Iyabo Obasanjo-Bello
Akụkụ nke | Nigerian senators of the 6th National Assembly |
---|---|
ụdịekere | nwanyị |
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Iyabo |
ụbọchị ọmụmụ ya | 27 Eprel 1967 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
stepparent | Stella Obasanjo |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | epidemiologist, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | onye otu ndi omeiwu nigeria |
ebe agụmakwụkwọ | Cornell University, University of California, Davis, University of Ibadan |
ogo mmụta | doctorate, Master of Science, Bachelor of Science |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | People's Democratic Party |
Iyabo Obasanjo-Bello (onye amụrụ na 27 April 1967) bụ na Nigerian President Olusegun Obasanjo na Oluremi Obasanjo.[1]
Ndụ ya na agụm Akwụkwọ ya
dezieObasanjo-Bello gụrụ akwụkwọ na Corona School di na Victoria Island, Lagos, Capital School di na Kaduna, nakwa Queen's College di na Lagos. O nwetara asambodo na Veterinary Medicine na University of Ibadan n'afọ 1988, master's degree na Epidemiology na University of California, Davis di na Davis, California, United States, n'afọ 1990, nakwa PhD n'otu ngalaba a na Cornell University di na Ithaca, New York, n'afọ 1994.[2]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
dezieTupu onu ogugu ndi omeiwu ya, Obasanjo-Bello bu onye onye ome iwu na-ahu maka ahu ike n' Ogun Steeti. A ghọpụtara ya dika onye Senator na-anọchi anya Ogun Central Senatorial District nke Ogun State na April 2007.[3] Ọ dọrọ ndọrọ ọchichi ọzọ mana Olugbenga Onaolapo Obadara nke Action Congress of Nigeria (ACN) meriri ya site na-inweta votu 102,389 votes ebe ya bụ Obasanjo Bello nwetara votu 56,312.[4] maka 2012[5]
Orụ ome iwu ya
dezieA ghọpụtara Obasanjo-Bello na Senate na Abali iri abuo na asatọ n'afo 2007 na platform ndi People's Democratic Party (PDP); mana onye ya na ya so zọọ ọkwa na Action Congress (AC) bụ Remilekun Bakare fufere isi ma si mba n'a-ọbụghị eziokwu, mana Ogun State Election Petition Tribunal kwụrụ na O mereriri.[6]
Ọ bụ onyeisi oche nke Kọmitii na-ahu maka Ahụike nakwa onye na-ahụ maka Nchebe & Ọgụgụ Isi, Ụgbọ ala, Sayensị na Nkà na Ụzụ, Mmụta, National Planning, na Inter-Parliamentary Kọmitii. Ọ pụrụ n'ọkwa mgbe emeriri ya na nghọpụta ndi Ngalaba Nlekọta na 9 April 2011
Mgbalị ọnwụ
dezieN'April 2003 na ụbọchị ntuli aka n'ozuzu ya, a gbara ụgbọala ya egbe n' Ifo Road na Steti Ogun. Ọ nọghị n'ụgbọala mana ndị okenye atọ na ụmụ abụọ nọ n'ụgbọala ahụ nwụrụ. E jideghị ndi mere mpụ a.[7]
Nnyocha EFCC
