Jubril Martins-Kuye

Jubril Martins-Kuye (na ubochi irir na isii na ọnwa ogust na afọ 1942 wee rụọ ụbọchị iri asaa na onwa January na afọ 2021) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na Naijiria na United States, ọ ruru eru dị ka onye na-ahụ maka ego tupu ọ banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Martins-Kuye bụbu onye Òtù Social Democratic Party ma jee ozi dị ka onye omeiwu. Ọ sonyeere United Nigeria Congress Party (UNCP) na njedebe nke ọchịchị Sani Abacha. Mgbe [1] guzoro n'enweghị ihe ịga nke ọma dị ka onye na-azọ ọkwa gọvanọ nke Ogun State na 1999 onye isi ala Olusegun Obasanjo họpụtara ya ka ọ bụrụ minista nke steeti maka ego, ọkwá ọ nọrọ ruo afọ 2003. N'afọ 2010 ọ ghọrọ minista na-ahụ maka azụmahịa na ụlọ ọrụ na kọmitii nke onye isi ala Goodluck Jonathan, na-anọ n'ọkwa ruo n'afọ 2011.

A mụrụ Martins-Kuye na ubochi iri isii na onwa Ọgọstụ na afọ 1942 na Ago Iwoye, mpaghara Ijebu nke Ogun State, o nwere nwanne nwoke (Muraino Ademola Kuye).Ọ gụrụ sociology na Mahadum Ibadan (1965-1968) wee gaa Economics na Mahaduma Harvard Business School, gụsịrị akwụkwọ na afọ 1983. Martins-Kuye mechara ruo eru [2] ka Chartered Accountant.

  1. Ex-Finance Minister, Jubril Martins-Kuye Dies At 79 | Channels Television. www.channelstv.com. Archived from the original on 2022-03-10. Retrieved on 2022-03-10.
  2. Ministers – the Profiles. ThisDay (7 April 2010). Retrieved on 14 April 2010.