Ministry of Defence of Nigeria. Archived from the original on 5 May 2016. Retrieved on 8 February 2016.
- ↑ Onyedi. Senate confirms Buhari’s second ministerial list. The Nation. Retrieved on 8 February 2016.