dezieN'April 2008, Ngalaba Na-ahụ Maka Mmebi Iwu na Ụba na Nigeria 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC) nyochachara Obasanjo-Bello n'ihi nnyocha ndị metụtara Minista Na-ahụ Maka Ahụ Ike na onye ọrụ ya Prof. Adenike Grange, maka ịzụta ego ọha na eze. Na njedebe afọ, Ụlọ ngbasa ozi ahụ eweghachighị na-enweghị isi nye ndị gọọmentị. Ọnụ ego ahụ bụ nde naira, bụ nke e kwuru na a ga-ekesa n'etiti Minista, onye Minista ya na ndị isi obodo na Senate na Ụlọ Ahụ Ike. A manyere Minista na onye ozo ya ka ha kwusi mgbe ha laghachiri ego ha; e mesịrị jide ha ma nyefee mgbapụta. Iyabo Obasanjo-Bello ekweghi inyeghachi ego ya, nde Naira iri. O kwuru na ndị isi itoolu nọ na kọmitii ya "gbara mbọ maka ego site n'ozi ha na-ahụ. O kwadoro ego a na ogbako banyere ike izulite ndi otu komiti ahuike ahu ndi gara Ghana. O kweghị ịpụta n'ihu EFCC. Ọ bụ ezie na a kpọrọ ya, tinyere ndi ozi na ndị ọrụ gọọmenti ọzọ, ọ jụrụ ịbịa n'ụlọikpe. Otu izu mgbe e mesịrị, nnukwu ihe nkiri mere mgbe ndị isi nke EFCC gbalịrị ijide ya n'ụlọ ya na district Maitama nke obodo Abuja, mgbe ndị uweojii na-ahụ maka iwu na-eme ka ọ na-awụda mgbidi ya iji gbochie njide ya. N'afọ 2009, a kpụpụrụ ikpe ahụ n'Ụlọikpe Kasị Elu na Abuja dị ka enweghi uru ọ bụla.
Obasanjo-Bello kwuru na ebubo a bu "ihe ndi ozo" ma kwuo na emegidere ya n'ihi na ọ bubu nwa nke onye isi ala.[8]
Ọrụ ya n'ụlọ Akwụkwọ
dezieỌ rụrụ ọrụ na Clinical Research na US tupu ya alaghachi na Naijiria n'afọ 2003.Ọ bụ otu onye tinyere n'afọ 2013[9] otu onye galitere agalite na Harvard's Advanced Leadership Initiative. Ọrụ ya ndi ama-ama gụnyere:
- Olowonyo, MT (2004). "Findings on the Use of Antenatal Facilities in Ogun State". Nigerian Medical Practitioner 45 (5): 68–71. Retrieved on 22 December 2007.
- Olowonyo, MT (2006). "Some factors associated with low birthweight in Ogun State, Nigeria". Nigerian Medical Practitioner 49 (6): 154–157. Retrieved on 22 December 2007. [10]
Nlebanya
dezie- ↑ Obi, Rita. "Obasanjo's first love", The Sun News Online, The Sun Publishing, 29 March 2005. Retrieved on 22 December 2007.
- ↑ Profile. Iyabo 4 Senate. Archived from the original on 19 December 2007. Retrieved on 22 December 2007.
- ↑ Senator Iyabo Obasanjo-Bello. NAssNig.org. National Assembly of Nigeria. Retrieved on 21 December 2007.
- ↑ Advertising Guru Elected Senator in Ogun State. PM News (10 April 2011). Retrieved on 5 May 2011.
- ↑ Obasanjo-Bello, Iyabo. List of 2012 Fellows. Harvard University – Advanced Leadership Initiative. Archived from the original on 29 May 2013.
- ↑ Larewaju, Kolade. "Election tribunal upholds Obasanjo-Bello's election", Vanguard Online, Vanguard Media, 11 December 2007. Retrieved on 22 December 2007.
- ↑ Four Die as Gunmen Shoot at Obasanjo's Daughter. Africa News Service (23 April 2003). Archived from the original on 4 October 2013. Retrieved on 4 July 2018.
- ↑ "…It's Pure Blackmail, Says Ex-President's Daughter", Thisday, Leaders & Company, 20 December 2007. Retrieved on 22 December 2007.
- ↑ Obasanjo-Bello, Iyabo. List of 2013 Fellows. Harvard University – Advanced Leadership Initiative. Archived from the original on 2018-01-01. Retrieved on 2018-07-04.
- ↑ Iyabo Obasanjo. Retrieved on February 2014.Check date values in:
|accessdate=
(help)