Januarius Jingwa Asongu

  

Januarius Jingwa (JJ) Asongu bụ onye ọkà ihe ọmụma mba Amerika, ọkà mmụta, [1] onye nta akụkọ, onye edemede, onye ọchụnta ego, na onye n'eme ihe ike. [2] A mụrụ ya n'obodo Lewoh, nke dị na mba British Southern Cameroon, Afrịka, ọ kwagara na mba United States n'etiti afọ 1990 wee ghọọ nwa amaala.

Na mba United States, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye n'ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị.[3] Ọ n'arụkwa ọrụ na agụmakwụkwọ, n'akụzi azụmahịa na ọtụtụ mahadum. N'afọ 2012, o guzobere mahadum mba ụwa nke mba Amerika na Kameroon nke a n'akpọ Mahadum Saint Monica (SMU). [4] N'inwe isi ụlọ ọrụ na mba United States, SMU nwere ugbu a ụlọ akwụkwọ na Kameroon na ụlọ akwụkwọ ndị n'abịanụ na Cambodia, Equatorial Guinea na mba Nigeria.

Ọmụmụ na mmalite ndụ

dezie

A mụrụ Januarius Asongu n'ezinụlọ nọ n'etiti na West Cameroon (nke bụbu British Cameroons) n'afọ 1970 dị ka nwa mbụ n'ime ụmụ asaa (nwaanyị anọ na ụmụ nwoke atọ). Nne na nna ya, Nicholas Jingwa na Monique Nkengbeza, bụ Ndị Kraịst Katọlik n'anụ ọkụ n'obi.[5] Ọ ghọrọ onye ndú nke Young Christian Students (YCS) n'obodo Kumbo Diocese mgbe ọ nọ na ụlọ akwụkwọ sekọndrị na sekọndị.

Asongu gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị na ụlọ akwụkwọ sekọrịtandrị na Goomentị uloakwukwo dị elụ Kumbo (nke bụzi Government Bilingual High School Kumpo) site n'afọ 1982 rụọ n'afọ 1989. Ọ malitere ọzụzụ ụkọchukwu ya na Bishop Rogan College, Soppo, Buea.[6] Agụmakwụkwọ mahadụm ya malitere na St. Thomas Aquinas Major Seminary, Bambui, ụlọ ọrụ jikọtara ya na Mahadum Pontifical Urbanian , Rome, ebe ọ nwetara nzere Bachelor of Philosophy.[7] Mgbe ọ hapụsịrị seminarị ahụ, ọ malitere ọrụ agụmakwụkwọ na mba ofesi na omenala nke onye nduzi ya, Prọfesọ Bernard Fonlon nwụrụ anwụ, onye bụkwa onye seminarị na onye mbụ si Kameroon iji nweta PhD. Asonge nwetara asambodo na akwụkwọ akụkọ na Mahadum Lagos, Naịjirịa n'afọ 1995 na PhD n'akwụkwọ akụkọ n'afọ 1998 na mba United Steetị. Ọ bụ onye mbụ si Kameroons ka e nyere ya Press Fellowship na Wolfson College, Mahadum Cambridge site na Nuffield Foundation n'mba United Kingdom.[8][9] N'afọ 2012, o nwetara nzere Master of Science na njikwa teknụzụ ozi na Mahadum Maryland University College, n'afọ 2011 PhD na nchịkwa azụmahịa na Mahadum Charisma.

Akụkọ ọrụ dị mkpirikpi

dezie

Ọrụ mbụ Asongu bụ nke onye nkuzi nke akwụkwọ Bekee, akụkọ ihe mere eme, na azụmahịa na Bishop Rogan College, Buea (1989/90). N'afọ 1993/94, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye seminarị na St. John's Katholic Parish, Kumba, na St. Luke's Parish, Nyandong. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ akụkọ, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nta akụkọ na Kameroons, ebe o dere maka akwụkwọ akụkọ dị iche iche ma soro n'akwado mmemme Katọlik na CRTV. Ihe odide ya mere ka ya na nchịkwa nwee esemokwu, ma n'afọ 1997 ọ hapụrụ mba ahụ gaa mba United States. Ọrụ mbụ ya na mba US bụ ọrụ odeakụkọ, ebe ọ rụrụ ọrụ na The Houston Chronicle dị ka onye Alfred Friendly Press Fellow. [10][11] Ọ bụ onye mbụ si na Kameroons iji nweta mkpakọrịta a site na Alfred Friendly Foundation E nyere ya Press Fellowship na Wolfson College, Cambridge.[12] Mgbe ọ laghachiri na mba US site na mba UK, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nta akụkọ na onye nchịkọta akụkọ maka akwụkwọ akụkọ na magazin dị iche iche ma kụzie obere oge n'ọtụtụ ụlọ akwụkwọ sekọndrị. N'afọ 1999, ọ banyere na mmekọrịta ọha na eze ebe ọ rụrụ ọrụ maka ụlọ ọrụ dị iche iche na ụlọ ọrụ mba ụwa. Asongu akụziwo na ọtụtụ mahadum na mba United States gụnyere Mahadum Rockford, Rockford, IL; Mahadum Herzing, Milwaukee, WI; Mahadum Fort Hays State, Hays, KS; Mahadim Embry-Riddle Aeronautical, Rockford Campus; Mahadum Franklin, Columbus, OH.   [citation needed] Ọ malitekwara ọtụtụ obere azụmaahịa na United States na Cameroon.

  1. JJ Asongu - Google Scholar Citations. Retrieved on 2017-04-09.
  2. Bahru Zewde (2008). Society, State and Identity in African History: Bahru Zewde: 9789994450251: Amazon.com: Books. African Books Collective. ISBN 978-9994450251. 
  3. Horst Koehler. UNILATERAL PRIVATIZATION OF THE CDC WITHOUT PROPER CONSULTATION OF THE PEOPLE CANNOT PROVIDE A VIABLE AND SUSTAINABLE SOLUTION TO CAMEROON'S ECONOMIC PROBLEMS. Blccarchives.org. Retrieved on 2017-04-10.
  4. Saint Monica University. Smuedu.org. Archived from the original on 6 February 2017. Retrieved on 9 April 2017.
  5. Seven themes of Catholic Social Teaching. Usccb.org. Retrieved on 2017-04-09.
  6. Bishop Rogan College - Minor Seminary. Birocol-com.webs.com. Archived from the original on 2017-04-08. Retrieved on 2017-04-09.
  7. L'Effort Camerounais (English Version): St. Thomas Aquinas' Major Seminary Bambui Announces Ruby Jubilee Celebrations. Leffortcamerounais.com (2013-10-09). Archived from the original on 2017-05-03. Retrieved on 2017-04-09.
  8. Press Fellowship | Wolfson College Cambridge. Wolfson.cam.ac.uk. Retrieved on 2017-04-09.
  9. Nuffield Foundation -. Nuffieldfoundation.org. Archived from the original on 25 December 2019. Retrieved on 9 April 2017.
  10. Houston News, Sports, Business, and Entertainment - The Houston Chronicle at Chron.com - Houston Chronicle. Chron.com. Retrieved on 2017-04-09.
  11. Alfred Friendly Press Partners. Presspartners.org. Retrieved on 2017-04-09.
  12. Press Fellowship | Wolfson College Cambridge. Wolfson.cam.ac.uk (2017-03-06). Retrieved on 2017-04-09.