Jim Ovia
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Jim |
aha ezinụlọ ya | Ovie |
ụbọchị ọmụmụ ya | 4 Novemba 1951 |
Ebe ọmụmụ | Agbor |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọchụnta ego, onye ọrụ ụlọ akụ |
ụdị ọrụ ya | economics of banking |
Ọkwá o ji | manager |
ebe agụmakwụkwọ | University of Louisiana at Monroe, Southern University, Harvard Business School |
Ebe ọrụ | Naijiria |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1990 |
affiliation | Zenith Bank |
affiliation string | Zenith Bank Plc, Zenith Bank |
nọchiri | Olusola O Oladipo |
Jim James Ovia (amụrụ ya na Nọvemba 4, 1951) bụ onye ọchụnta ego nke obodo Naịjirịa na obodo Delta. Ọ tọrọ ntọala Ụlọ akụ na 1990.
Ndụ mbido
dezieJim Ovia nwere akara ugo mmụta masịta ya na nchịkwa azụmahịa na Mahadum Louisiana, Monroe, Louisiana, USA n’afọ 1979 na B.Sc. ogo na nchịkwa azụmahịa na Mahadum Southern, Baton Rouge, Louisiana, USA (1977). Ọ bụkwa onye gụsịrị na nke Harvard Business Sukulu (OPM)
Ọrụ
dezieỌ bụ onye tọrọ ntọala ụlọ akụ Zenith, o so na ụlọakụ kacha uru na ụlọ oru nke na-ahụ ihe gbasara ego na Naịjirịa ruo na 2010, mgbe o rigoro dịka onye isi oche. Ọ bụ onye natara onyinye nrite nke Naịjirịa.
N'ime afọ iri abụọ nke onye ndu, o nyere aka ịkwado ụlọ akụ ahụ dịka otu n'ime ndị kachasị baa uru na Afrịka.
Ovia bụ onye guzobere "Visafone Communications Limited" na onye isi oche nke ụlọ ọrụ ndị Naịjirịa nke "software Development Initiative" (NSDI) na ndị "National Information Technology Advisory Council" (NITAC). Ọ bụ onye otu "Honorary International Investor Council" ya na "Digital Bridge Institute" (DBI). Ọ bụ Onye isi oche nke "Cyberspace Network Limited". Enyere ya nzere dọkịtoreti na-asọpụrụ, na emume nkpọkọta afọ iri ise nke Mahadum Legọọsụ [1]
Ọrụ Obiọma
dezieỌ bụ onye otu Kansụl na-achị nke Mahadum Legoosu Steeti , na onye otu Bọọdụ nke Trostii, Mahadum Redeemer nke mba, Legọọsụ. Ọ bụ onye otu Kansụl na-achị nke "Nigerian Investment Promotion Commission" (1999 - 2007) wee jee ozi na kọmitii nke Amerịkan International Sukulu, Legọọsụ [2001 -2003].
Ovia chịrị ọtụtụ ọgbakọ ndị na-abụghị ndị gọọmentị [NGO] n'oge dị iche iche gụnyere ịbụ onye isi oche mbụ nke otu Ịntanetị (2001-2003). Ọ bụ onye guzobere na Onye isi oche nke "Mankind United to Support Total Education" (MUSTE), otu nzukọ na-ahụ maka ọdịmma mmadụ, lekwasịrị anya n'inye agụmakwụkwọ maka ndị ụwa na-atụ n'ọnụ. Ọ bụ onye guzobere "Youth Empowerment /ICT Foundation", nke na-elekwasị anya n'ịkwalite ọdịmma mmekọrịta ọhanaeze nke ndị ntorobịa Nigeria site n'ịgba ha ume ma na-akpali ha ịnabata ozi na teknụzụ nkwukọrịta.
Nsidee
dezie- "Jim Ovia is one of Nigeria's most successful businessmen - here's how he makes and spends his money". www.pulse.ng. 2019-02-20. Retrieved 2019-05-15.
- "Jim Ovia Is A Zenith Man - Konnect Africa..." Konnect Africa. 2012-12-12. Retrieved 2017-11-10.
- "Jim Ovia". Forbes. Retrieved 2017-11-10.